Gọvanọ Obianọ Eduola Ndị Ọkaikpe Úkwú Abụọ n'Ọrụ

Dec 5, 2019 - 20:22
Jan 24, 2021 - 03:39
 0
Gọvanọ Obianọ Eduola Ndị Ọkaikpe Úkwú Abụọ n'Ọrụ

Izunna Okafor, Awka

Aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ nọrọ ụbọchị Mọndee wee duo mmadụ abụọ n'iyi ọrụ dịka ndị ọkaikpe ukwu na steeti ahụ. Mmemme idu n'iyi ọrụ ahụ bụ nke e mere n'ọgbakọ isi ọchịchị steeti ahụ nwere na mmàlite izu a, bụkwa nke weere ọnọdụ n'obi gọọmenti dị n'Awka.

Ka ọ na-edu ndị ahụ n'iyi ọrụ, Gọvanọ Obianọ tụụrụ ha mmamma maka ọkwa ọhụụ ahụ, ma dụọ ha ka ha jigidesie ùgwù dịịrị ọrụ ahụ ike, ma rụọkwa ọrụ ha nke ọma nà n'ikwesi ntụkwàsị obi, dịka o siri dị n'akwụkwọ iwu na-achị ala anyị. Ọ kpọkuru ha ka ha wepu egwù, ma bụrụ ndị na-ebube eziokwu na ikpe nkwụmọtọ ụzọ n'ihe ọbụla ha na-eme, ma kwekwazie nkwa na ọchịchị ya ga-aga n'ihu ịnọnyere ha na ịkwàdò ngalaba ọrụ ikpe steeti ahụ.

Ọ kọwapụtara na e nwere ezi mmekọrịta n'etiti isi ọchịchị steeti ahụ na ngalaba ikpe na ya bụ steeti, ma mekwazie ka a mara na ọchịchị ya na-agbasi mbọ ike ugbu a ịkwàlitekwù usoro ikpe nkwụmọtọ na steeti ahụ, ka ọ bụrụzie nke na-agaghị na-egbu oge.

Na nzaghachi, mmadụ abụọ ahụ e buliri n'ọkwa ọhụụ ahụ, bụ Maazị Samuel Anịmonye, na Oriakụ Victoria Nwoye kèlere ọkaikpe ukwu steeti ahụ, bụ Ọkaikpe Manasseh Anyachebelụ nakwa isi ụlọ ọrụ ikpe n'ala anyị, bụ 'National Judicial Council' maka ime ka ya bụ mkpọlite n'ọkwa bụrụ nke bịara na mmezù ma gakwa siriri-werere.

Ha kelekwazịrị Chineke, nakwa isi ọchịchị steeti ahụ maka mbuli n'ọkwa ahụ dị elu, ma kwekwazie nkwà na ha ga-eji obi ha niile wee za ya bụ ọkpụkpọ òkù ma gaara steeti ya na ala Nigeria ozi n'ogoogo ọhụụ ahụ, site n'inye aka Chineke.
Oriakụ Victoria Nwoye ka e kwuru na ọ rụbụrụ ọrụ n'ụlọ ikpe ntà ala anyị, bụ 'Customary Court' dị n'Abuja, ebe Maazị Samuel Anịmonye bụ onye ọrụ ikpe na-arụbụ nke ya dịka onye nnọrọ onwe.

Ndị dị iche iche sonyere na mmemme ahụ gụnyèrè Kọmishọna ikpe nkwụmọtọ na steeti ahụ, bụ Dọkịta Uju Nwọgụ; onye ji ọkwa dịka ọkaikpe nkwụmọtọ na steeti ahụ, bụ Ọkaikpe Manasseh Anyachebelu; ode akwụkwọ ukwu steeti ahụ, bụ Ọkammụta Solo Chukwulobelụ; onyeisi ndị ọrụ nyegara Gọvanọ, bụ Maazị Primus Ọdịlị; tinyere ndị ọzọ so n'isi ọchịchị steeti ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.