Gọvanọ Obianọ Na Ndị Ọrụ Agha Ala Nigeria Enweela Mkparịtaụka n'Awka

Nov 19, 2020 - 15:52
Jan 30, 2021 - 15:53
 0
Gọvanọ Obianọ Na Ndị Ọrụ Agha Ala Nigeria Enweela Mkparịtaụka n'Awka

Izunna Okafor

Igbo sị na ọ na-adị mma a gụrụ gụrụ a nọkọọ ma kpakọọ, maka na ọ bụ mmekọrịta ahụ bụ ụtọ nwanne.

N'ịgbasò nke ahụ, aka na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obianọ nọrọ na nsonso a wee nwee ọgbakọ mkparịtaụka, ya na ụfọdụ ndị selitere isi na ngalaba ọrụ agha ala Nigeria, bụ ndị a maara na bekee dịka 'Senior Course 43 Members' nke ụlọ ọzụzụ na ụlọọrụ ndị ọrụ agha ala anyị dị na Jos, bụ isi obodo steeti Plateau.

Mmemme mkparịtaụka ahụ bụ nke weere ọnọdụ n'obi gọọmenti dị n'Awka, ma bụrụkwa nke ndị dị iche iche selitere isi n'ọchịchị steeti ahụ na na ngalaba nchekwa sonyere na ya.

N'okwu ya n'ebe ahụ, Gọvanọ Obianọ kọwara nchekwa dịka ihe dị oke mkpà n'obodo ọbụla chọrọ agamnihu, maka na ọ bụ ebe udo na nchekwa dị ka ọganihu na-adị. O mere ka a mara ihe dị iche iche o mepụtagoro na ngalaba nchekwa steeti ahụ, nke mezịrị ka ya bụ sreeti bụrụ ejiamaatụ ma bụrụkwa steeti kachara nwee ezi ọnọdụ nchekwa n'ala Nigeria.

O kwezịrị ụmụafọ Anambra na ndị bi na steeti ahụ nkwà ịga n'ihu hụ na a na-enwe ezi ọnọdụ nchekwa bụ ịgba na steeti ahụ, ma nchekwa ndụ, nchekwa akụnụba na nchekwa ihe dị iche iche ha si na ya achụta ego.

Njem ahụ ndị agha ahụ bịara so n'otu n'ime ihe ọmụmụ ha na-eme, ma bụrụkwa nke ha sigoro na ya nọọ na steeti ahụ mkpụrụ ụbọchị olenaole. Njem ahụ bụ nke 'Brigadier General John Oluwasegun Adeyomo' duru ndị agha ahụ wee bịa, ma bụrụkwa nke ndị sonyere na ya gụnyèrè la ụmụakwụkwọ ọrụ agha ala anyị ma ụfọdụ ndị nkụzi ha.

N'okwu nke ya, Brigadier General Adeyomo kọwàrà na ya bụ njem bụ nke ha na-abagide na mgbe na mgbe, ma bụrụkwa nke ebumnobi ya bụ iji kwàlite ntozuoke, nakwa iji mezupụta ihe iwu na-achị ọrụ agha ala Nigeria kwuru.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.