IFAD-VCDP Agbapeela Ogigè Ebe A Na-Ahàzi Nri Akpụ n'Anambra

IFAD-VCDP Agbapeela Ogigè Ebe A Na-Ahàzi Nri Akpụ n'Anambra

Nov 20, 2020 - 00:55
Jan 19, 2021 - 18:10
 0
IFAD-VCDP Agbapeela Ogigè Ebe A Na-Ahàzi Nri Akpụ n'Anambra

By Izunna Okafor

Gọọmenti etiti na steeti Anambra, site n'okpuru atụmatụ 'International Fund for Agricultural Development, IFAD assisted Value Chain Development Programme' (IFAD-VCDP) enyekwuola ọtụtụ ndị mmadụ na-emepụta nri akpụ nkwàdo n'okpuru ọchịchị abụọ n'ime steeti Anambra.

Okpuru ọchịchị abụọ ahụ, bụ 'Awka North' na 'Anambra East', nke mezịrị ka ọ dị okpuru ọchịchị ime obodo asatọ ritara uru n'okpuru atụmatụ nkwàdo ahụ n'ime steeti ahụ na nsonso a. 

Ya bụ ogigè ebe a na-esucha ma na-emepụta nri akpụ, nwèrè ime ụlọ ebe a na-ekpècha akpụ, ebe a na-akwọ akpụ, ebe a na-abànye akpụ, ebe a na-asa akpụ, ebe a na-ayọ akpụ, ebe a na-eghe akpụ, na ebe a na-adobe ya, ma bụrụkwa nke nwere ọkụ na-adọta ike site n'ike anyanwụ, nke mezịrị na ọ na-arụ ọrụ ruo awa iri abụọ na anọ dị n'ụbọchị.

Ya èbụ ogigè nwèkwàra mmiri a gbapuru agbapu, ma bụrụkwa nke ga na-esuchara ndị niile na obodo niile nke okpuru ọchịchị obodo ahụ na gburugburu ya akpụ.

N'okwu ya banyere nke ahụ, onyeisioche atụmatụ IFAD-VCDP, bụ Maazị Garba Bala, ogige ụlọọrụ ahụ bụ nke a rụnyegasịrị n'akụkụ ahịa, ma bụrụkwa nke ga-enye aka ibèlàtà nsogbu ndị ọrụ ugbo na-agabiga n'ibupụta na isucha ihe ha kọpụtara n'ugbo. O kwere nkwà na ha ga-aga n'ihu iji usoro ahụ wee na-eguzobe ogige ahụ na mpaghara ebe ndị ọzọ dị iche iche na steeti ahụ na steeti niile dị n'ala Nigeria.

O kelere ọchịchị steeti ahụ maka nkwàdo ọ na-enye atụmatụ ahụ iji mezupụta ebumnobi ya ma rụpụtazukwa ọrụ dị iche iche ha na-abagide na ya. Ọ rịọkwazịrị gọọmentị ka ọ gaa n'ihu inye ha nkwàdo ọkachasị n'ọgbakọ inye ọzụzụ ha na-akwado ịchịkọba maka ndị na-esucha ma na-ahazi akpụ na osikapa, bụkwa nke ga-enye aka ibelata ihe iche aka mgba ụfọdụ ndị ọrụ ugba na-agabiga.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.