Igbo College Na FRCN Achịkọbala Asọmpi Asụsụ Igbo n'Enugu

Dec 5, 2019 - 20:11
Jan 24, 2021 - 03:51
 0
Igbo College Na FRCN Achịkọbala Asọmpi Asụsụ Igbo n'Enugu

Izunna Okafor, Awka

Igbo sị na ọ bụ ka onye si eme ka ekwe si akpọ ya, ma sịkwa na ọ na-abụ abụ isi kara aka búó ógìdì, ọ dị ka ọ natàra iké be ndị mmụọ. N'ịgbaso nke a, ọ kpọtụrụ akpọtụ ma zụọ azụọ na nso-nso a dịka òtù nnọrọ onwe ihe gbasaara ịkwalite asụsụ Igbo na-echu ụra, bụ òtù a maara dịka Igbo Kọleeji (bụ Igbo College n'asụsụ bekee), chịkọbara ótù nnukwu ọgbakọ asọmpi asụsụ Igbo maka ụlọakwụkwọ sekọndịrị dị iche iche dị na steeti Enugu.

Ya bụ asọmmpi bụ nke weere ọnọdụ n’ụlọ ezumeezu Sam Nwaneri dị n’ogige ụlọ mgbasa ozi 'Coal City FM' nke ụlọ ọrụ 'Federal Radio Corporation of Nigeria (FRCN)' dị na steeti Enugu, ma bụrụkwa nke e mere site na njikọ aka ụlọ mgbasa ozi ahụ.

Asọmpi ahụ nke ahọ a bụ nke ụlọakwụkwọ asatọ sonyere na ya, ma bụrụkwa nke a nọrọ na ya wee sọọ ụdị mpi dị iche iche, nke gụnyere asọmpi ajụọ azaa, sụpeere m, nrụrịta ụka, okwu ntabì ire, nà ntụgharị okwu.

N'ime ụlọakwụkwọ asatọ ahụ sonyere n'asọmpi ahụ; ụlọakwụkwọ 'Spring of Life International School, Enugu' tùùrù ùgò dịka ọkaibe nà ndị nke mbụ, ebe ndị 'Day Secondary School, GRA, Enugu' gbàrà ndị nke abụọ; ndị 'New Layout Secondary School' wee rachazie iko dịka ndị nke atọ.

Ụlọakwụkwọ ndị ọzọ sonyere na ya bụ asọmpi gụnyèrè 'Government Secondary School, GRA, Enugu,' 'Bishop Otubelu Memorial Secondary School, Enugu,' 'Kings High School, New Heaven Enugu,' 'Good Shepherd Anglican Seminary School, Enugu,' na 'Uwani Secondary School, Enugu.'

Na mbụ n'ozi nnọọ ya, onyeisi nhàzi ụlọ mgbasa ozi FRCN n'isi ụlọ ọrụ ahụ na mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ ala anyị dị n'Enugu, bụ Maazị Ike Okere kọwàrà asọmpi ahụ dịka nke magburu onwe ya n'ihi na ọ bụ ótù ụzọ pụrụ iche e nwere ike isi tutekwa asụsụ Igbo n'ụra ọzọ.

Maazị Okere nke onye nọchitere anya bụ onyeisi nlekọta ụlọ mgbasa ozi 'Coal City FM, Enugu,' bụ Oriakụ Joy Obitụlata Ijọmanta mere ka a mara na nke ahụ bụ otu n'ime ụzọ ụlọ mgbasa ozi ahụ si atụnye ụtụ nke ya n'ịkwàlite asụsụ Igbo, ma kpọkuzie ụmụakwụkwọ bịara mmemme ahụ ka ha jigidesie ihe ha na-amụta n'asọmpi ahụ ike ma na-asụsikwa asụsụ Igbo ike oge ọbụla na n'ebe ọbụla.

N'okwu nke ya, onye chịkọbara, ma bụrụkwa isi a hụrụ kwaba okpu na asọmpi ahụ, bụ Maazị Ibiam Ude Ufiem kèlèrè ụlọakwụkwọ na ụmụakwụkwọ dị iche iche sonyere na ya bụ mmemme, ndị ọka ịkpe na asọmpi ahụ, tinyere ụlọ ọrụ FRCN, maka ezi ịgba mbọ ha, ezi ọrụ ha na ntụnye ha ime ka ya bụ mmemme gaa siriri-werere.

Ka ọ na-arịọ ndị nkuzi na ndị nne na nna ka ha jisie ike na-akụziri ụmụaka ha asụsụ na omenala Igbo; Maazị Ufiem, bụkwa ọkaibe n'ịma mbe, jikwazịrị ohere ahụ kpọkuo ọhaneze na ụlọ mgbasa ozi dị iche iche, ka ha jisie ike na-atụnye ụtụ nke ha n'ịkwalite njirimara, omenala na asụsụ Igbo, iji hụ na ya bụ asụsụ anwụghị maọbụ fùó, dịka ndị otu mba ụwa bụ UNESCO siri búó n'amụma n'ahọ 2012.

Anyị ga-echeta na ụlọ ọrụ FRCN na 'Igbo College' nọrọ na mmemme asọmpi asụsụ Igbo ahụ nke ahọ gara aga wee nye ụlọ mbipụta akwụkwọ akụkọ 'Ka Ọ Dị Taa' na 'National Light' asambodo òtùtó na nkwanye ùgwù maka ezi ọrụ ya agbambọ ya n'ịkwalite asụsụ na omenala Igbo.

Ndị bụ ọka ikpe n'asọmpi ahụ nke ahọ a gụnyèrè Maazị Chinedum Ọfọmata, Oriakụ Evelyn Igbokwe, na Oriakụ Chinyere Nwaụda.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.