IGP Adamu Ètòólá Anambra Maka Ezi Ọnọdụ Nchekwa

Mar 6, 2021 - 16:00
Mar 8, 2021 - 09:35
 0
IGP Adamu Ètòólá Anambra Maka Ezi Ọnọdụ Nchekwa
IGP Adamu Ètòólá Anambra Maka Ezi Ọnọdụ Nchekwa

Izunna Okafor dere akụkọ a

Onyeisi ndị uweojii n'ala Nigeria, bụ IGP Mohammed Adamu ètòóla ọchịchị steeti Anambra maka ọrụ ya n'ịkwalitè ezi ọnọdụ nchekwa bụ ịgbà na steeti ahụ, nke mezịrị ka ya bụ steeti bụrụ ejiamaatụ na ebe nlegara anya n'ihe gbasaara nchekwa n'ala Nigeria.

IGP Adamu kwupụtara ekele a na nnukwu ọgbakọ ya na ndịisi oche nchereoge n'ime steeti ahụ, ndị eze ọdịnala, ndị ndu obodo, ndị ndu òtù ASATU, ndị ndu ndị ntorobịa na ndị ndu òtù Ọhaneze Ndịigbo n'ime steeti ahụ nwèrè n'Awka, bụ isi obodo steeti Anambra.

Ya bụ ọgbakọ, nke ọ aka na-achị steeti ahụ bụ Gọvanọ Willie Obianọ chịkọbara, bụ nke ebumnobi ya bụ iji tụgharịa uche ma tụkọọ arò ọnụ banyere etu a ga-esi jigide ma kwàlite ezi ọnọdụ nchekwa ahụ dị na steeti ahụ ka ọ nọgide ma kawanye mma, ọkachasị ọnọdụ nchekwa ime-ime obodo dị iche iche.

N'okwu ya n'ọgbakọ ahụ, IGP Adamu, nke ọ bụ osote ya na-ahụ maka ego na nhàzi, bụ DIG Joseph Egbunike nọchitere anya ya kọwara na ọ bụ usoro na atụmatụ nchekwa steeti Anambra ka ọtụtụ steeti dị iche iche n'ala Nigeria na-eñòmi ma na-agbasò, ma kwuo na ọgbakọ ahụ a haziri bụ nke magburu onwe ya, ọkachasị n'ilekwasà anya n'etu ọnọdụ ala Nigeria siri debe isi na ọnụ ugbua.

Ya bụ onyeisi ndị uweojii kèlèzịrị aka na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obianọ maka ịgbà o tigoro na ngalaba nchekwa steeti ahụ, kelee ndị Anambra na òtù dị iche iche na-enye aka ime ka ọnọdụ nchekwa steeti ahụ bụrụ ọkaibe. 

Ọ kpọzịrị òkù ka a tụkọrịta uche ọnụ, jikọọ aka, ma gbasie mbọ ike iji mee ka ezi ọnọdụ nchekwa ahụ dị na steeti ahụ kawanye mma, iji hụ na ajọ ọnọdụ nchekwa ahụ a na-ahụtazị na mpaghara ebe dị iche iche ugbua, nke gụnyere nsogbu ndị Boko Haram, ndị ojiegbe ezu, ntọrị mmadụ, na ajọ ọnọdụ nchekwa ndị ọzọ dị etu ahụ abataghị na steeti ahụ.

N'okwu nke ya, Gọvanọ Willie Obiano mere ka a mara na nchekwa so n'ezi ihu n'ihe kacha echu ọchịchị ya ụra n'ime steeti ahụ, n'ihi na inwe ezi nchekwa na-enye aka n'ịdọta ndị ji ego achụ ego, na-akwàlite ọnọdụ akụnụba na ọnọdụ mmepe n'ụzọ dị iche iche.

O mere ka a mara na e mechaa ngụkọ ọnụ ahụ a na-agụkọ ndị na-achị ehi na steeti ahụ, na a gaghị enwezịkwa onye ga-achịrị ehi ya na-agagharị agagharị n'ime steeti ahụ ọzọ, maka na a gaghị anabata nke ahụ ọzọ chaa chaa na ya bụ steeti.

O nyekwara ndị uweojii steeti ahụ ntụziaka ka ha lebà anya na nke ahụ, iji tinye ya n'ọrụ n'ozuzuoke, ma gbakwa mbọ hụ na a gaghị enwezị onye ọbụla na-achị ehi ga-ebu égbè wee na-agagharị na steeti ahọ ọzọ, malitezie ugbua gaba.

O kelere ụlọọrụ nchekwa dị iche iche dị na na steeti ahụ, kelee ndị eze ọdịnala, ndị ndu obodo na ndị ọzọ e ji okwu ha agba ìzù na nglaba nchekwa steeti ahụ, maka inyere ndị ọrụ nchekwa aka n'ọrụ ha ịchụ mpụ na arụrụala ọsọ na steeti ahụ, ma kpọkuo ndị Anambra ka ha gaa n'ihu inye ha ụdị nkwàdo dị etu ahụ.

N'okwu nke ya, onyeisi ndị uweojii na steeti Anambra, bụ CP Monday Kuriyas gbara akaebe na e nwerennọọ ezi ọnọdụ nchekwa bụ ịgba na steeti ahụ, nke mezịrị na ọnọdụ mmepe, azụmahịa na ihe ndị ọzọ na-abawanye, ebe ndị mmadụ jikwa anya ha abụọ arahụ ụra n'udo.

Dịka ọ na-etò ọchịchị steeti ahụ na Ndị Anambra maka ezi nkwàdo ha na-enye ndị ọrụ nchekwa, CP Kuriyas kwèzịrị nkwà na steeti ahụ ga-aga n'ihu inye ụmụafọ steeti ahụ ezi nchekwa, ọbụladị dịka ọ gwara ndị omekoome, ndị ohi, na ndị ọzọ na-ewèta ala adịghị mma n'ime steeti ahụ ka ha chegharịa ugbua maọbụ kwakọrọ ngwongwo ha si na steeti ahụ pụọ.

Ndị dị iche iche sonyere na ya bụ mmemme nọrọ na ya wee tụlee ma tụgharịa uche banyere ọnọdụ nchekwa steeti ahụ, dịka o siri metụta etu a ga-esi wee jigide ma ma mee ka ọ kawanye mma.
 
Ụfọdụ ndị dị iche iche sonyere na ya bụ mmemme gụnyere: onyeisioche òtù jikọtara ndị eze ọdịnala na mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ ala Nigeria, ma bụrụkwa eze ọdịnala obodo Ọnịtsha, bụ Igwe Nnaemeka Alfred Achebe; Kọmishọna steeti ahụ na-ahụ maka ihe gbasaara echichi ọdịnala na ọchịchị ime-ime obodo bụ Maazị Greg Obi; onye ndụmọdụ pụrụ iche nye Gọvanọ n'ihe gbasaara ọchịchị ime obodo na echichi ọdịnala, bụ Ọkaiwu Vera Okechukwu, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ ọnụ na-eru n'okwu na ngalaba dị iche iche na steeti ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484