Igwe Eziagụlụ-Otu Agụleri Agbaala Ọvala Mbụ Ya

Jan 20, 2021 - 16:32
Jan 21, 2021 - 18:20
 0
Igwe Eziagụlụ-Otu Agụleri Agbaala Ọvala Mbụ Ya

By Izunna Okafor

Ọ kpọtụrụ akpọtụ ma kwòó èkwòó n'obodo Eziagụlụ-Otu Agụleri, dị n'okpuru ọchịchị ime obodo 'Anambra East' nke steeti Anambra, dịka eze ọdịnala obodo ahụ, bụ Igwe Lawrence Nwofia mere mmemme ịgba Ọvala mbụ ya, dịka eze ọdịnala obodo ahụ.

Ya bụ mmemme bụkwa nke ndị obodo ahụ nọrọ na ya wee gbaara eze ọdịnala ha lara mmụọ, bụ Igwe Titus Nwatah, Ọvala ikpeazụ, ma bụrụkwa óké mmemme dọtara ndị e ji okwu ha agba izu na mpaghara ebe dị iche iche n'ala Nigeria.

Ụfọdụ obodo ahụ, ndị ichie, ndị Ojianị na eze ọdịnala ahụ, bụ Igwe Nwofia siri n'obi ya wee tiri egwu okanga igba eze wee gaa be Igwe Nwatah lagoro mmụọ, iji kwanyere ya ùgwù ikpeazụ ma sị ya gàá ije ya nke ọma.

N'okwu ya oge ọ na-awa ọjị na mmemme ahụ, Igwe Lawrence Nwofia, ónyé kọwara mmemme ahụ dịka omenala ha na-eme na mgbe na mgbe iji chee obodo ahụ n'ihu Chineke, kèlère Chineke maka ndụ na ahụike nke o jiri gọzie obodo ahụ na ụmụafọ ya, ma ndị nọ n'obodo ahụ ma ndị nọ ebe dị iche iche were agbara onwe ha mbọ.

Dịka ọ na-agọ ọfọ ogologo ndụ n'isi ụmụafọ obodo ahụ, o kpere ka Chineke gaa n'ihu ịgọzi ya bụ obodo na ụmụafọ ya n'ezi ihe ọbụla ha na-emetụ aka, ọbụladị dịka ọ kpọkùrù ụmụafọ obodo ahụ ka ha na-etinye obodo ahụ n'ekpere oge niile ma na-atụnyekwa ụtụ nke ha n'ezi ụzọ ọbụla ha nwere ike, iji wee kwàlite ọnọdụ mmepe tọrọ àtọ n'obodo ahụ.

Na ntụnye nke ya, onye na-anọchite anya ọgbọ nta nkwàdo 'Anambra East na West' bụ Maazị Chinedu Obidigwe kelère Chineke na ndị obodo ahụ maka udo na-achị n'obodo ahụ, ma kelee aka na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obianọ maka ezi atụmatụ mmepe ime obodo dị iche iche o ji n'aka n'ime steeti ahụ, nke obodo ahụ na obodo ndị ọzọ dị iche iche n'ọgbọ nta nkwàdo ya ahụ kètàgòrò òkè ma rite úrù na ya.

O kpere ka udo na ịdịnotu na ọganihu gaa n'ihu ịdị na-achị n'obodo ahụ, ma kpọkuo ụmụafọ obodo ahụ ka ha gaa n'ihu inye eze ọdịnala ahụ nkwàdo zuru òkè na ikpere ya ekpere, iji wee nwee ike ịga n'ihu na-edu ha etu o siri kwesi ekwesi na n'egwu Chineke.

N'akụkụ nke ya, onyeisi oche òtù jikọtara ndị isi ọchịchị obodo dị iche iche na steeti Anambra, bụ òtù ASATU, Maazị Alex Onukwue gosipụtara obi ụtọ ya banyere etu ihe si aga n'obodo ahụ, ọkachasị etu mmadụ dịka Igwe Nwofia siri bụrụ eze ọdịnala obodo ahụ, ọbụladị dịka o kwupụtara ezi olileanya o nwere na ya bụ obodo na ụmụafọ ya nọ n'ezi aka, n'ihi na eze ọdịnala ahụ pụrụ iwètà ezi mgbanwe na ọnọdụ mmepe pụrụ ichè n'obodo ahụ.

Maazị Onukwue dụkwazịrị eze ọdịnala ahụ ọdụ na ọ dabere ma tụkwàsị obi na Chineke maka amamihe, nghọta, amara na ihe ndị ọzọ ga-enyere ha aka ịnọ n'oche eze ahụ ma duo obodo ahụ etu o siri kwesi, ma rịọ ndị obodo ahụ maka nkwàdo zuru òkè n'isi eze ọdịnala ahụ, n'ihi na ótù osisi anaghị eme ọhịa.

Eze ọdịnala Ụmụeri, bụ Igwe Ben Emeka, onye gara isonyere eze ọdịnala ahụ na ndị obodo ahụ n'imerùbè oke mmemme na oke ụbọchị ahụ kpọkuru eze ọdịnala ahụ ka ọ bụrụ onye na-aña ntị nke ọma ma bụrụkwa onye na-anabata ezi ndụmọdụ ma na-etinye ya n'ọrụ, iji mee ka ọchịchị ya gaa siriri-werere.

Eze ọdịnala ndị ọzọ sonyere na mmemme ahụ gụnyere eze ọdịnala obodo Agụleri, bụ Igwe Michael Idigo; nke Enugwu Aguleri, Eze Chukwuemeka Eri; nke Enugwu Otu Aguleri, bụ Igwe Emmanuel Obiora, na nke Mkpụnando Agụleri, bụ Igwe Johnson Mbanefo.

A nọrọ na mmemme ahụ wee chie ụfọdụ mmadụ echichi ọdịnala, nke gụnyere Maazị Nnamdi Onukwube na ụfọdụ ndị ọzọ site n'aka Igwe Nwofia, bụ ndị mepụtagoro ihe dị iche iche dara ụda n'obodo ahụ.

Ihe pụtakarịchara ihe na ya bụ mmemme gụnyèrè ịgba egwu ọdịnala dị iche iche na ibu ìhù (paying homage) nyegara Igwe Nwọfịa site n'aka ndị dị iche iche bịara mmemme ahụ, tinyekwara emume ịkụ ngazị n'eze, maka na ọ na-abụ a nọkọọ, e righị, ọ dị ka e jere ibesu ozu be ndị mmụọ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.