Ịhe karịrị mmadụ 450,000 na-eme ngagharị ịwe na Spen

Ịhe karịrị mmadụ 450,000 na-eme ngagharị ịwe na Spen

Oct 22, 2017 - 06:48
Jan 20, 2021 - 06:49
 0
Ịhe karịrị mmadụ 450,000 na-eme ngagharị ịwe na Spen

O weghị oge onye isi ọchịchị mba Spen, Mariano Rajoy, kwuchara na Spen ga-eweghara ọchịchị mpaghara Katalonịa ahụ na-achọ ịnwere onwe ya site n’aka Spen, igwe mmadụ gbakọrọ na mpaghara Katalonịa na Spen dị ịche ịche maka ịme ngagharị ịwe.

N’ụbọchị Satọdee, abalị 21 nke ọnwa Ọkụtoba, ịhe karịrị mmadụ 450,000 gbakọrọ n’ogige Barcelona Centre n’obodo Madrid. Ha pụtara ịme ngagharị ịwe megide mkpebi ahụ gọọmenti mba Spen mere maka ịweghara ọchịchị mpaghara Katalonịa ahụ chọrọ isi na Spen kewara.

Ọtụtụ ndị ahụ na-eme ngagharị iwe jicha flagụ Katalonịa, nke a na-akpọ Estelada n’asụsụ spanishi.

Ndị uwe ojii na ndị ọlụ nchekwa nke mba Spen ji ụgbọelu helịkọpta na-efeghara n’ebe niile ahụ a na-eme ngagharị iwe.

Ụfọdụ ndị ahụ na-eme ngagharị iwe na-ekwu n’olu ike na-asị na ha ejighị ụjọ chaa chaa. Ịtụ egwu abụghị maka hanwa. Ha ga-aga n’ihu n’ịkpọ oku referendum ahụ ha na-akpọ ka Katalonịa si na Spen kewara, wụrụ mba nke aka ya, ma nọkwara onwe ya.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.