Ihe Mberede Okporo Ụzọ Abụọ Ọzọ Adapụtala n'Anambra

Mar 2, 2021 - 06:51
 0
Ihe Mberede Okporo Ụzọ Abụọ Ọzọ Adapụtala n'Anambra

 Dịka Mmadụ Iteghete Gbanahịrị Ọnwụ Ha

Izunna Okafor dere akụkọ a


Ótù nnukwu ụgbọala e ji ebu ibu (nwere akara efere ABN 440 VP) na nnukwu ụgbọala ọzọ e jikwa ebu ibu (enweghị ákàrà) nọrọ ụbọchị Tuzdee wee nwee ihe mberede okporouzọ, dị n'okporoụzọ ochie Umuokpu esi aga Ọnịsha.

Onye na-ahụ maka mgbasàozi n'ụlọọrụ 'Federal Road Safety Corps' (FRSC) n'ime steeti Anambra, bụ SRC Florence Edor kwupụtara nke a n'ozi ọ kụpụụrụ ndị nta akụkọ n'Awka.

Dịka o siri kwuo, ndị ọnọmgbeomere kwuru na ọ bụ ịgba oke ọsọ na mmadụ isi n'ụzọ ekwesighị ekwesi wee chọọ ịgbafè ụgbọala ọzọ kpàtàrà ihe mberede okporoụzọ ahụ. Ọ kọwara na ihe mberede ahụ mètụtàrà mmadụ anọ (bụcha ụmụnwoke), mana o nweghị onye ọbụla n'ime ha nwetara mmerụahụ ọbụla maọbụkwanụ tụfuo ndụ ya.

O kwuzịrị na ndị ọrụ FRSC nọ n'Ọka (Awka) gara n'ebe ahụ ya bụ ihe mberede mere ozigbo, wee bughasịa ụgbọala na ihe ndị ahụ dachiri ụzọ.

Ka ọ na-ekwu okwu bànyere nke ahụ, onyeisi ụlọọrụ FRSC na steeti Anambra, bụ C.C. Andrew Kamapayi dọrọ ndị na-anya ụgbọala aka na ntị megide ịgba oke ọsọ na isi n'ụzọ ekwesighị ekwesi wee na-agbafè onye ọzọ, ọkachasị n'ebe gbagọrọ agbagọ.


N'akụkọ nke ọzọ dịkwa ka ibè ya, mmadụ ise ọzọ gbanahịrị ọnwụ ha, dịka otu nnukwu ụgbọala NISSAN nwèrè nsogbu mberede, wee dànyere otu onye ọgbatumtum na-agara onwe ya na ncherịta ihu ụlọụka 'Deeper Life Church' dị n'Ụmụnze, n'okpuru ọchịchị 'Orumba South' nke steeti Anambra.

Akụkọ kọrọ na ya bụ ihe mberede dapụtara oge ụgbọala ahụ pụnahịrị onye na-anya ya n'aka n'ihi ihe ahụ mebiri na ya oge ọ nọ n'ọsọ, nke mezịrị ka o búó ya aka, ò wèé dànyere onye na-anya ọgbatumtum bụ Maazị Jacob Okoye, bụkwa onye na-abịa n'ihu oge ahụ.

Mmadụ ise (nwoke anọ na ótù nwaanyị) nọ n'ime ụgbọala ahụ oge ya bụ ihe mberede dapụtàrà, mana mmadụ atọ n'ime ha (nwoke abụọ na otu nwaanyị) nwètèrè mmerụahụ n'ogoogo dị iche iche n'ihe mberede ahụ, ma bụrụkwazie ndị otu onye ọrụ obi ebere nọ ebe ahụ mgbe ahụ buuru gaba ụlọọgwụ ozigbo maka inye ha ọgwụgwọ, tupu ndị ọrụ FRSC sitere mpaghara Ụmụnze wee bịaruo n'ebe ahụ oge ha nwetachara ya bụ ozi. O nweghịkwa onye ọbụla n'ime mmadụ ise ahụ tụfùrù ndụ ya.

Dịka ọ na-adọ ndị na-anyà ụgbọala aka na ntị ka ha gba mbọ na-eleru ụgbọala ha anya nke ọma tupu ha eburu ya pụta n'okporoụzọ, onyeisi ụlọọrụ FRSC na steeti ahụ bụ CC Kumapayi kpekwazịrị ka ndị ahụ nwetara mmerụahụ gbakere ma nwere onwe ha n'oge adịghị anya.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484