Ihe mberede ụgbọelu egbuona mmadụ 150

Ihe mberede ụgbọelu egbuona mmadụ 150

Ihe mberede ụgbọelu egbuona mmadụ 150

N’ụbọchị Tuzdee, otu ụgbọelu bu mmadụ 150 dara kpọkasịa n’ugwu Alps e nwere na mba Frans. Ụgbọelu ahụ, bụ nke ndị Germanwings na-akwọ, si mba Spen na-alaghachị mba Jamini. Ụgbọelu ahụ bu ọtụtụ ụmụ afọ mba Jamini na mba Spen. A chọpụtara n’ụmụ akwụkwọ 16 ndị Jamini so na ndị a na-achọ achọ.

A na-atụ anya na e nweghị onye ga-apụta na ndụ site na ihe mberede ụgbọelu a. Ndị mmadụ amalitegori izigara ndị ụmụ nne na ụmụ nna ndị niile nọ n’ụgbọelu ahụ ozi nkasị obi. Oke mmiri ozuzo na ọnọdụ ihu eluigwe na-emekpa ndị ọrụ enyem aka ahụ.