Ịkwalite Asụsụ Igbo: Gọọmenti Na-Agbalị, Mana Ọrụ Ka Bara Ụba — Pita Ejiofor

Ịkwalite Asụsụ Igbo: Gọọmenti Na-Agbalị, Mana Ọrụ Ka Bara Ụba — Pita Ejiofor
Ịkwalite Asụsụ Igbo: Gọọmenti Na-Agbalị, Mana Ọrụ Ka Bara Ụba — Pita Ejiofor

Izunna Okafor dere edemede a

ỌKAMMỤTA PITA EJIOFOR bụ onye chọpụtara ma bụrụkwa onyeisi Otu Sụwakwa Igbo. N'ajụjụọnụ a  IZUNNA OKAFOR gbara ya, Ejiofor kọwara ụfọdụ ihe gọọmenti megoro banyere ịkwàlite asụsụ na omenala Igbo, ma mekwa ka a mara ụfọdụ ihe ndị ọzọ fọrọ afọ e kwesiri ime iji chekwaa asụsụ Igbo ka ọ ghara ịnwụ. Lee ka o siri mee:


Izunna Okafor: Kedu ihe i nwere ikwu banyere etu e si akwalite asụsụ na omenala Igbo na gọọmenti Anambra, dịka ọ dị taa?


Pita Ejiofor: Aga m asị na gọọmentị na-agba mbọ. Iji maa atụ, o tiri iwu na a ga na-eyizị ákwà/uwe ndị Igbo ụbọchị Wenezdee ọbụla n'ízù, ma ụmụakwụkwọ, ma ndị ọrụ oyibo. Ọ bụ gọọmenti nọ ugbua na steeti Anambra tiri iwu a, maka na ọ dịbụghị ya na mbụ. Gọọmentị a nọ ugbua tìkwàrà iwu na a ga na-asụzị asụsụ Igbo n'ụlọakwụkwọ niile na ụlọọrụ gọọmentị niile dị na steeti Anambra, kwa ụbọchị Wenezdee. Ya mere, n'ilekwàsị ige ndị a anya, aga m asị na iwepụta ọmarịcha atụmatụ iwu ndị a so n'ihe pụtakarịchara ìhè gọọmentị nọ ugbua n'Anambra megoro, ná ntụnye ya, iji kwàlite asụsụ na omenala Igbo.


Izunna Okafor: Kedu ihe ndị fọrọ afọ, maọbụ ebe e kwesiri ilebakwu anya, dịka o siri metụta ịkwalite asụsụ na omenala Igbo n'Anambra?

Pita Ejiofor: N'ịgwa gị nke bụ eziokwu, ihe a ka ga-eme eme karịrị ihe ndị e megoro eme. Iji maa atụ, ọtụtụ iwu niile ndị a e tiri, ejighị m n'aka na a na-aga leta ma a na-edobekwa maọbụ na-etinye ha n'ọrụ, dịka e siri kwuo. Onye chọọ ịmata banyere ihe m na-ekwu, ya gàá n'isi ụlọọrụ gọọmenti Anambra dị n'Ọka (Awka) ụbọchị Wenezdee, ka o jiri anya ya hụ ma mara mmadụ ole n'ime ndị na-arụ ebe ahụ jiri ejiji ndị Igbo wee bịa ọrụ. E tiri iwu na ọ bụ asụsụ Igbo ka a ga na-asụzị ụbọchị Wenezdee ọbụla; mana mụ na ụnụ ma na a naghị asụ ya, maka na o nweghị onye na-etinye anya na ya ịmata ma a na-asụkwa ya bụ asụsụ, dịka e siri kwuo. Ya bụ na ihe e kwuru ekwu e meghị eme hiri nne; ndị nke e kwughị ekwu hikwara nne. 


Ị bịa lee anya, gọọmentị ndị ọzọ nọ n'ala Nigeria, ụfọdụ n'ime ha etiela iwu na onye ọbụla bụ nwaafọ steeti ha emeghị nke ọma maọbụ nweruo ákàrà 'credit' n'asụsụ ha n'ule ọbụla e ji aba mahadum agaghị abà mahadum maọbụ ụlọakwụkwọ ọbụla dị elu. Ụfọdụ ndị m ga-akpọrọ gị tigoro iwu ahụ bụ steeti Lagos. Ị ma na ọ bụrụ na e tiri ụdị iwu a na mpaghara anyị, ị hụ onye ọbụla ọ gụba Igbo ozigbo, ma ọ sọrọ ya ma ọ sọghị ya. Ya mere na ụdị iwu ahụ dị mkpa ka e tie ya n'Anambra. Ụfọdụ na-asị na e tie ya, na ọ ga-emegide ndị latara alata. Echeghị m etu ahụ. Ihe ga-aka megide ndị latara alata bụ na mmadụ ga-eto bụrụ dimkpa, mana ọ maghị asụsụ obodo ya. Ya bụ na anyị ga-eleba anya, tikwa ụdị iwu ahụ. 

N'ịga n'ihu, ọ dịkwa mkpa ka e nwekwa iwu ndị gọọmentị tiiri onwe ha. Iji maa atụ, steeti Ekiti tiri iwu na mmemme ọbụla ha ga-eme gá-ákpọkọta ụmụafọ steeti ahụ, na ihe niile a ga-eme maọbụ kwuo n'ebe ahụ ga-abụ n'asụsụ Yoruba. Ihe nke a pụtara bụ na ma ihe niile onyeisi mmemme maọbụ onye nhazi okwu (MC) na ndị bịara mmemme ahụ ga-ekwu ga-abụ n'asụsụ Yoruba. Ụdị iwu ahụ dị anyị mkpa nnukwu n'ala Igbo n'ihi ọnọdụ asụsụ Igbo taa. Ọ na-atụ anyị n'anya oge ụfọdụ ma a bịa, ụfọdụ ndị nọ na gọọmentị selitere isi na-agwa ndị mmadụ (ndị Igbo) okwu n'ala Igbo, ha ana-asụrụ ha bekee. O tebeghị aka ndị mahadum Bayero dị na Kano mere nnukwu ọgbakọ, e wee nabata okwu ruru otu puku na narị abụọ (1200) e webata ọhụrụ n'asụsụ ndị Hausa, maka na asụsụ na-eto eto. Ndị nna-nna anyị hà ahụghị ihe anyị na-ahụ ugbua; ha amaghị ihe bụ ekwentị, tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ pụtara ọhụ adịghị n'oge nke ha. Ndị agbụrụ ndị ọzọ na-eme nzukọ ma kpaa ka ha ga-esi webata ụfọdụ okwu ọhụrụ ndị a n'asụsụ ha. Mana ejighị m n'aka na e meela ụdị ihe ahụ n'ala Igbo. Anyị bụ ndị Otu Sụwakwa Igbo arịọkatala ka e nyere anyị aka ka e nwee ụdị ọgbakọ a; mana aka mkpụmkpụ ekweghị gọọmenti nye aka. Ya bụ na ihe a ga eme akarịka, ọ karịrị nke e mere eme. 

Ọnọdụ asụsụ Igbo taa adịbeghị mma; onye Igbo ọbụla mà nke ahụ. Anyị anaghị ekwuzị maka ndị nne na nna ndị na-asụrụ ụmụ ha naanị asụsụ bekee, na ihe ndị ọzọ dị etu ahụ. A sị m kwuo, ọ bụkwanụ gọọmentị ga-akwụsịnwu ihe ndị a. O nweghị nne na nna anụbeghị nkụzi banyere ịkwalite asụsụ Igbo; ọ bụghị site n'ọnụ ndị Otu Sụwakwa Igbo, ọ bụrụ site n'ọnụ ndị Otu Sụwakwa Igbo kuziiri. Anyị enweghị ike ọbụla iji manye ndị mmadụ amanye ka ha mee ihe anyị na-ekwu maọbụ na-akụzi. Ọtụtụ oge ka anyị na-anata mkpesa banyere ụlọakwụkwọ ndị anaghị akụzi Igbo. Anyị nwetara otu na nsonso a banyere otu ụlọakwụkwọ nnọrọonwe anaghị akụzi Igbo. Ihe m na-akọwa bụ na ọ bụrụ na anyị chọrọ asụsụ Igbo ma kwere n'eziokwu na anyị chọrọ ya, onye ọbụla ga-ejikọ aka ọnụ wee kwalite ya; gọọmenti ga-emekwa nke o jiri bụrụ gọọmentị. 

Iji maa àtụ, n'oge korona rịkarịchara elu; oge a chọpụtara na ndị ahịa Eke Awka ekweghị eyi uwe mkpuchi imi (bụ 'facemask') maọbụ rube isi nye ntụziaka ahụ e nyere banyere ọrịa korona; gọọmentị wèrè iwe mèchie ahịa Eke Awka ruo ihe dịka izuụka abụọ, tupu o meghekwa ya. Ngwangwa o mepere ya, onye ọbụla were ọsọ ga goo ya bụ uwe mkpuchi imi ozigbo, ma màlitekwa irube isi na ntụziaka ndị ọzọ niile ahụ e nyere banyere ya bụ ọrịa; ma ndị ọ sọrọ, ma ndị ọ sọghị. Ọ bụ ụdị ihe dị etu a ka e kwesiri ime ma ọ bụrụ na a hụ ụlọakwụkwọ ọbụla dị n'ala Igbo a naghị akụzi Igbo. 


N'ụdị ọnọdụ dị etu ahụ, ihe a ga-eme bụ e mechie otu maọbụ abụọ n'ime ụlọakwụkwọ ndị na-eme ihe ahụ, ndị ụlọ mgbasaozi ekwusie ike ma mee ka a mara ihe mere e jiri mechie ya bụ ụlọakwụkwọ. Nke ahụ mee, ị hụ na o nweghị ụlọakwụkwọ ga-amalitezị inupù isi n'ihe dị etu ahụ ọzọ. Mana, matakwa na mmechi m na-ekwu abụghị nke ọ ga-abụ e mechie ya, ọ bụrụ kpamkpam maọbụ ọ dịbasịzie. Ọ bụrụ na e mechie ya, e nye onyeisi ụlọakwụkwọ ahụ ihe dịka izu ụka ole na ole, ka o were lebà anya ma megharịa ihe ọbụla mere na a naghị akụzi Igbo n'ụlọakwụkwọ ahụ. Ya bụ na ọ bụrụ na e mechie ya, ọ dịa nwa mgbe ntà, e meghekwa ya, maka na agụmakwụkwọ ụmụakwụkwọ ahụ dị anyị mkpa nke ukwuu. Ihe anyị anabataghị bụ na a bịa n'ụlọakwụkwọ Igbo, a na-akụziri ụmụakwụkwọ naanị asụsụ bekee, asụsụ French, asụsụ Chinese maọbụ asụsụ ndị ọzọ; mana a naghị akụziri ha asụsụ Igbo. Ọ bụ ihe jọgburu udele na njọ ma sigbuo nkakwụ n'isi. Ịmụta asụsụ ndị a niile dịchakwa mma, mana mmadụ ọbụla kwesigodiri ịmụta asụsụ nke obodo ya.

Izunna Okafor: Iji gbàkwụnye na nke ahụ, kedu ihe i chere banyere ime ka ọ bụrụ iwu na onye bụla a ga-enye ọrụ na steeti Anambra maọbụ n'ala Igbo gbaa gburugburu ga-edetarịrị akwụkwọ iwè ọrụ ya n'asụsụ Igbo, ebe ajụjụ ọnụ a ga-agba ya ga-abụkwa n'asụsụ Igbo?


Pita Ejiofor: Heei! Nke ahụ ga-amagbu onwe ya nụ. N'eziokwu, ị gbọrọ ihe ewu na-eri ugbua, maka na o teela anyị siri tinyebe anya n'ụmụ ihe ahụ; i wee kwutekwa ya taa. Ka m gwa gị nke bụ eziokwu asụsụ bekee siri ike ọgụgụ karịa asụsụ Igbo, mana otu ihe mere ndị mmadụ ji agụsi bekee ike ma na-amụtakwa ya bụ na e mere ya ka ọ bụrụ iwu na ọ bụrụ na ị maghị ya maọbụ mee nke ọma na ya site n'inwe ákàrà 'credit' na ya, ị gaghị enwe ike ịba mahadum; a gaghị ewèkwa gị n'ọrụ.  Dịka m siri gwa gị na mbụ, steeti dị icheiche emeela ya ka ọ bụrụ iwu na ị ga-emerịrị nke ọma n'asụsụ ha ma nweruo opekatampe 'credit' na ya tupuu ị bàá mahadum ha. Kedụzị ihe ji ndị Igbo ime nke ha?

Chetekwa na ndị Igbo na-atụ n'ilu, sị na ọ bụrụ na mbụzụ atụghị ọnụ oge ibe ya na-atụ, ala akpọnahị ya nkụ. Nke a mere o jiri dị mkpa na anyị mere ihe dị etu ahụ kwesiri na anyị ga-eme ugbua, dịka steeti ndị ọzọ megoro ya, tupu ihe akawanye njọ. O ruzie oge ahụ, anyị asịbazie na a na-akpagbu anyị n'asụsụ. Nke ahụ bụkwa asị, maka na o nweghịkwa ka gọọmentị si akpàgbu anyị n'asụsụ. Gọọmentị Nigeria kwuru n'akwụkwọ iwu na-achị ala Nigeria, na nkeji nke iri ise na ise (section 55) sị na ọ bụ asụsụ atọ ka a ga-agbakwụnyere asụsụ bekee wee na-eme ihe ọbụla na Nigeria. Gịnị bụ asụsụ atọ ndị? Hausa, Igbo na Yoruba. Ị bịakwazie n'akwụkwọ atụmatụ iwu na-achị mmụta, nke a kpọrọ 'National Policy on Education', e dewara ya edewa ka ọ pụta ìhè, sị ka onye Nigeria ọbụla mụta asụsụ ya, mana ya kabakwa ahụ mụta otu n'ime asụsụ atọ a gọọmentị nabatara n'akwụkwọ iwu ala Nigeria. Iji maa atụ, a sị onye bụ onye Efik mụọ asụsụ ya, mana ya mụtakwuo otu n'ime asụsụ atọ ahụ –Igbo, Hausa na Yoruba. Ya bụ na o nweghịkwa ka ndị Igbo ga-esi sị na gọọmenti na-akpagbu ha n'asụsụ. Onye ọbụla kwuru nke ahụ na-atụ nnukwu asị.


Ị makwa na ndị UNESCO depụtara akwụkwọ banyere etu a ga-esi na-akụziri ndị nta akara asụsụ ọdịnala? Ha mere mmemme mbupụta (launching ceremony) akwụkwọ ahụ n'Abuja; mana ha mezịrị ya n'usoro nzikọrịta ozi ọgbara ọhụrụ 'Zoom' n'ihi ọrịa korona. Mana ihe anyị hụgoro kemgbe ahụ bụ na a bịa tụgharịa ya na Hausa, ọ gaghị ete aka, ndị Hausa abịa gokọrọsịa nke ha; a tụgharịa ya na Yoruba, ọ gaghị ete aka, ndị Yoruba egokọsịa ya; mana a tụgharịa ya n'Igbo, ọ dọrọ, a gaghị ego ya; ọ bụrụ 'ewu erighị, ọkụkọ atụghị'. 

Ị gaa n'ụfọdụ ebe dị iche iche a na-aka ụka n'Abuja, ebe ndị Igbo soro bụrụ ụkọchukwu, a tụgharịa akwụkwọ ekpere maọbụ akwụkwọ e ji aka ụka n'asụsụ Hausa, Igbo na Yoruba, ndị Hausa na Yoruba egokọsịa nke ha ozigbo; nke ndị Igbo adọrọ ebe ahụ, n'agbanyeghị na ọ bụ ndị Igbo kacha n'ọnụọgụgụ mmadụ n'ebe ahụ. Ị hụla na ya bụ ihe jọgburu onwe ya, n'ihi ajọ ọnọdụ asụsụ Igbo nọ na ya taa na etu ndị Igbo si emeso asụsụ ha. Anyị ekwugidela, ma ka na-ekwukwa. Mana ị ma na anyị enweghịnị ike ịmanyé ndị mmadụ ka ha mee ihe anyị kwuru. Ọ bụ ya mere o jiri dị mkpa na gọọmenti lebàrà anya n'ihe ndị a niile anyị na-ekwu ma jiri ikike o nwere wee tinye ya n'ọzụ n'ozuzuoke. Ya bụ na atụmatụ gị ahụ ga-amagbu onwe ya ma ọ bụrụ na e mee ya.

Izunna Okafor: Kedụ ihe i nwere ikwu banyere ndị nkuzi ndị ji asụsụ bekee were akụzi asụsụ Igbo n'ụlọ akwụkwọ?


Pita Ejiofor: Ka m gwa gị, ndị òtù mba ụwa UNESCO kwuru na asụsụ Igbo ga-anwụ; ihe ahụ bụghị njakịrị maọbụ egwuregwu. Ha mere nchọcha, wee hụ na ihe na-eme n'asụsụ Igbo, na a hapụ ya etu ahụ, ị mara na asụsụ Igbo ga-anwụnyụ anya. Mana ekele dịrị Chineke na ọtụtụ ndị mmadụ bụ ndị Igbo ñụrụ ara nne ha nke ọma na-agbasi mbọ ịhụ na e mehàrịsịrị ihe ndị a. Iji maa atụ: ị hụkwara ka ọ dị na ntị, bụ onye nkuzi iji asụsụ bekee were akụzi asụsụ Igbo n'ụlọakwụkwọ? Ò nwere onye amaghị na nke ahụ bụ ihe a na-ahụtazị ugbua n'ọtụtụ ụlọakwụkwọ dị icheiche, ma bụrụkwa ihe jọgburu onwe ya? Ọ na-adị mma onye mee nke ọma, è tòó m ya. O nwere ótù onye nkuzi na mahadum ala anyị dị na Nsụkka kwugidere sị emezịna ihe dị etu ahụ na mahadum ahụ (oge ọ ka nọ n'ọkwa dị àlà), a na-elelị ya. Chineke wee megide ihe, o wee ruo ogoogo ọkammụta. Ngwangwa o ruru ogoogo ahụ, ọ mazị ka o siri me, e wee machie ya kpamkpam, mmadụ imezị ihe dị etu ahụ na mahadum ahụ. Aha onye ahọ bụ Ọkammụta Innocent Nwadike, onye Imo na-akụzi na mahadum Nsukka ahụ. Ọ bụ ya kwụsịrị iji asụsụ bekee wee na-akụzi asụsụ Igbo na mahadum ahụ. 

Enyekwara m aka n'ebe ụfọdụ, maka na ofu ihe bụ ịkụzi Igbo, nke ọzọ bụkwa a bịa a sị na mmadụ nwere nzèré 'Degree' maọbụ 'Masters' n'Igbo; mana a gazie n'akwụkwọ o jiri nwete nzèré ahụ, ọ bụrụ na bekee ka e dere ya. E mechaara o nwee kọmitii e tinyere m na ya na mahadum Nnamdị Azikiwe, a zọọ ya ka e si azọ; m wee gwa ha na m ga-apụkwa na kọmitii ahụ ma ọ bụrụ na ha anabataghị na onye ga-agụ Igbo maọbụ nwee nzèré 'Degree', 'Masters' maọbụ 'PhD' n'asụsụ Igbo, na ihe ọ ga-ede bụkwa n'asụsụ Igbo ka ọ ga-ede ha niile. Otu onye nkụzi wee sị kedu onye ga-agụ ihe ndị ahụ ma ọ bụrụ na e dechaa ha n'asụsụ Igbo? M wee gwa ha sị mechienụ ngalaba asụsụ Igbo ma ọ bụrụ na o nweghị onye ga-agụ ya, maka na ọrụ ha bụ ịnọ, wepụta ma kwàlite etu a ga-esi na-agụ Igbo. Ama m na ugbua, na ọ bịara dị ka a ga-asị na ọ na-ahịa ahụ ịgụ asụsụ Igbo. Mana otu n'ime nsogbu mere asụsụ Igbo jiri dị ka ọ na-ahịa ahụ ọgụgụ bụ na a naghị ede ya nke ọma ka o siri kwesi. Ọ bụrụ na e dee ya nke ọma etu e kwesiri isi wee dee ya, ọ dị mfe ịgụ ya agụ. 

O nweghị asụsụ dị ofere, maka na ị sị m kwuo, m ga-asị na asụsụ bekee sokwa n'asụsụ sikarịchara, maka na o nweghị ihe ị gaghị ahụfọ n'asụsụ bekee. Iji maa atụ, n'asụsụ bekee, a kpọọ 'Ch' otu ihe ebe a (dịka 'Chemistry'), a kpọọ ya ihe ọzọ n'ebe ọzọ (dịka 'Church). O nwere otu mgbe m legidere ụmụ ihe ndị a wee jụọ kedụnnọọ ka mmadụ siri mechaa wee mụta asụụ bekee a? Ya bụ na asụsụ bekee siri ike mmụta, mana n'ihi na a na-akụzi ya, ma bụrụkwa na ọ bụ ya ka ọ ga-abụ mmadụ emeghị nke ọma na ya n'oge ule, ọ gaghị abanye mahadum; onye ọbụla na-agụ, na-amụ ma na-asụ ya. Mana ọ bụrụ na e tie ụdị iwu ahụ maka asụsụ Igbo, ị mara na onye ọbụla bụ onye Igbo ga-ebido gụsibe asụsụ Igbo ike, na-amụ, ma na-asụkwa ya. 

Ozi niile a anyị na-agbasa banyere ikwalite asụsụ Igbo nọ ọdụ ka ọ bụ njakịrị ka anyị na-ama (ana m ekwu ka ọ dị n'obi). Ọ bụ ihe doro anya na o nweghị ihe ndị mmadụ na-eme ma ọ bụrụ na e nweghị mmanye ọbụla na ya maọbụ jiri aka ike wee so ha. Ya bụ na gọọmentị –(maka na ọ bụ gọọmenti ji ikike kacha ikike n'ụwa gbaa gburugburu ma e wepụ Chineke, mana a gaghị ewepukwanụ ya) —kwèsìrì ileba anya n'ihe ndị a niile anyị kwuru. Ọ bụrụ na e tinye ihe ndị a n'ọrụ ma jiri mmanye wee so ya, ana m agwa gị na ọ gaghị eru otu ahọ maọbụ ahọ abụọ, ndị a niile na-ekwu na ha amaghị asụ maọbụ ghọta asụsụ Igbo akwụsị ime nke ahụ ozigbo. Ha niile ga-amalite sụba ma ghọtaba asụsụ Igbo n'ike.

Dịka mgbakwụnye n'ihe ndị fọrọ afọ gọọmenti kwesiri ime iji kwalite asụsụ Igbo, onye gọọmentị ọbụla ga-agwa ndị Igbo okwu, kwesiri ka o kwuo ya n'asụsụ Igbo. Nke ahụ bụ ihe Obasanjo na-eme na Yoruba; ma bụrụkwa ihe Buhari na-eme ma ọ chọọ ịgwa ndị Hausa okwu. Ọ bụ anyị ka ndị ahụ n'ogoogo? Tupu onyeisiala Nigeria n'oge mbụ bụ Yaradua lagoro mmụọ anwụọ, okwu ikpeazụ o kwuru bụ na BBC Hausa ka o kwuru ya. I lechaa ihe ndị anya, amaghịzị m ihe o jiri dị ka ọ bụzị anyị bụ ndị Igbo ka asụsụ bekee kachara dị mkpa karịa ndị Nigeria ndị ọzọ. 

Ka anyị na-ekwu nke a ka anyị na-ekwukwa maka ndịisi ụka. Ndịisi ụka kwesiri ịma na Chineke bụ ya kere ma nye anyị asụsụ Igbo. Ọ bụrụ na ọ bụ Ekwensu nyere anyị Igbo, anyị akwụsị ya; mana ọ bụ Chineke nyere anyị asụsụ ahụ. Ya bụ na o kwesiri anyị na-agwa ya okwu, na-arịọ ya ihe, anyị ejiri asụsụ o nyere anyị wee na-eme ya. Onye ọbụla gbaghaa ihe a m na-ekwu, ya gaa n'Akwụkwọ Nsọ, gụọ Nehemiah 13:22-25 ka ọ hụ ihe Akwụkwọ Nsọ na-ekwu maka ndị amaghị asụsụ ha na ndị hapụrụ asụsụ ha sụba asụsụ ndị ọzọ. Nke a bụ ihe dị n'Akwụkwọ Nsọ; ọ bụghị m dere. Ya bụ na amaghịzị m ihe anyị bụ ndị Igbo jiri gbakụtazie asụsụ anyị azụ, ma were asụsụ ndị mba ọzọ na-aka ụka oge niile n'ala Igbo. Nke a bụzị ndị ụka niile na-eme ya, mana ndị kachabụ eme ya bụ ndị ụka ọgbara ọhụrụ. Ya bụ ihe ajọka.


Izunna Okafor: È nwègàsịrị ihe iche aka mgba na-adọghachi aka elekere azụ n'ịkwalite asụsụ na omenala Igbo?


Pita Ejiofor: Ihe na-eche aka mgba ebuka. Nke mbụ bụ na ndị be anyị na-enwekarị mmasị n'ihe si na mba ọzọ, karịa nke anyị. A bịa ugbua n'ihe dịka nri, ọ bụ ugbua ka anyị bidorokwa kpọba nri be anyị nri. Ụfọdụ ndị ọcha hụrụ mmanya ngwọ n'anya nke ukwuu karịa mmanya nke ha, maka na ọ bụghị naanị na ọ bụ mmanya dị ka Chukwu siri kèé ya; ọ bụkwa mmanya chukwu kechasịara, tinye ya ihe niile a chọrọ. Mana a bịa na be anyị, ndị be anyị ana-akpọ ya 'mgbàgbú ijiji'. Ị ma na ngwọ bụ mmanya na-ekpò íkpò ọma ma na-atọkwa ezigbo ụtọ, nke na ọbụladị ijiji, añụ na ihe ndị ọzọ na-enwe mmasị na ya. Mana ọ na-abụzị ijiji bịa ịñụ ya oge a gbanyere ya n'iko, wee nwee ka o siri dànye n'ime ya, ọ gbàgbuo ya; ndị be anyị wee bidozie kpọba ya mgbagbu ijiji. Ọtụtụ ndị Igbo anaghị añụkwa ya.

Ọtụtụ ihe a na-eribụ be anyị, ndị be anyị gbakụtazịrị ha azụ. Ọbụladị ugiri, a naghị atakarịzịkwa ya; ihe a na-akpọzị ya bụ 'Monkey Mango'. Ị gaa n'ime ahịa, otu ekpem mmanya ndị ọcha mepụtara, e nwere ike na-ere ya N10,000; mana nke anyị nwetazịrị be anyị, anyị akpọọ ya 'ilicit gin'. Ya bụ na anyị bịara jide ihe anyị nwere, wee kọtọchasịa ha, ma na-enwezị mmasị na nke ndị ọcha. O kwesiri ka anyị malite imezigharịsị ụfọdụ aha ahụ anyị ji akọtọsị ihe e meputere na be anyị. Obasanjo amakwụghị onye m bụ, mana o nwere otu ihe o mere tọrọ m ụtọ oge ọ na-achị. Ọ sị sị akpọzịna mmanya ngwọ 'Palm wine', kama sị kpọbazie ya 'Champalm' (dịka 'Champagne' bụ mmanya na-ewù oge ahụ) ka o wee wèlite aha ya.

Nke abụọ bụ na o kwukwara na ndịisi ga-esozị na-añụ ya oge ahụ. Ọ bụrụ na ị bịa n'ebe a na-eme nnukwu oriri, ị hụ ka a ga-eburu mmanya waịnụ dọbara ndịisi na teburu, ma buru mmanya ngwọ dọbara ndị obere mmadụ nọ. Mana oge Obasanjo kwuchara nke ahụ, ọ bụrụ na ị bịazie n'ebe ahụ ndị nnukwu mmadụ nọ, ị hụkwa mmanya ngwọ, hụ ihe e ji agbara ya. Ka a na-ekwu maka asụsụ ka a na-ekwu maka ákwà na ejiji. Nke a pụtara na ndị isi dị mkpa n'inye aka n'ịkwàlite ihe ndị a, maka na a naghị ahapụ isi mkpịsị aka wee gbaba ụrịọm; mmadụ enweghị ike ime ya. Ya bụ na ngwangwa ndịisi nyere ntụziaka ma malite imezupụta n'onwe ha, ị hụ na ndị ha na-achị achị ga-esonyebe ozigbo ozigbo.

Otu ọ dị, onyeisi anaghị amacha ihe niile. Ya bụ na o kwesiri o nwee onye ọbụla jiri atụmatụ dị mma wee bịa, onyeisi anabata ya, ma nụrụkwa ihe o jiri bịa. Ọ bụrụ na o kwuchaa, a nabata atụmatụ ya ahụ, e were ya tinye n'ọrụ. Arụọla m ọrụ dịka onyeisi n'ụfọdụ ogoogo dị icheiche, mara ihe dị na ya. Arụọla m ọrụ dịka Kọmishọna, rụọ ọrụ dịka onyeisi mahadum, tinyere ebe ndị ọzọ. Ya bụ na amaratụla m ihe ụfọdụ ndịisi na-ahụ. Otu ihe m kachara mụta n'oge ahụ ịña ntị n'atụmatụ ọbụla ndị m na-achị wetara ma lebaa ya anya nke ọma. Mana ọtụtụ ndịisi taa anaghị emezị ihe dị etu ahụ; nke ahụ wee bụrụ nnukwu nsogbu na ihe iche aka mgba. 

Ana m ekele ụnụ bụ ndị na-ede ma na-ebipụta asụsụ Igbo taa, na-asị ka Chukwu gọzie ụnụ maka mbọ ụnụ na-agba n'ịkwalite asụsụ Igbo. Jisienụ ike.

Ndeewo.