Ịlụ Nwaanyị n'Ala Igbo: Oge Mbụ Na Oge Ugbua

Mar 27, 2021 - 21:55
 0
Ịlụ Nwaanyị n'Ala Igbo: Oge Mbụ Na Oge Ugbua

Izunna Okafor dere edemede a

Ịlụ nwaanyị bụ ọzọ dịịrị okokporo niile, ma bụrụkwa a na-agụrụ akwụ nwanne ya a na-éghè.
Ọ bụ ụkwa ruo oge ya, ọ daa. Ịlụ nwaanyị bụ okokporo rie ọ lakpuo n'ihi na ọ bụ òkè ọhà, onye kere nke ya, ọ lakpuo be ya, ga ribe.

N'ihi na a sị na ihe mmadụ ruru ogo ya wee rie, ọ bụghị akpịrị, ịlụ nwaanyị bụ omenala zuru ụwa ọnụ. Ya bụ, ndị mba ọbụla n'ụwa gbaa gburugburu na-eme emume ịlụ nwaanyị n'ihi na ọ bụrụ na 
 ịkpọ ngwere emeghị ihe o jiri bụrụ ịkpọ ngwere, ụmụaka ewere ya mee anụ, ma n'ọkọchị ma n'udu mmiri. Ọ bụ nke a mere okokporo ọbụla ji agbakarị ala ka ọ kpọta nke ya, maka na ọ na-abụ onye mee ihe ibe ya mere, o nwee ọnụ okwu n'ebe ibe ya nọ.

Ịlụ nwaanyị so n'otu n'ime njirimara ndi Igbo, ma n'oge gboo ma n'oge ugbua. Ọbụnadị akwụkwọ nsọ kwàdòrò ya, nke pụtara na Chineke onwe ya ghọtara ihe nwoke na-agabiga, ma ghọtakwa ebe o ji nwamkpi; o wee sị na ọ dịghị mma ka nwoke nọrọ naanị ya, maka na ahụ abụghị ogwodo nkụ.

Ịlụ nwaanyị nwèrè usoro n'ala Igbo, ma bụrụkwa nke uche dị n'ime ya, n'ihi na ọ bụghị ebe ọbụla onye siri pụta, ọ gaa maburu nwaanyị, bido lụba ya ozigbo. N'ala Igbo n'oge gboo, ịlụ nwaanyị na-abụ nnọọ nke a kwadobere nke ọma, ma bụrụkwa nke a na-ehi asaa naabọ n'anya were eme, n'ihi na onye banye, ọ banyesịgokwa. Nke ahụ bụ maka na ndi gboo ahụ ghọtara na alụm di na nwunye abụghị egwu apa ụtaba n'aka were àgbá. Ọ bụghịkwa 'suru ụtara ka m buru ofe m'. Ọ bụ ya mere na n'oge ahụ, a naghị enwekebe ọgu na mgba, esemokwu, ịgba alụkwaghị m, na ọtụtụ nsogbu ndị ọzọ dị iche iche a na-ahụtakarị ugbua n'ebe ịlụ di na nwunye dị.

Na mgbe gboo ahụ, nwoke na-achọ ịlụ nwaanyị nwegasịrị ụfọdụ ihe ọ ga-eme tupuu ọ kpọrọ ya bụ ogoli nwaanyị labaa. Mana ugbua, ihe ndị ahụ adagharịala n'ihi na ụmụokorobịa ọgbara ọhụrụ a na-atazị ya bụ mkpụrụ osisi na-achaghị acha ma na-erizịkwa ofe ahụ na-eghèghị èghè.

Nwaokorobịa ọbụla chọrọ ịlụ nwaanyị n'oge ahụ ga-ebugodi ụzọ tozuo òkè n'ihe e ji mmadụ eme ma bụrụkwa onye anọghị nkịtị, ka agụụ wee ghara igbu nwaanyị ọhụụ ahụ maka na ọ bịara ije di. A sịkwa na onye rie ede n'egheghị eghe, ọ gbaa ya na-ebeghị ebe. 

Nwata nwoke ahụ, mgbe ọ hụrụ nwaagbọghọ chara acha ọ chọrọ ịlụ, ọ gaghị agwagodi ya ihe ọbụla, kama ọ ga-ebu ụzọ na-enyocha ma na-amụ ya dịka akwụkwọ. Ọ bụrụ na ọ chọpụta na ọ dị nnọọ mma idebe n'ụlọ, ọ ga-aga gwatụrụ nne na nna nke ya banyere ya bụ ụtụ chara acha ọ hụrụ n'ụzọ, ma kọwatakwara ha onye ọ bụ.

Oge ahụ, nne na nna ya ga-amalite inyocha na ịjụ ase banyere ya bụ nwata nwaanyị na ndị ezinụlọ ha, iji mara etu ha si eme, ịmara ma ndị si na ezinụlọ ahụ pụta ọ na-ezu ohi, ma ha ọ na-enwe nsogbu ụbụrụ, ma ha a na-akwụ ụdọ (maọbụ ma o nwere onye si n'ebe ahụ kwụgoro ụdọ n'oge gara aga); ma ha ọ na-amụnwukwa nwa, ọ kachasị nwa nwoke, ma ndi be ha ọ na-akpa nsi maọbụ na-ata amoosu, ma o nwere ihe ọjọọ ndị ọzọ dị iche iche e jiri mara ha, ọbụnadị ruo n'okwuru anọ gara aga (past four generations).

Nke kachasị nke bụ na ha ga-enyochaa ma jụọ ase miri emi, iji mara na onye si n'ezinaụlọ ha ọ pụkwara ịlụ onye si n'ezinụlọ nke nwaanyị, ka o nwere ihe jikọrọ ha ọnụ dịka otu ọbara. Nke a bụ ka e wee gbochie nsogbu ụdị ọbụla ịdapụtara n'ọdịnihu maka na ọbara  esika. Ọ bụkwa ajụghị ajụ e rie na-ebute arịaghị arịa anwụọ.

Mgbe ha gadụchaara ihe ndị a, mechaa nnyocha niile ahụ wee ha na ụzọ gara, ha ga-ejikere buru ihe dịka otu ite nkwụ wee gaa be ndị nke nwaanyị iji mee ka ha mara na o nwere akwụ chara acha ebe ahụ ha chọrọ ịkpàrà. Nke ahụ ka a kpọrọ ije 'amara mụ ụzọ ọgọ' maọbụ 'ịkụ aka n'ụzọ' (dịka ndị si akpọ ya).
Nke ahụ pụtara na ha bịara ịkụ aka n'ụzọ ọgọ iji mara ma a ga-emeghekwara ha; na ụzọ à gakwàrà.

N'aka nke ha, ndị be nke nwaanyị nabatachaa ha na ije ha bịara, ha ga-emekwa otu ụdị nnyocha ahụ ndị be nke nwoke mere ma jụkwa ase niile ahụ ha jụrụ banyere ha n'ihi na a sị na ozu nwaada adaghị n'isi nna ọ daa n'isi ọkpara. 

Ọ bụrụ na ha mechaa ihe ndị ahụ wee chọpụta na ọ ga-adaba, ha ga-eme ka nwa ha nwaanyị mara otu ihe siri gbata kwụrụ, iji wee mara ọnụ mmiri okwu ya banyere nke ahụ, maka na ọ bụ ya bụ ọnụ na-elo ụtara ma ụdị okpoko ọ chọrọ. Na ngwụcha ihe niile, ọ bụrụ na nke nwaanyị kweta, ọ ga-aga ilele ala na be nke nwoke iji mara ka ọnọdụ siri gbatakwụrụ n'ezinaụlọ ya. Nke ahụ bụkwa oge ya na nke nwoke ga-eji wee mụọ onwe ha iji mara ma ọ ga-adabakwa, na o rekwara ka a gọrọ. Ya na nke nwoke agaghịkwa abakwuru onwe ha chaa chaa, ma ya fọdụzie ije n'ọnwa maọbụ ịpịa ọkụ.

N'ikpeazụ, ụbọchị nwaanyị bịara ilele ala ga-ala, ọ ga-ebu ite mmanya n'isi wee ga kọọrọ ndi be ya ihe ọ hụrụ banyere ya bụ ezinaụlọ, wee gwa ha ma ọ ga-adaba maọbụ na ọ gaghị adaba. Ọ bụrụ na nke nwaanyị kweta, a ga-ezighachizịrị ndị be nke nwoke ozi ka ha bịa, e wee kànyezie ụbọchị a ga-abịa ime ego (maọbụ ime ego na ịgba nkwụ). E wee zibezịe ndị ikwu na ibe.

Ọ bụzị mgbe e mekọrọchaara ihe ndị a niile ka nke nwaanyị ga akwakọrọzị ngwongwo ya lakuru nke nwoke n'ihi na ọ kwụọla ụgwọ isi ya ma nyekwa ndị be ya ihe ha na-eri, nke gosiri na o chizuona ma tozukwa òkè ịkpọrọ ya dịka nwunye. Ọ bụkwa ịhụnanya na ezi akparamagwa ka a na-agbaso were alụ nwaanyị n'oge ahụ, bụ nke na-emezị ka alụm di na nwunye na-atọ ụtọ; ezinụlọ ebirikwa n'udo. 

Nke ahụ wee bụrụ nrụtụaka n'etu ndi Igbo si emebụ ya n'oge ahụ.

Mana ugbu a, ihe adagharịchaala n'ihi na ndị torobịa anyị na-atazịkwa n'achaghị acha, ma na-erizịkwa n'ajụghị ase. 

Ugbua bụzị oge ọ ga-abụ a chọọ ịlụ nwaanyị, nwaokorobịa chọrọ ịlụ nwaanyị ga-achọgodi ka o buru ụzọ detụ ya ire, rie ihe nne ya riwọrọ ya maọbụ bịnyegodi nke nwaanyị ogbe afọ tupuu a mara na a ga-alụ ma ọ bụ na a gaghị alụ.

Ọ bụzịkwa ebe onye siri kote nwaanyị ugbua, o koro ya lakpute sị na ọ na-alụ ya alụ; ebe ụfọdụ na-anọ ebe ha hụrụ nwata nwaanyị anya mbụ gbado ya ma kwe ya nkwà ịlụ ya ozigbo ozịgbo; nke nwaanyị ekwetekwa zigbo ozịgbo ahụ n'egbughị oge, maọbụ n'ajughịkwa èsè.

Onweghizịkwa ihe dịka ilele ala, ma ọ bụ inyocha mara ka ezinaụlọ ndị ahụ dị maka na ọ na-eghuzị ụmụ okoro na ụmụ agbọghọbịa ugbu a eghu, ọkachasị ọ bụrụ ebe ego dị. Ha wee chezọọ uru ara baara ikwe maka na ọ na-adịzị onye ọbụla n'ọkụ n'ọkụ, nke tinyegoro ọtụtụ ezinụlọ n'ọnọdụ ọjọọ dị iche iche, tisàá ọtụtụ ezinụlọ taa, ebe ọtụtụ bụzịkwa a lụọ ta, a laa echi maka na ha bụ ọkụkọ ajụwughị ajụwu tupuu ribe. Ụfọdụ esikwana n'ụzọ dị otu ahụ dinaa ma ọ bụ lụọ otu ọbara ha na-maghị ama; nke bụ nnukwu arụ kwọ nwa n'ala Igbo, ma sokwa n'ihe ji ọtụtụ ezinaụlọ agaghị n'ihu maọbụ amụtaghị nwa, maọbụ nwa nwoke, ruo n'ụbọchị taa. 

Ọtụtụ mmadụ atụfugokwa ndụ ha n'ihi ajọ nwoke maọbụ ajọ nwaanyị ha lụtara maka na ha ajụghị ase, maọbụ mee ihe ndị ọzọ kwesiri ekwesi tupu ha lụba. Ọtụtụ na-ejikwa maka ego maọbụ mma ihu wee lụọ onye ha ekwesighị ịlụ, bụzị nke mere na e bighị ebi n'ọtụtụ ezinụlọ taa, maka na ngwngwa ego gwụrụ, nsogbu abata.
E nwekwara ọtụtụ ihe égwù na ajọ ọnọdụ ndị ọzọ dị iche iche na-esikwa n'ihe ndị ahụ apụta.

Ndị Igbo be anyị, na nchịkọta, mmechakọrọ ihe ndị a niile bụ ka anyị laghachinụ azụ n'ụzọ na usoro ahụ uche dị n'ime ya, bụ etu e sibụ alụ nwaanyị n'ala Igbo n'oge gboo, ka anyị wee gbanahị ọdachi, nsogbu na ihe égwù ndị ọzọ niile na-esi ime ya apụta, bụ nke jupụtakwara n'ọtụtụ ezinaụlọ taa; ka udo wee dịrị anyị. 

Nke a ga-emekwa ka anyị nọọ ogologo ndụ ruo ahọ ole Chineke debeere anyị, maka na mmadụ ịlụta ajọ nwaanyị maọbụ ajọ nwoke na-eweta ọnwụ erughị eru maka na ọ bụkwa n'otu ebe ahụ ọkụkọ na-akpa nri ka a na-ebute ozu ya. Ajụghị ajụ erie bụkwa ya na-ebute arịaghị arịa anwụọ. Ọzọ, nwaanyị bụkwa ahịa akpa, onye enyochaghị enyocha wee goro laa, ihe ọ tọghetere, ya na chi ya.

Ya bụ, ka anyị hie asaa naabọ n'anya, maka na onye banye, ọ banyesịgo. Ọ na-abụ agadi nwaanyị kachie ntị wụọ aja, e bute ozu ya n'ofè nke ọzọ.
Omenala Igbo ga-adịrịrị

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484