Donation Report for November 2017: We asked for $100 but got $25

Izunna Okafor joined the Igbo Radio in August 2017. He is based in Awka and is covering the whole of Anambra State for us. On average, Izunna writes 25 articles per month in Igbo language, which you can enjoy on this website. We asked for 10 people to donate $10 USD each so that we could give Izunna at least $100 honourarium every month for him to remain excited and continue to write these articles that promote the Igbo language.

We are reporting that we received $25 from one person in November. We really appreciate your support. You know that you are making a difference, preserving our own Igbo language, the language that our ancestors gave to us.

Please SUPPORT US IN DECEMBER by clicking on the image below!

Igbo Radio Donation

Sign Up for Newsletter

 

Ndi Govano na-achi ala Igbo amaghi ihe a koro?

Ị sị ka ụmụ-Igbo welata Businesị ụmụ-Igbo n’ala Igbo? Ezị-okwu ka ị kwuru,HO! HA! Maka na Igbo tụrụ ilu sị na a na-ama mma site n’ụlọ were pụwa n’ama.

Kedu nke ụmụ-Igbo bụ ọnwa na-etiri Lagọs, na Abụja, ma itiri na-agba n’ala Igbo? Ọlụ adịghị karịkwaa ịtọrọ mmadụ. Miri adịghị karịkwaa miri idoro. Ụlọ-ọgwụ adịghị karịa dogonyaro maka ọgwụ ịba. Ụlọ-akwụkwọ adịghị karịa ebe a na-apụzị kwa ọrịrị were egbu oge, maka na ndị sị na ha gbajiri chọkụ, amaghị aha ha ede cha cha!

Onye gịna ya kwụrụ achụ mmụọ sịzị kwa na gị bụzịkwa mmụọ a na-achụ. Nwa-nne na nwa-nne apụghịzịkwa ịnyụkọ amịrị ọnụ maka na ego abatala.

Igbo bụ Igbo tụrụ ilu sị na enwe abụghị anụ ma eteghị ya n’ofe. Nke a na-akọwa na gị na nwa-Igbo ibe gị ga-emekọta ihe ọnụ, mgbe ego batara ọgụ ada.

Ọ bụrụ na ndị Gọvanọ na-achị ala Igbo chọrọ, ha kwesiri ịtụpụta elulo ka Igbo nyụkọọ amịrị ọnụ ka ọ gbọ ụfụfụ n’ala Igbo,kpọm kwem! Onye a jụrụ anaghị ajụ onwe ya.

Kedụzịkwanụ ka ọkụ sizị nyụa n’ala Igbo dumu? Na Legọs na Abụja, a na-enwe ụgbọ-ala, ụgbọ-elu, ọkụ, ụlọ ogwụ.

Ọ bụzị na ndị Gọvanọ nile na-achị ala Igbo amaghị ihe a kọrọ?

AKUKO SI MPAGHARA AMERIKA

AKUKO SI MPAGHARA YUROPE NA ESHIA

Igbo Language Resources

Support Us

Contact Us

4800 Gordon Road
Grasslands PO Box 40026
Regina, SK, Canada S4W 0L3
Tel:+1.306.581.4493
Email: igbo@igboradio.com

Copyright © 2009 - 2018 Igbo Radio & The Foundation for the Promotion of Igbo Language and Culture. All Rights Reserved! Designed & Powered by SITE FATHER.

Please Support Igbo Radio Today

CLICK HERE TO DONATE

AFFORDABLE WEB HOSTING

nigeria 2840922 640

Transfer Today & Save

50%

Click Here