Donald Trump na Kim Jong-un agazịghị enwe nzukọ na Sịngapọ...

Onye isi ala mba Amerịka na-ewegharazị onwe ya na nzukọ ahụ Ọ dịburu na mbụ kwete n’etiti ya na onye isi ala mba Nọt Korịa. Taa bụ Tọzdee, abalị 24, nke ọnwa Mee, Trump Trump degara Kim Jong-un akwụkwọ sị na ya achọzịghị isonye na nzukọ ahụ n’ihi akparama agwa yana ụdịrị ajọ okwu si Kim Jong-un n’ọnụ apụta kemgbe abalị ole n’ole.

Guchaa Akuko a Guoo Akuko Ndi Ozo

Sineto Ike Ekweremmadu na-akpo ndi Nigeria oku

Osote onye isi oche Sineti ala Nigeria, Ike Ekweremadu, akpọkuona ndị Nigeria niile ka onye ọ bụna kwuo uche ya ugbu a ndị Sineti malitere ịtụgharị uche maka idegharị, ma ọ bụ ịhazi akwụkwọ iwu ala Nigeria.

Sineto Ekweremadu kpọrọ oku a site n’ozi onye ndụmọdụ ya, bụ mazị Uche Anichukwu. Mazị Anichukwu ziputere ozi ahụ n’ama saiba ndị otu kọmitị (ngalaba Sineti) na-ahụ maka ihazi na ịdegharị akwụkwọ iwu: www. constitutionreviewng.org.

Ndị kọmiti ahụ na-akpọ ndị ala Nigeria ka oke na ngwere zitere ha ozi, ma gwakwa ha ihe o chere maka otu a ga-esi degharịa iwu Nigeria ka o were dị mma. Ha weputere ajụjụ ole n’ole ndị mmadụ kwesịrị ịza n’akara ama saịba a: www.publicopinionnigeria.org

Please Support this Project Today

Please consider supporting this project today with any amount. No amount is too small! Help us to continue to host and maintain this website for the promotion of the Igbo language and culture.

Amount:

Advertisement

Connect with us

Akuko Uwa

Donald Trump na Kim Jong-un agazịghị enwe nzukọ na Sịngapọ...

Donald Trump na Kim Jong-un agazịghị enwe nzukọ na Sịngapọ...

Onye isi ala mba Amerịka na-ewegharazị onwe ya na nzukọ ahụ Ọ dịburu na mbụ kwete n’etiti ya na onye isi ala mba Nọt Korịa. Taa bụ Tọzdee, abalị 24, nke ọnwa Mee, Trump Trump degara Kim Jong-un akwụkwọ sị na ya achọzịghị isonye na nzukọ ahụ n’ihi akparama agwa yana ụdịrị ajọ okwu si Kim Jong-un n’ọnụ apụta kemgbe abalị ole n’ole.

Gọọmenti Anambra Ga-Amachi Ndị Ọkada Ịgba n'Awka na n'Ọnisha n'Ọnwa Jụlaị...

Gọọmenti Anambra Ga-Amachi Ndị Ọkada Ịgba n'Awka na n'Ọnisha n'Ọnwa Jụlaị...

Gọọmenti steeti Anambra ekpebiela ịmàchi ndị ji ọgba tum tum akpa ego, bụ ndị a maara dịka ndị Ọkada ka ha gharazie ịgba n'Awka na n'Ọnịsha malite n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Julaị ahọ a bụ 2018.

Ọhaneze Ndị Igbo Akpọọla Òkù Ka A Hazigharịa Ọnọdụ Ala Nigeria...

Ọhaneze Ndị Igbo Akpọọla Òkù Ka A Hazigharịa Ọnọdụ Ala Nigeria...

Ndị igbo n'ụwa gbaa gburugburu na ndị ọzọ ọnọdụ ala Nigeria na-echu ụra akpọọla oku ka e nwògharịa ma hazigharịa ọnọdụ ala ahụ iji nye ya ezi ọdịnihu, kwalite ezi mmekọrịta mmadụ na ibe ya, ọnọdụ udo, ọnọdụ mmepe, nakwa ọnọdụ egbe bere ugo bere.

Ndị Ụka Katọliki Emeela Ngagharị Udo Megide Igbusi Ndị Ụka...

Ndị Ụka Katọliki Emeela Ngagharị Udo Megide Igbusi Ndị Ụka...

Okporo ụzọ dị iche iche n'Awka bụ isi obodo steeti Anambra jupụtara nnọọ gbịm n'ọnụ ụbọchị Tuzdee dịka ndị ụka katọliki n'ala Nigeria gbaa gburugburu mere ngagharị udo, megide igbusi ndị ụka bụ nke na-arịzị ibe ya elu na mpaghara ebe dị iche iche n'ala anyị ugbu a.

Anyị Ga-Aghasà Nzukọ Igbo Ahụ A Ga-Eme n'Awka - IPOB...

Anyị Ga-Aghasà Nzukọ Igbo Ahụ A Ga-Eme n'Awka - IPOB...

Ndị otu 'Indigenous People of Biafra' (IPOB) añụọla iyi ma foro ntutu taa, sị na ha ga-aghasà ọgbakọ izugbe ndị Igbo ahụ a na-aga-achịkọba n'abalị iri abụọ na otu nke ọnwa Mee ahọ a, bụ nke ga ewere ọnọdụ n'Awka, ma kwuo na o nweghị ihe megidere ka nzukọ ahụ nwee isi, beere sọ ma eluigwe ọdara ụbọchị ahụ.

M Gaghị Esi APC Ma Ọ Bụ PDP Wee Zọọ Ọkwa Onyeisi Ala - Mọghalụ...

M Gaghị Esi APC Ma Ọ Bụ PDP Wee Zọọ Ọkwa Onyeisi Ala - Mọghalụ...

Osote onyeisi ụlọ ọba ego ala Nigeria n'oge gara aga, bụ Ọkammụta Kingsley Mọghalụ ekwuola hoohaa na ya agaghị esi n'otu ndọrọ ndọrọ APC ma ọ bụ PDP wee pụta ịzọ ọkwa onyeisi Nigeria na nhọpụta izugbe ahụ a ga-eme n'ahọ na-abịa abịa.

AKUKO SI MPAGHARA AMERIKA

AKUKO SI MPAGHARA YUROPE NA ESHIA

Igbo Language Resources

Contact Us

4800 Gordon Road
Grasslands PO Box 40026
Regina, SK, Canada S4W 0L3
Tel:+1.306.581.4493
Email: igbo@igboradio.com

Copyright © 2009 - 2018 Igbo Radio & The Foundation for the Promotion of Igbo Language and Culture. All Rights Reserved! Designed & Powered by SITE FATHER.