Nchịkọta Akụkọ Pụrụ Iche: Oke Ụkọ Ego Akụchatụọna Otu PDP n'Imo

Ezigbo ụkọ ego dị egwu ebiela otu pati PDP, ngalaba nke steeti Imo aka. Nke a bụ nke e mere ka a mara site n'ọnụ onye ode akwụkwọ otu ahụ na steeti ahụ, bụ maazị Nzeh Emeana, n'ozi ọ gwara ndi mgbasa ozi n'Owerri bụ isi obodo steeti ahụ.

Nzeh Emeana kwukwara na ya bụ ọgba aghara dapụtara n'ime otu ahụ so n'ihe butere ya bụ ajọ ọnọdụ ụkọ ego, ma sịkwa na ha ji ndi ọrụ ha ụgwọ ọnwa asaa, nke mezịrị na ha malitere izilaga ụfọdụ n'ime a n'aka efu. Ọ sị na ha chọrọ opekata mpe, ego dị Nde Naịra asatọ na ọkara ($8.5m), kwa ọnwa ọbụla, iji wee leruo isi ụlọ ọrụ otu ahụ na steeti ahụ anya.

Connect with us

Sign Up for Newsletter

 

AKUKO SI MPAGHARA AMERIKA

AKUKO SI MPAGHARA YUROPE NA ESHIA

Igbo Language Resources

Support Us

Contact Us

4800 Gordon Road
Grasslands PO Box 40026
Regina, SK, Canada S4W 0L3
Tel:+1.306.581.4493
Email: igbo@igboradio.com

Copyright © 2009 - 2018 Igbo Radio & The Foundation for the Promotion of Igbo Language and Culture. All Rights Reserved! Designed & Powered by SITE FATHER.