Ụlọ Ụka St. Philips Ọzụbụlụ Amalitekwana Ịka Ụka Ka Otu Izu Gachara

Ka ọ gachara nnọọ otu izu ụka kpọmkwem ndi omekoome a maghị ndi ha bụ jiri wakpo ma were egbe sụọ ndi mmadụ kọtọkọtọ n'ụlọ ụka St. Philips (Katọlik) nke Ọzụbụlụ, nke dị n'okpuru ọchịchị Ekwusigo na steeti Anambra; ife ofufe nro malitekwara nnọọ na ya bụ ụlọ n'ụzọ pụrụ iche.

Ọ bụ ihe doro ewu na ọkụkọ anya na mkpamkpa dị egwu kpara na ya bụ ụlọ ụka n'abalị isii nke ọnwa Ọgọọstụ a, oge ndi obi kpọnkụ wụbatara ebe a na-efe ofufe nro dị nsọ nke elekere isii na ọkara ọnụ ụtụtụ wee were egbe dulaa ọtụtụ mmadụ mmụọ, bụ ndi nọ ebe ahụ akara chi ha ụka, ebe ọtụtụ natakwara mmerụ ahụ dị iche iche. Mana n'ihi na a sị na agaghị eji mgbagbu ghara ọgụ, ndi na-efe ofufe na ya bụ ụlọ nsọ jiri nnọọ obi ọcha na obi ịchọ ala eze Chineke wee pụtakwa n'ụbọchị ụka gara aga ma sonye n'ofufe e fere n'ụlọ ụka ahụ iji wee kpeere Chi ha ma chọkwa ala eze eluigwe.

Na mbụ n'ụbọchị Satọdee ka onye Boshọọpụ nke ụka Katọlik na Dịọsisi Nnewi bụ Bishọọpụ Hillary Ọdịlị Okeke gara gọzie ma dookwa ya bụ ụlọ ụka nsọ, n'iji kwadobe maka ya bụ aja maasị. Ọbụnadị ndi uwe ojii ka a hụkwara n'ogige ụlọ ụka hụ ka ha na-arụ ọrụ ha iji hụ na e nwere ezi nchekwaṅtọrọ atọ na gburugburu ahụ niile.

N'okwu Chukwu ya na ofufe nro ahụ, bụ nle malitere n'elekere iteghete nke ụtụtụ ma bụrụkwa nke hibere isi n'ịnọgidesi ike na Chukwu'; onye ụkọchukwu Mọnsaịnọ Patrick Ezebata dụrụ ma gbakwa ndi niile bịara ụka ahụ ume ka ha nwee ntụkwasị obi n'ebe Chineke nọ, nọgidesie ike na Ya ma gharakwa ikwe ka ihe ọbụla kewapụ ha pụọ n'ebe Chineke nọ. O kwuru na onye nọgidesiri ike ruo ọgwgwụ ihe niile na a ga-azọpụta ya. Onye ụkọchukwu nke ya bụ ụlọ ụka kelere ndi sonyere na ofufe ahụ ma gwa ha ka ha jigide okwukwe ha n'ihi na Chukwu Nna adịghị arahụ ụra.

Otu ọ dị, ndi Dịọsisi nke ụka Katọlik na Nnewi anọrọnarịị n'izu ụka gara aga wee gbaa n'anwụ aha mmadụ iri na atọ ndi ahụ e gburu n'ihe ọdachi ahụ, nakwa ndi nwetara mmerụ ahụ dị iche iche. Ndi nke tụfuru ndụ ha gụnyere:

1. Maazị Cyprian Ikegwụọnụ
2. Maazị Hyacinth Ọramadike
3. Oriakụ Cecilia Ewin
4. Oriakụ Eunice Akanigbo
5. Oriakụ Rose Okoye
6. Oriakụ Añụlịka Ọbụnadike
7. Oriakụ Uchenna Ọbụnadike
8. Obere Nwaada Anthonia Ụfọndụ
9. Obere Nwaada Ọlụchukwu Uhelu
10. Obere Nwaada Christiana Igbeja
11. Oriakụ Udeze Pauline
12. Oriakụ Victoria Ụzọkwe, na
13. Oriakụ Florence Nweke.

Ndi nke natara mmerụ ahụ gụnyere:

1. Ikegwuọnụ Caroline
2. Nwakile Anthonia
3. Okoye Ọdịnaka
4. Okoye Patricia
5. Isaac Chinedu
6. Ọramadike Chinagọrọm
7. Ọramadike Chinecherem
8. Udegbunam Chidịmma
9. Ndulue Samuel
10. Udegbunam Ọbiageli
11. Ugochi Obiajụlụ
12. Chukwueloka Chineze
13. Ọramadike Chiọma
14. Azụka Basil
15. Ọramadike Chiamaka
16. Uchechukwu Chukwueloka
17. Nwanya Ngọzị
18. Ngwuta Chinemelụm
19. Asọmba Chukwudum
20. Nnudule Leonard
21. Mụọmah Michael, na
22. Ọramadike Favour.

Mmadụ ndi a bụkwa di nọ n'ụlọ ọgwụ dị iche iche anara ọgwụgwọ, ebe ụfọdụ n'ime ha bụkwa ndi natachagoro ọgwụgwọ ma laakwa na be ha dị iche iche.

Dịọsiisi ahụ sitekwara n'ozi ahụ wee mee ka ọhaneze mara na ha emegheena akara ụlọ ọba ego maka ịtụkọta ego ọrụ obi ebere iji nyere ndi ahụ ọnọdụ ahụ metụtara aka, ma na-arịọzịkwa ndi mmadụ nakwa otu dị iche iche ndi o metụrụ n'obi na ndi ọrụ obi ebere na-amasị, ka ha doo tụnye ihe ọbụla siri ha n'obi pụta iji wee kwado ya bụ enyemaka.

Akara ụlọ ọba ego ahụ bụ:

Aha: CDN OZUBULU CASUALTIES CHARITY FUND
Ụlọ Ọba Egọ: U.B.A.
Akara: 1020519192

Bishọọpụ Odịlị Okeke, bụ onye zipuru ya bụ ozi mekwara ka a mara na a ga-ahazi ego ọbụla a tụtara banyere nke ahụ nke ọma ma jirikwa ya rụọ ọrụ e jiri tụkọba ya.

N'otu izu ahụ kwa ka osote aka na-achị anyị, bụ Maazị Yemi Osibanjọ nọrọ wee ziga ndi nnọchite anya na steeti ahụ, n'aha gọọmenti etiti, iji wee bugara ụmụ afọ steeti ahụ ozi nkasi obi nke gọọmenti banyere ihe anya mmiri ahụ. Ndi nnọchite anya mmadụ ise ahụ nke onye nọ n'isi ya bụ Maazị Chris Ngige bụ onye minista na-ahụ maka ọrụ n'ala anyị ma bụrụkwa nwa afọ steeti ahụ, bụ ndi a nabatara nke ọma, ha na ozi ha, site n'aka osote gọvanọ steeti ahụ bụ Dọkịnta Nkem Okeke n'aha gọvanọ Willie Obianọ. Ndi ahụ kwezịkwara nkwa na gọọmenti etiti ga-akwụ ụgwọ ụlọ ọgwụ onye ọbụla ọnọdụ ya ekweghị ngwọta na Naịjiria, bụ onye e bupuru na mba ofesi maka inye ya ọgwụgwọ.

Info
ProductDemo | 10 USD

Izunna Okafor is a lover and promoter of the Igbo language and culture. He joined the Igbo Radio in August 2017. We want to be able to give him at least $100 every month so that he can remain excited about this cause of saving our language and continue to write articles for the Igbo Radio and remain a part of our team of volunteer fighters who work hard to save Igbo language. Please donate whatever amount you can.

Register .NG Domain Name

Website Plaza Nigeria

Please Support this Project Today

Please consider supporting this project today with any amount. No amount is too small! Help us to continue to host and maintain this website for the promotion of the Igbo language and culture.

Amount

Advertisement

Connect with us

Akuko Uwa

Ọkụ Agbarikọọla Otu Ụlọ n'Ụmụokpu Awka...

Ọkụ Agbarikọọla Otu Ụlọ n'Ụmụokpu Awka...

Mkpu akwa dàrànnọọ n'obodo Ụmụokpu dị n'ikpuru ọchịchị Awka South na steeti Anambra, dịka ọkụ ọgbụgba dabìdòrò ma gbaa otu nnukwu ụlọ pịa-pịa. Ya bụ oke ọkụ bụ nke a na-enyo ènyò na ọ bụ nsogbu sitere n'ọkụ latiriiki kpàtàrà ya, ma bụrụkwa nke gbara ya bụ ụlọ gwòògwòò, tinyere ọtụtụ ngwongwo dị n'me ya, nke gbúru nde kwùru nde Naịra.

Ụlọ Ọrụ FRCN Enyela Obianọ Nkwanye Ùgwù Maka Nkwado Mgbasa Ozi...

Ụlọ Ọrụ FRCN Enyela Obianọ Nkwanye Ùgwù Maka Nkwado Mgbasa Ozi...

Ụlọ ọrụ 'Federal Radio Corporation of Nigeria (FRCN)' a mààrà dịka 'Radio Nigeria' enyela aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ nkwanye ùgwù maka ezi mmasị, ezi mmekọrịta na agbam mbọ ya n'ịkwalite ọrụ mgbasa ozi.

Ndị Ezinatọr Emee Ngagharị Iwe Banyere Óké Mbugharị Nhọpụta Ọchịchị...

Ndị Ezinatọr Emee Ngagharị Iwe Banyere Óké Mbugharị Nhọpụta Ọchịchị...

Igbo sị na ọ na-abụ nwata chọkarịa ara, e nyeghị ya, o mee ụñàrà ka ọha obodo wee tinye ọnụ.

E Guzobe Anyachebelu Dịka Onye Jigodi Ọkwa Ọkaikpe Ukwu Steeti Anambra...

E Guzobe Anyachebelu Dịka Onye Jigodi Ọkwa Ọkaikpe Ukwu Steeti Anambra...

Aka na-achị steeti Anambra, bụ gọvanọ Willie Obianọ nọrọ ụbọchị Wenezdee wee guzobe Ọkaikpe Manasseh Anyachebelu dịka onye ga-ejidegodi ọkwa Ọkaikpe Nkwụmọtọ steeti ahụ ugbua. Mmemme nguzobe ahụ bụ nke weere ọnọdụ n'obi gọọmenti dị n'Awka, ma bụrụkwa nke dọtara ndị isi ọchịchị steeti ahụ na ndị ọzọ e ji okwu ha agba ìzù na ngalaba dị iche iche.

Owerre -Ezukala Emee Emume Ọkụka-Oriri Ji Ọhụụ, Chie Obianọ Echichi...

Owerre -Ezukala Emee Emume Ọkụka-Oriri Ji Ọhụụ, Chie Obianọ Echichi...

Ịma mma nke ọnatarachi na omenala ndị Igbo pụtàrànnọọ ìhè ọzọ nso nso a, dịka ndị obodo Owerre-Ezukala dị n'okpuru ọchịchị Orumba South nas steeti Anambra merùbèrè emume Ọkụka-Oriri Ji Ọhụụ, bụ mmemme iri ji ọhụụ ya kpọmkwèm nke ahọ 2019.

Ọñụ Adaa Dịka A Gbapere Ụlọ Ahụike Ọhụụ n'Ụmụdiọka...

Ọñụ Adaa Dịka A Gbapere Ụlọ Ahụike Ọhụụ n'Ụmụdiọka...

Oke ọñụ dara nnọọ nso-nso a dịka a gbàpèrè ụlọ ahụike ọhụụ n'Ụmụdiọka dị n'okpuru ọchịchị Awka South na steeti Anambra.

AKUKO SI MPAGHARA AMERIKA

AKUKO SI MPAGHARA YUROPE NA ESHIA

Igbo Language Resources

Contact Us

4800 Gordon Road
Grasslands PO Box 40026
Regina, SK, Canada S4W 0L3
Tel:+1.306.581.4493
Email: igbo@igboradio.com

Copyright © 2009 - 2018 Igbo Radio & The Foundation for the Promotion of Igbo Language and Culture. All Rights Reserved! Designed & Powered by SITE FATHER.