Ọ bụ nnukwu oke mmemme ma bụrụkwa ihe oke ọñụ, dịka ndị obodo Ụga niile gbakọtara wee chibe aka na-achị steeti Anambra bụ gọvanọ Willie Obiano echichi dịka "Dike Ifè n'Ụga", site n'aka eze ọdịnala obodo ahụ bụ Igwe Chidi Ezenwugo.
Ya bụ echichi bụ nke e chibere gọvanọ Obianọ na nnukwu mmemme ịgba Ọfala nke mbụ, nke eze ọdịnala Ụga, bụ otu n'ime obodo dị n'okpuru ọchịchị Agụata na steeti ahụ.
Ka ọ na-echibe ya echichi ahụ, Igwe Ezenwugo kwuru na a kọwaaala gọvanọ Obianọ dịka gọvanọ kacha mma n'ala Naịjiria, n'ihi ọrụ mmepe ya na ọtụtụ ihe dị iche iche o meputagoro na ngalaba niile nke ọnọdụ akụnụba steeti ahụ.
Igwe kwuru na ndị Ụga ga na-aga n'ihu n'ịkwado gọvanọ Obianọ na ebumnobi ya niile, ọ kachsị dịka o siri metụta ịzọ ọchịchị ya nke ugboro abụọ.
Na nzaghachi, gọvanọ Obianọ kelere ndị Uga n'ihi oke nkwanye ugwu ahụ, ma sị na nke ahụ ga-abụ ihe mwulite mmụọ nyere ya, iji gaa n'ihu n'ọrụ ọma o ji n'aka, ma na-atụtpụtasịkwa atụmatụ mmepe ga na-akwalite ezi ọnọdụ ụmụ mmadụ n'obodo ahụ. Ọ sị na ọkụ okporo ụzọ ahụ otinyesiri n'obodo dị iche iche n'okpuru ọchịchị ahụ bụ nke a ga-anọ n'oge adịghị anya wee gbapee, bụkwa nke ga-enye aka n'ụzọ pụrụ iche n'ịkwalite ezi ọnọdụ obibi ndụ na nchekwa nke ụmụafọ obodo ahụ.
Gọvanọ Obianọ kọwara na obodo ọbụla eritela uru n'amụma ahụ nke ọchịchị ya weputara, bụ inye obodo ọbụla nde Naịra iri abụọ ka ha wee họrọ ma rụọ ihe dị ha mkpa, ma rịọkwazie ha ka ha kwado ọchịchị ya iji wee gaa n'ihu n'ọrụ mmepe dị iche iche o ji n'aka na steeti ahụ.
N'okwu nke ya, ọkaokwu ụlọ ọgbakọ omebeiwu steeti ahụ bụ Ọkaiwu Rita Madụagwụ, bụkwa onye natara echichi ebe ahụ dịka "Ugodịọramma" gosiputara afọ ojuju na obi ụtọ ya nye ndị obodo ahụ maka icheta ya site na nkwanye ugwu ahụ pụrụ iche nakwa nkwado ha na-enye ọchịchị gọvanọ Obianọ.
O kwere ha nkwa na ụlọ ọgbakọ omebeiwu steeti ahụ ga-aga n'ihu n'ịkwalite ezi ọchịchị na steeti ahụ, ma chetekwara ha na site n'ezi ọchịchị steeti n'okpuru otu pati APGA, na e nweela mmepe tọrọ atụ na ngalaba niile nke steeti ahụ, na n'ihi nke a, na o kwesiri ka onye ọbụla tụnyere otu pati ahụ na nhọpụta ọkwa gọvanọ ahụ na-abịa n'ihu na steeti ahụ.
Ọ dụzịkwara ndị ahụ ka onye ọbụla nuputa n'igwe ma tụọ akwụkwọ ụbọchị ahụ a ga-eme nhọpụta, bụ abalị iri na asatọ nke ọnwa Nọvemba.