E Tòóla Gọọmenti Anambra Maka Ezi Ọrụ Ya n'Ịkwàlite Ahụike

Ahu Ike
Typography
  • Smaller Small Medium Big Bigger
  • Default Helvetica Segoe Georgia Times

Igbo sị na ọ na-abụ e tòó onye gburu ewu, ọ hụ ehi, o gbuo. N'ịgbasò nke a, gọọmenti steeti Anambra nọrọ nso-nso a wee nweta òtùto site n'aka òtù ọrụ ahụike gọọmenti etiti a kpọrọ 'National Primary Health Care Development Agency' maka ezi ọrụ ya na ịgba dị iche-iche ọ na-eti na ngalaba ahụike steeti ahụ.

Ya bụ òtùto bụ nke e kwuwàpụtàrà sit n'ọnụ ndị òtu a oge ísi ha gara kpọtụrụ aka na-achị ya bụ steeti, bụ gọvanọ Willie Obianọ n'obi gọọmenti dị n'Awka, bụ isi obodo steeti ahụ. Njem mkpọtụrụ ahụ bụ nke weere oge ndị òtù ọrụ ahụ bùrù ụzọ gagharịa n'ụfọdụ ụlọ ahụike dị iche-iche na ya bụ steeti, iji mara na ọrụ ọ na-agakwa otu o sìrì kwesi ekwesi n'imezùpùta ebumnobi ọchịchị onyeisiala bụ Buharị dịka o siri metụta ịkwàlìtè ngalaba ahụike bụ ịgbà n'ala Nigeria.

N'okwu ya banyere ije ahụ ha bịara, onye duru ndị ahụ wee bịa, ma bụrụkwa onyeisi òtù ọrụ ahụike 'National Primary Health Care Development Agency' bụ Dọkịta Faisal Shuaibu gosipùtàrà afọ ojuju ya bànyere ihe ha hụtagàsịrị n'ụlọ ahụike dị iche-iche ha gàrà na ya, mà tòkwa ya bụ ọchịchị gọvanọ maka ịrụgharị ụlọ ahụike dị iri isii na atọ dị na steeti ahụ na ịkwajúmesi akụrụngwa dị iche-iche na ha, ọbụnadị dịka ọ dụrụ ya ka o mezuokwa otu ihe ahụ n'ebe ndị ọzọ fọrọ afọ, iji hụ na a kwàlitere ezi ọnọdụ ahụike kawanye mma na ya bụ steeti.

Ọ gakwara n'ihu kwuwàpụ gbowàm na gọọmenti steeti ahụ mere nke ọma n'isonye n'amụma ịgba ọgwụ mgbochi ọrịa dị iche-iche a na-abàgide n'ala Nigeria gbaa gbùrùgburu, ma dụọ ya ka ọ gaa n'ihu itinyekwu ego n'ịkwàlite ngalaba ọrụ ahụike ya bụ steeti n'ihi oke mkpa ọ dị na oke urù nke ahụ bàrà nye ahụike ụmụ mmadụ.

Na ntụnye nke ya, onyeisi otu jikọtara ndị ode akwụkwọ ụlọ ọrụ dị iche iche n'ala anyị, bụ "Forum of Executive Secretaries", bụ Dọkịta Usman-Adis Mọhammed kọwapụtara na ịkwàliite ezi ọnọdụ ahụike nye ụmụafọ ala Nigeria so n'otu ihe na-echu onyeisi àlà Buharị ụra, ma kpọkùkwazie ndị ọrụ ahụike na steeti ahụ na n'ala Nigeria n'izugbe ka onye ọbụla n'ime ha tinye uchu n'ọrụ ma na-arụsikwa ọrụ ike iji hụ na e mere ka ụmụ mmadụ nwee ezi ọnọdụ ahụike zuru oke oge niile.

Na nzaghachi, gọvanọ Willie Obianọ, nke onye nọchirì anya ya bụ òsòtè ya, Dọkịta Nkem Okeke bunyere gọọmenti etiti ụkpa ekele maka ụzọ dị iche-iche o sìgòrò gbata ọsọ enyemaka na steeti ahụ, ma kwuputazie ezi njikere ọchịchị ya dị ịhụ na steeti ahụ gara n'ihu steeti kacha eme nke ọma na ngalaba ahụ n'ala anyị.

Ọ rịọkwazịrị gọọmenti etiti ka ọ gaa n'ihu ịkwàdò ọrụ ahụike na steeti ahụ, ọbụnadị dịka o kwèrè nkwà na ọ ga-aga n'ihu ịhụ na ọ kwụrụ ego nke o kètàrà ịkwụ n'atụmatụ ọrụ ahụike ọbụla ha bàgidere site na njilọ aka ọnụ, maka oke mkpà ngalaba ahụike dị na ya bụ steeti.

A nọkwàzịrị na ya bụ njèm wee nye steeti Anambra onyinye nkwanye ùgwù maka ezi ọrụ ha n'ịkwalite ọnọdụ ahụike ọhaneze.