Top Stories

N'ịgba mbọ ya iji were memilaa ọgwụ adịgboroja n'ala anyị maka na ọ bụrụ na agbaghị ụzọ owere mgba, ọ naghị echi, onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka nhazi nri na ọgwụ n'ala anyị a na-akpọ NAFDAC na mkpirisi, Ọkammụta Mojisola Adeyeye, ekwuola na ụlọọrụ ahụ emebiela ọgwụ adịgboroja karịrị ijeri naira atọ n'afọ abụọ gara aga. Adeyeye mere ka amata nkea na mkparịtaụka ya na ndị nta akụkọ n'Abuja ụbọchị Mọndee.

Igbo sị na ọ na-adị mma onye chezọọ, e chetere ya, ma sịkwa na onye a gwara agwa, ma ọ nụghị anụ; o mee emee ọ hụ ahụ. A kpọkuola ndị nwere ebe obibi na ọdụ ahịa na gbururgburu ebe dị iche iche n'Awka bụ isi obodo steeti Anambra ka ha kọchasịa ọwà mmiri dị na mpaghara ha, sụchasịakwa ahịhịa toro eto ma debekwa gburugburu ha ọcha; maọbụ ha chee aka hụ ka gọọmenti kpọchiri ebe ahụ.

Oke ọñụ dara nnọọ nso-nso a dịka a gbàpèrè ụlọ ahụike ọhụụ n'Ụmụdiọka dị n'okpuru ọchịchị Awka South na steeti Anambra.

Onyeisiala Muhammadu Buhari na Nnukwu Onyeisi Ụkochukwu nke Canterbury, the Most Reverend Justin Welby, e nweela nzukọ na London. Mmadụ abụọ zukọtara na Obi Lambeth, dị na London, ụbọchị ụka.

Dịka ndị ụka Anglikan na Dayọsis nke Aguata na Anambra Steeti chịkọtara mmemme ọgbakọ nzukọ nke ụlọ ụka niile dị na dayọsis ahụ sonyere n'ime ya, agwala ndị otu Kraịst na ike dị n'aha Jizọs, dịka ọ dị n'isi okwu ọgbakọ ahụ pụrụ ime ihe ọ bụla.

Obodo bụ nnọ sọ añụrị, dịka a nọrọ nso nso a wee gbapee ụlọ ụka ọhụụ Emmanuel Anglican Church dị n'Onitsha, nke steeti Anambra. Ya bụ mmemme mgbape bụ nke e mere site n'aka bishọọpụ ụka Angịlikan na dayọsiisi Niger, bụ Rt. Rev. Owen Nwokolo, ma bụrụkwa nke isiokwu ya bụ "Dedication of Prestigious Sanctuary” nke pụtara 'Mgbape Ụlọ Nsọ Dị Ukwuu'.

Sign up via our free email subscription service to receive notifications when new information is available.
Advertisement