A rịọla gọọmenti ala Naịjirịa ka O leba anya na nsogbu enweghị ndị ọrụ ahụ ike na-eji nnwa

Ahu Ike
Typography
  • Smaller Small Medium Big Bigger
  • Default Helvetica Segoe Georgia Times

A rịọla gọọmenti ala Naịjirịa ka O leba anya na nsogbu enweghị ndị ọrụ ahụ ike na-eji nnwa n’ụlọ ọgwụ ndị ahụ gọọmenti nwe, iji si etu ahụ kwalite ọnọdụ ahụ ike.

Otu jikọrọ ndị ọrụ ahụ ike na-eji nnwa n’ala Naịjirịa kpọrọ oku a n’ụbọchị Tuzdee n’ọgbakọ ha nwere n’Oshogbo, isi obodo Steeti Osun.

N’okwu ya, nye isi izugbe otu ahụ n’ala Naịjirịa, bụ Maazị Abdrafiu Adeniji, kwuru na ihe ndị ịma aka dị n’agụm akwụkwọ ndị na-eji nnwa n’ala Naịjirịa. O kwuru na ọ dị mkpa ka gọọmenti tinye akọrọngwa nakwa ịhe eji arụ ọrụ na ngalaba ahụ ike.

Maazị Adeniji, kwuru na nke a ga-eme ka ndị ọrụ ahụ ike rụọ ọrụ ha nke ọma.

O kwuru n’ọnọdụ ebunighị ndị otu ahụ n’ọkwa, iyi egwu ibutu ha n’ọrụ nakwa iwepu ịhe n’ego A na-akwụ ha bụ nnukwu ihe iche aka mgba ndị ọrụ ahụ ike na-eji nnwa na-ahụta.

O kwuru na gọọmenti ga-elebarịrị anya n’ ihe iche aka mgba niile a iji mee ka ngalaba ahụ ike kwụrụ chịm.