Ọñụ Adaa Dịka A Gbapere Ụlọ Ahụike Ọhụụ n'Ụmụdiọka

Ahu Ike
Typography
  • Smaller Small Medium Big Bigger
  • Default Helvetica Segoe Georgia Times

Oke ọñụ dara nnọọ nso-nso a dịka a gbàpèrè ụlọ ahụike ọhụụ n'Ụmụdiọka dị n'okpuru ọchịchị Awka South na steeti Anambra.

N'okwu ya na mmemme ahụ, kọmishọna na-ahụ maka ahụike na steeti ahụ, bụ Dọkịta Vincent Ọkpala kèlèrè ndị Ụmụdiọka maka ijikọ aka ọnụ wee rụọ ya bụ ụlọ ahụike, bụkwa nke o kwùrù na a kwanyela akụrụngwa ruru paseenti iri asaa na ya, ma kpọkuokwa ndị ọzọ e ji okwu ha agba izu na ndị selitere isi n'obodo dị iche-iche na steeti ahụ ka ha ñòmie nke ahụ, site n'ijikọ aka n'ọnụ, ha na gọọmenti.

Ọ kọwàrà ụlọ ahụike ntà dịka nke dị oke mkpa maka ịgbasawanye ezi ahụ ike n'ala Nigeria, ma kọwaa na gọọmenti steeti ahụ na-agbasi mbọ iji mee ka ngalaba na ọnọdụ ahụike ụmụafọ steeti ahụ kawanye mma, ma dụkwazie ọhanaeze ka ha tinye aka n'imé ka nke ahụ pụta ìhè site n'ịgba mbọ hụ na ngalaba ahụ na-agawanye n'ihu n'ime-ime obodo ha dị iche-iche.

Na ntụnye nke ya, ode akwụkwọ ukwu nke ụlọ ọrụ 'Anambra State Health Insurance Agency', bụ Dọkịta Simeon Onyemaechi, bụkwa nwa afọ obodo ahụ kwuru na e debànyego aha ụlọ ahụike ahụ, bụ ' Umudioka Primary Health Care Centre' dịka otù n'ime ụlọ ahụike a ga-eji wee mezupùta atụmatụ ọrụ ahụike ahụ gọọmenti steeti Anambra ji n'aka, bụ 'Anambra State Health Insurance Scheme' ọbụnadị dịka o kèlèrè ndị obodo ahụ maka ịrụchapụ ụlọ ahụike ahụ.

N'okwu nke ha n'otu n'otu, onyeisi oche nchere oge n'okpuru ọchịchị Awka South, bụ maazị Leo Nwụba na onye enyemaka pụrụ iche nye Gọvanọ Obianọ n'ihe gbasaara ahụike, bụ maazị Okey Nwokike kọwara ya bụ ụlọ ahụike dịka nke magburu onwe ya na nke bịara n'oge ya, ma dụọ ndị Ụmụdiọka ka ha na-agbaga n'ebe ahụ maka ịnata ọgwụgwọ oge ọbụla ha nwèrè nsogbu ahụike, iji nweta ọgwụgwọ ọsọọsọ.