E Nyela Ndị Ntorobịa Ọzụzụ, Kesaarala Ha Ihe E Ji Agba Ọgwụ Ahụhụ n'Anamba

Ahu Ike
Typography
  • Smaller Small Medium Big Bigger
  • Default Helvetica Segoe Georgia Times

E nyela ndị ntorobịa ọrụ ugbo nọ na steeti Anambra ọzụzụ na nkuzi pụrụ iche n'ọrụ ugbo, ma kesaara ha ihe e ji agba ọgwụ ahụhụ na-atagbusi ihe a kọrọ n'ubi, dịka ihe nkwàdo.

Inye ọzụzụ na nkwàdo ahụ bụ nke e mere n'okpuru atụmatụ 'IFAD Value Chain Development Program' ma bụrụkwa nke weere ọnọdụ n'isi ụlọ ọrụ kwàlite ọrụ ugbo steeti, bụ 'Agricultural Development Program' dị n'Awka.

N'okwu ya na mmemme ọzụzụ ahụ dịka ọ na-ekesara ndị ntorobịa ihe ndị ahụ, onye nhazi nke atụmatụ ahụ na steeti Anambra, bụ maazị Nnamdị Agwụncha mere ka a mara na ha enyela ha ọzụzụ kwesiri ekwesi, tupu inye nkwàdo ahụ. Ọ kpọkuru ndị ahụ ka ha jikọka onwe ha ọnụ dịka òtù n'okpuru ọchịchị ha dị iche iche ma nyere ndị ọrụ ugbo ndị ọzọ aka n'ịgbara ha ọgwụ n'ubi megide ihe a kọrọ n'ugbo, iji hụ na ha adịghị eme nke ahụ n'onwe ha, n'ihi ihe ọdachi dị iche iche na-esi na ya adapụta.

O mere ka a mara na nke ahụ bụ nke mbụ a na-eme ụdị ihe dị otu ahụ n'ime steeti niile nọ n'okpuru atụmatụ 'Value Chain Development Program', ma kwuo na onye ọbụla n'ime ndị ahụ ritara ya bụ urù ga-akwụ naanị paseenti iri atọ n'ime ọnụ ego ihe o ritara, ebe ndị otu ahụ ga-akwụtọpụzị paseenti iri asaa fọrọ afọ.

N'okwu nke ya, onye ji ọkwa 'The state Agric Production Officer' n'okpuru atụmatụ ahụ, bụ maazị Emmanuel Chukwukwelu dụrụ ndị ahụ ritara ya bụ uru ka ha were ohere ahụ baara onwe ha, gburugburu ha na obodo ha uru, ma gbakwa mbọ kuziere ndị ọzọ, ebe ha onwe ha bụ ndị e nyegoro ọzụzụ zuru oke banyere otu e si eme ihe ndị ahụ nke ọma na-ezuteghị ọdachi.

Ndị ntorobịa ahụ bụ ndị dị otu narị n'ọnụ ọgụgụ, ma bụrụkwa ndị sitere okpuru ọchịchị ise na steeti ahụ, nke pụtara na e wetara mmadụ iri abụọ n'okpuru ọchịchị ọbụla. Ihe e kesaara ha gụnyere ọgwụ ahụhụ na-ata ma na-ebibìsi ihe akọrọ n'ubì, ihe e ji agba ya bụ ọgwụ, akwa ọrụ, na ọtụtụ ihe ndị ọzọ, nke mgbakọta ọnụ ego ya karịrị nde Naịra abụọ.