Ụlọọrụ NAFDAC Emebiela Ọgwụ Adịgboroja Karịrị Ijeri Naira Atọ

Ahu Ike
Typography
  • Smaller Small Medium Big Bigger
  • Default Helvetica Segoe Georgia Times

N'ịgba mbọ ya iji were memilaa ọgwụ adịgboroja n'ala anyị maka na ọ bụrụ na agbaghị ụzọ owere mgba, ọ naghị echi, onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka nhazi nri na ọgwụ n'ala anyị a na-akpọ NAFDAC na mkpirisi, Ọkammụta Mojisola Adeyeye, ekwuola na ụlọọrụ ahụ emebiela ọgwụ adịgboroja karịrị ijeri naira atọ n'afọ abụọ gara aga. Adeyeye mere ka amata nkea na mkparịtaụka ya na ndị nta akụkọ n'Abuja ụbọchị Mọndee.

O kwuru, "Ụlọọrụ ahụ chọpụtara ụlọ ngwaahịa nke dị n'ebe ndị mmadụ bi n'ụzọ Igboamaeze, Awada Obosi, Onitsha, Anambra Steeti, bụ ebe edebere ọgwụ adịgboroja dị iche iche. Katọn ruru otu narị na iteghete nke ọtụtụ ngwa ahịa dịka ọgwụ Lincocin, Artesunate, Augumentin, Panadol Extra, Cafcol 250mg capsules, Busoopan, Laridox, mkpụrụọgwụ Postinor 2, Coartem 20/120, Lofnac (Diclofenac Sodium) na Aldomet bụzi nke ụlọọrụ ahụ kpọchikọrọ."

"Anyi gara n'ihu jidekwa otu nnukwu ụgbọala bu ọgwụ adịgboroja dị iche iche aga Kano. Ngwa ahịa ahụ ruru nde naira isii n'ọnụ ahịa ya. Ụlọọrụ ahụ emebikwala ọtụtụ ọgwụ adịgboroja na ihe ndị eji arụ ọrụ n'ụlọọgwụ nke adịgboroja ijere naira atọ na nde narị abụọ (n'ime afọ abụọ gara aga). Site na nrụkọ ọrụ ọnụ ụlọọrụ ahụ na nke na-ahụ maka ị tụbata ahịa n'ala anyị (Nigeria Customs Service), ha ebidola mmebi ngwaahịa ndị ahụ akpọchiri maka erughị ka achọrọ, ọkachasị Tramadol."

Adeyeye nọrọziri oge ahụ were kpọkue Gọọmenti Etiti ka ha leba anya n'ụgwọ ọnwa nke ndị ọrụ NAFDAC, n'ihi ihe ka n'ọnụ ọgụgụ n'ime ha enweghị ike ịkwụ ụgwọ ụlọ maka ezi ebe obibi na Lagos. O kwuru na otu nwa nwaanyị nke otu onye onye ọrụ ụlọọrụ ahụ bụ onye ndị ahụ ụlọọrụ NAFDAC mebiri ngwaahịa adịgborija ha tọrọ; mana ọ bụ onye e mechara hapụ. Ọ rịọkwara ka ewulite ọnọdụ ego ịkwado ọrụ ụlọọrụ ahụ ka ha were nwee ike rụọ ọrụ ka o siri kwesi ma zọpụtakwa ndụ site n'ịchụ ọgwụ na akọrọngwa adịgboroja ọsọ ụkwụ eru ala n'ala anyị.