Oke ọñụ dara nnọọ n'Ogidi na n'Eziowele dị n'okpuru ọchịchị Idemili North nke steeti Anambra dịka, dịka a gbàpere ebe nlekọta ahụike, bụ nke e dozighàrịrị site n'aka otu nnọrọ onwe a kpọrọ 'The Challenge Initiative' (TCI).

A malitena idebanye aha ndị ntorobịa sitere n'okpuru ọchịchị iri abụọ na otu nke steeti Anambra bụ ndị enweghị ọrụ, n'akwụkwọ. Aka na-achị steeti ahụ bụ gọvanọ willie Obianọ mere ka a mara nke a n'ofufe nru pụrụ iche a chịkọbara n'ụlọ ụka St. Patrick dị n'Ọka bụ isi obodo steeti ahụ iji merube mmemme icheta ọgbụgba ahọ iri ise na asaa nke ala Naịjiria.

A rịọla gọọmenti ala Naịjirịa ka O leba anya na nsogbu enweghị ndị ọrụ ahụ ike na-eji nnwa n’ụlọ ọgwụ ndị ahụ gọọmenti nwe, iji si etu ahụ kwalite ọnọdụ ahụ ike.

Otu jikọrọ ndị ọrụ ahụ ike na-eji nnwa n’ala Naịjirịa kpọrọ oku a n’ụbọchị Tuzdee n’ọgbakọ ha nwere n’Oshogbo, isi obodo Steeti Osun.

Gọọmenti ala Naịjiria ekwuputego mkpebi ya maka ịkwụsị kpam kpam akparamagwa ọ bụna na-ewete mmegbu ma ọ bụ ịkpa oke megide ụmụ nwanyị. A na-agba mbọ ịhụ n’iwu na usoro ọchịchị nke ala Naịjirịa gbadoro ụkwụ n’iwu na usoro ọchịchị nke mba ụwa gbasara ọnọdụ ụmụ nwanyị.

More Articles ...

Page 4 of 5