Igbo sị na ọ na-aka mma ibu ụzọ maba ọkwà mmiri tupu òzùzò ya, maka na agha a kàrà àkà adịghị eri ngọwọrọ. Ka ọ dị taa, gọọmenti steeti Anambra eburula amụmà inye nkuzi ya wee gaa n'Ọdekpe dị n'okpuru ọchịchị Ọgbaru, iji kọwaara ma nyekwa ọzụzụ banyere ihe dị iche-iche ha kwèsìrì ịma na ime na nkwadobe maka ìjú mmiri nke a na-atụ anya na ọ ghaghị ịgba na mpaghara ahụ n'ahọ a dịka ọ na-eme na mbụ.

Opekampe mmadụ dị puku ise si na obodo iri ise na asatọ ebe ụlọọrụ OML nọ ga-erita erere ọnọdụ ahụike n'efu nke ụlọọrụ ahụ si mba France were bịa bụ, Total Exploration and Production Nigeria Limited.

N'ịgbasò mkpebì ya imemìla ịkpọ ma ọ bụ ịtụ mgbere ọgwụ ike n'ala anyị, ụlọ ọrụ ahụ a mà àmá n'ibu agha megide ọgwụ ike, bụ ụlọ ọrụ 'National Drugs Law Enforcement Agency' (NDLEA, n'aha mkpìrìsì) anwụchikọọla mmadụ iri abụọ a na-enyo ènyò na ha na-atụ mgbere ọgwụ ike na steeti Anambra.

More Articles ...

Page 3 of 5