Ndị Fada Nọ n'Ime-Ime Obodo Nwere Ike Ịlụ Nwaanyị -- Pope Francis

Okpukpere Chi
Typography
  • Smaller Small Medium Big Bigger
  • Default Helvetica Segoe Georgia Times

Dịka a sị na ọnọdụ dịba àñaa, e nyebere onye nke ya kacha njọ aka, onyeisi ụka Katọliiki n'ụwa gbaa gburugburu, bụ 'Pope' Francis emeela ka a mara na Ụkọchukwu Oseburụwa (Fada) ndị nọ n'ime-ime obodo nwezịrị ike ịlụ nwaanyị n'ọnọdọ dị añaa, iji nyere ndụ ha na ọrụ ha aka.

Pope mere ka a mara nke a n'okwu ọ gwàrà ndị nta akụkọ ụbọchị Mọnde n'ime ụgbọelu oge ọ na-eme njem ga-ewe ya abalị isii ịgaru Panama bụ nke dị na mpaghara Central America n'ebe nkèwa Ohimiri Caribbean na Ogbu Mmiri Pacific.

O kwùrù na ya agaghị anọgide tie aka n'ikè sị ka ndị Ụkọchukwu Oseburụwa (Fada) niile lụbazie nwaanyị n'ihi na nke ahụ ga-anọ ọdụ ka mmadụ ịgbakụta chi ya azụ ma nye mkpebi nke aka ya, dịka ọ ghọtara na a sị onye buru chi ya ụzọ, ọ gbagbuo onwe ya n'ọsọ.

Otu ọ dị, o kwuru na o nwere ndị ọnọdụ ha dị iche, ọ kachasị n'ime-ime obodo dị iche iche dịka Amazọn na ụfọdụ mpaghara Pacific dịpụgara adịpụga, bụ ebe adịghịdị enwete ndị Fada ga-aka ụka ma ya fọdụzie ime ihe ndị ọzọ a na-eme n'ụlọ ụka.

O kwuzịrị na n'ihi nke a na n'ọnọdụ dị otu ahụ, na e nwere ike ichibe ndị okenye n'obodo ahụ ma ọ bụ ndị ọzọ nwere mmasị ma tozuo oke ịbà n'ọrụ ụka Fada na-agbanyeghị na onye ahụ ọlụgo nwaanyị ma ọ bụ na ọ lụbeghị; ka o wee nwee ike ịrụ ọrụ dịka onye Ụkọchukwu Oseburụwa n'obodo ahụ na n'okirikiri ebe ahụ niile.