Buhari, Nnukwu Onyeisi Ụkọchukwu nke Canterbury Hụrụ

Okpukpere Chi
Typography
  • Smaller Small Medium Big Bigger
  • Default Helvetica Segoe Georgia Times

Onyeisiala Muhammadu Buhari na Nnukwu Onyeisi Ụkochukwu nke Canterbury, the Most Reverend Justin Welby, e nweela nzukọ na London. Mmadụ abụọ zukọtara na Obi Lambeth, dị na London, ụbọchị ụka.

O nweghị ihe gbara ọkpụrụkpụ pụtara ihe gbasara nzukọ ha na abụghị nanị onyonyo nke sitere n'ụlọ Onyeisiala pụta.

Anyị ga-amata na Onyeisiala bụ onye nke hapụrụ Naijiria kamgbe mkpụrụ ụbọchị iri abụọ na asatọ nke ọnwa Ọkụtoba dịka o pụrụ nje m ụzọ abụọ. O buru ụzọ gaa Saudi Arabia, ebe ọ nọ maka ọgbakọ nzukọ Future Investment Initiative Forum, ma were site n'ebe ahụ gawa njem nke abụọ nke bụ nke ya onwe ya na mba UK n'abalị abụọ nke ọnwa Nọvemba.

Onyeisiala bụ onye a na-atụ anya ma ọ ga-abata na abalị iri na asaa nke ọnwa Nọvemba.