A Dụọla Ndị Ọrụ Ugbo n'Anambra Ka Ha Jìkọta Onwe Ha n'Otù

Afrika
Typography
  • Smaller Small Medium Big Bigger
  • Default Helvetica Segoe Georgia Times

Dịka a sị na ọ na-abụ a nyụkọọ mamịrị ọnụ, ọ gbọọ ụfụfụ; a kpọkuola ma dụọ ndị na-arụ ọrụ ugbo na steeti Anambra ka ha jìkọta onwe ha n'òtù ọrụ, dịka ọrụ ugbo dị iche-iche ha na-arụ sìrì dị, iji kwàlite ihe a na-akọpùta n'ugbo ma mekwa ka nri bụrụ gbàànyụụ na steetì ahụ.

 

Ọ bụ kọmishọna na-ahụ maka ahịa, azụmahịa na ikewàpụta akụnụba na steeti ahụ, bụ maazị Christian Madụbuko kpọrọ oku a ma nye ya bụ ndụmọdụ n'okwu ya n'Awka na mmemme imerùbè ụbọchị òtù ọrụ na mba ụwa, bụ 'International Cooperatives Day' nke ahọ 2019, bụ nke weere ọnọdụ na steeti ahụ n'ogige Alex Ekwueme.

IMG 20190709 WA0004

Ọ kpọpụtasịrị uru dị iche-iche dị n'ijikọ aka ọnụ dịka òtù ọrụ, nke gụnyere na ọ ga-eme ka ha nwee ótù obì ma na-emekọ ihe ọnụ, mee ka ọ dịrị ha mfe inweta ma ọ bụ irita ihe ọbụla n'aka gọọmenti, nye aka n'ikewàpụta ohèrè ọrụ, tinyekwuoro na ọ ga-enye aka n'ụzọ pụtara ìhè n'ịkwàlite ọnọdụ akụnụba steeti Anambra ahụ na ime ka ya bụ steeti bụrụ eji ama àtụ n'ihe gbasaara ịkọpụta erimeri n'ala Nigeria gbaa gbùrùgbúrù.

O kwupùtàrà njikere gọọmenti steeti ahụ dị inye ndị ahụ nkwàdo zuru òkè, ma kpọkuo ha ka ha ka ha na-asọpụrụ isi ụlọ ọrụ na-elekọta ha anya, ma na-emekwa ihe dị iche-iche ha na-eme n'ụzọ iwu kwàdòrò.

N'okwu nke ya, onyeisi òtù ọrụ na steeti ahụ, bụ oriakụ Nwabugo Okonkwọ mere ka a mara na ọ bụ isi ọchịchị òtù ọrụ ọbụla ga-ekpebi ma òtù ọrụ ọbụla ga-akwụdo ma ọ bụ na ọ gaghị akwụdo, site n'otu ha si achịkwa ya. O tòrò ndị òtù ọrụ dị na steeti ahụ ugbua maka ezi ọrụ ha na ịgbasi mbọ ike ha, ma dụọ ha ka jide kà ha jì, ọ kachasị na ntụnye ha na nkwàdo pụrụ ichè ha na-enye n'ịkwàlite ọganihu na ọnọdụ akụnụba nke ya bụ steeti.

N'iji mee ka ụbọchị ahụ zaa aha a kpọrọ ya, kọmishọna Madụbuko nọrọ na mmemme ahụ wee gagharịa ma leruo anya n'ebe ndị òtù ọrụ dị iche-iche n'okpuru ọchịchị iri na otu e nwere na steeti ahụ nwèrè ọnọdụ n'ogìgè ahụ ụbọchị ahụ, ya na ihe dị iche-iche ha kọpụtàrà n'ugbo.

Isi okwu mmemme ahụ nke ahọ a bụ 'Òtù Ọrụ Maka Ọrụ Dị Mma', nke pụtara ma a tụgharịa ya na bekee "Co-operatives for Decent Work."