Nwanyị onye Naịjiria eturula ugo mmụta mgbakọ na mwepụ na Sautu Afrịka

Otu nwanyị onye ala Naịjiria na-agụ akwụkwọ n’ogo ọka mmụta abụrụla onye a na-eṅomi eṅomi maka agụm akwụkwọ mgbakọ na mwepụ na mba Sautu Afrịka.

Ọkammụta Oghenetega Ighedo nke ala Naịjiria eturula ugo dịka nwanyị izizi nwetere nzere ọka mmụta PhD n’agụmagụ mgbakọ na mwepụ. O nwetere nzere a na mahadum UNISA, bụ University of South Afrika, n’olu bekee.

Mgbe ọ kwara ndị nta akụkọ okwu, Ọkammụta Oghenetega Ighedo nke mahadum Sautu Afrịka, kwuru si n’ihe mere n’ụmụ nwanyị anaghị enwe mmasị igụ ihe dịka mgbakọ na mwepu bụ na omenaala anaghị enye ha nkwado kwesịrị ekwesị.

Mgbe Ọkammụta Oghenetega Ighedo malitere ịgụ akwụkwọ na Sautu Afrịka, e nweghị onye gwara ya na-enwebeghị nwanyị onye ojii gụrụ mgbakọ na nwepu na mahadum ahụ. Nanị ugbu a ọ gụchara ka e meziri ka ọ mata na yanwa bụ nwanyị onye ojii nke mbụ nwetere nzere ọkammụta na mahadum ahụ.

www.igboschool.org

Connect with us

Sign Up for Newsletter

 

AKUKO SI MPAGHARA AMERIKA

AKUKO SI MPAGHARA YUROPE NA ESHIA

Igbo Language Resources

Support Us

Contact Us

4800 Gordon Road
Grasslands PO Box 40026
Regina, SK, Canada S4W 0L3
Tel:+1.306.581.4493
Email: igbo@igboradio.com

Copyright © 2009 - 2018 Igbo Radio & The Foundation for the Promotion of Igbo Language and Culture. All Rights Reserved! Designed & Powered by SITE FATHER.