Donation Report for September 2017

TRANSPARENCY REPORT: "We asked for $100 but got $0"

Ndi Igbo, udo diri unu!

Izunna Okafor joined the Igbo Radio in August 2017. He is based in Awka and is covering the whole of Anambra State for us. On average, Izunna writes 25 articles per month in Igbo language, which you can enjoy on this website. We reached out to Ndi Igbo and asked 10 people to donate $10 USD each so that we could give Izunna at least $100 honourarium every month for him to remain excited and continue to write these articles that promote the Igbo language.

We are reporting that we received $0 and gave Izunna nothing at all last month.

But Izunna continues to write because he too knows that it is not about the money. It is about knowing that he is making a difference, trying to preserve his own Igbo language, the language that our ancestors gave to us.

Please SUPPORT US IN OCTOBER by clicking on the image to the right!

Obianọ Eturuna Ugo Dịka Onye Ga-Eji Aha Otu APGA Wee Zọọ Ọkwa Gọvanọ

Aka na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obianọ eturuna ugo dịka onye ga-eji aha otu pati APGA wee zọọ ọkwa gọvanọ na steeti ahụ, bụ nke a ga-eme na abalị iri na asatọ nkd ọnwa Nọvemba afọ a.

Ya bụ nturu ugo bụ onwetere na nhọpụta praịma nke otu pati ahụ, bụ nke weere ọnọdụ ụbọchị Tuuzdee n'Ọka mmụta Dọra Akunyili Women Develpment Centre Awka, bụ isi obodo steeti ahụ.

Ọ bụ eziokwu na ọ bụ naanị Gọvanọ Ọbianọ gbara akwụkwọ maka iji aha otu pati ahụ wee zọọ ya bụ ọkwa, mana e meere naanị ya nhọpụta nke praịma dịka o siri dị n'iwu ma bụrụkwa ihe kwesiri maka onye ọbụla ga-eji aha otu pati ọbụla wee zọ ọkwa.

Mana n'ime nhọpụta ahụ, nke a tụrụ akwụkwọ dị otu puku, iri iteghete na abụọ (1,092 votes), Gọvanọ Obianọ nwetere nkwado dịṅotu puku na iri asaa (1,070 "Yes" votes), iri na otu bụ ndi akwadoghị ya(11 "No" Votes), ebe iri na otu fọrọ afọ bụ ndi atụghị nke ọma (11 Invalid votes). Ọ bụnadị ndi si n'okpuru ọchịchị Ihiala nke steeti ahụ tụnyeere me kwadokwa ya bụ Gọvanọ n'izugbe n'ihi na mmadụ iri isii na ise siri n'okpuru ọchịchị ahụ ahụ wee bịa tụnyechaara ya akwụkwọ ha na-enweghị ngụpụ ọbụla.

Ka ọ na-ekwu okwu n'ọgbakọ ahụ oge a kpọchaara mpụtara ntụlị aka ahụ e mere, onye isi izugbe nke otu pati APGA n'ala anyị n'oge gara aga, bụ maazị Victor Umeh kwuru na nhọpụta praịma ahụ bụ otu n'ime nhọpụta praịma e megoro na steeti ahụ ma sịkwa na ndi bịara ya bụ ọgbakọ bụ nọọ ndi ñụrụ mmiri ara nke ọma ma bụrụkwa ndi chịkọbara onwe ha n'ụzọ pụrụ iche.

Maazị Umeh, bụkwa onye isi otu ịchụ nta nkwado maka ịhọpụtagharị Gọvanọ Willie Obianọ kọwapụtakwara ọhụtụ ọrụ ọma dị iche iche nke ya bụ Gọvanọ rụgoro na steeti ahụ ma gosipụtakwa ezi olile anya o nwere nakwa nkwenyesi ike ya na ọ ga-eturu ugo na ya bụ nhọpụta na-abịa n'ihu.

N'okwu ịnabata nturu ugo ya, Gọvanọ Obianọ kelere ndi otu pati APGA nakwa ụmụ afọ steeti Anambra maka ezi nkwado ha, ma kwuputekwa mkpa ọ dị ịhụ na ọrụ mmepe na-aga n'ihu na steeti ahụ bụ nke nke ga-adịrị wee gaba. Ọ nọkwazịrị n'oge ahụ wee kpọlite maazị Nkem Okeke, bụ osote ya, dịka onye ya na ya ga-esokwa wee gaa n'agba nke ugboro abụọ a.

Ndi ọrụ INEC ndi bịara ileru anya ka ya bụ nhọpụta siri gaa gụnyere: Maazị John Nsofor na Maazị Godfrey Nsofor, bụ ndi sitere Abụja, tinyere Milicent Izuegbu Paul, bụ onye sitere n'ụlọ ọrụ INEC nke dị n'Uli na steeti Anambra.

Ndi ọzọ sonyere na ya bụ mmemme nhọpụta gụnyere: okwupụta okwu nke ụlọ ọgbakọ omebe iwu na steeti Anambra, bụ Oriakụ Rita Madụagwụ, ode akwụkwọ izugbe otu pati APGA n'oge gara ma bụrụkwa onye isi otu hụrụ maka nhọpụta praịma ahụ, bụ Alhaji Sanni Shinkafi; Họnọrebụl Dozie Nwankwọ, Họnọrebụl Gabriel Onyenweife, ndi nnọchite anya sitere na wọd narị atọ na iri abụọ na isii e nwere na steeti anambra, tinnyere ndi ọzọ.

{instantpaypal}action=donate,price=10{/instantpaypal}
Izunna Okafor is a lover and promoter of the Igbo language and culture. He joined the Igbo Radio in August 2017. We want to be able to give him at least $100 every month so that he can remain excited about this cause of saving our language and continue to write articles for the Igbo Radio and remain a part of our team of volunteer fighters who work hard to save Igbo language. Please donate whatever amount you can.

AKUKO SI MPAGHARA AMERIKA

AKUKO SI MPAGHARA YUROPE NA ESHIA

Contact Us

4800 Gordon Road
Grasslands PO Box 40026
Regina, SK, Canada S4W 0L3
Tel:+1.306.581.4493
Email: igbo@igboradio.com

Support Us

Copyright © 2017 Igbo Radio & The Foundation for the Promotion of Igbo Language and Culture. All Rights Reserved! Designed & Powered by WEBSITE PLAZA.