Buharị Ezigara Ndị Sineeti Aha Ndị A Ga-Akpọlite n'Ọkwa Minista

Afrika
Typography
  • Smaller Small Medium Big Bigger
  • Default Helvetica Segoe Georgia Times

Igbo sị na ihe ọ sọkwara sị bùgharịba ozu dike, na ọ ga-erurịrị ílì aka ma e mechaa. N'ịgbasò okwu amamihe a, ya bụ ahà ndị ga-eji ọkwa minista na ngalaba ụlọ ọrụ dịgasị iche-iche nke ala anyị n'ọchịchị àgba nke abụọ nke onyeisi ala bụ Muhammadụ Buharị, bụ nke a tụbàrà anya ya kemgbe ụwa, eruola ndị ụlọ omebe iwu sineeti ala anyị aka.

Ya bụ mkpokọta ahà, nke aha ụmụafọ steeti Anambra abụọ, bụ Maazị Chris Ngige na oriakụ Sharon Ikeazụ dị na ya bụ nke e zitèèrè ndị sineeti ụbọchị Mọnde site n'aka onyeisi ala ka ha wee lebara ya anya, nyòchaa ma nabàta ịkpọlite ndị ahụ n'ọkwa.
Mmadụ iri anọ na atọ sitere na mpaghara ebe dị iche-iche n'ala anyị ka e kwùrù na aha ha dị na ya bụ akwụkwọ, ma bụrụkwa nke a gụpụtagòrò ụbọchị Tuzdee site n'ọnụ onyeisi ndị omebe iwu sineeti bụ maazị Ahmad Lawan n'ihu ndị òtù ya, bụkwa ndị e kwuru na ha ga-ábà n'oge ịnọ ọnọdụ ezumike gá-éwè ọnwa abụọ zuru èzù màlite echi bụ Fraịdee, abalị iri abụọ na isii nke ọnwa Julaị.

N'ime aha iri anọ na atọ ahụ, mmadụ iri na abụọ sóbụrụ onyeisi ala Buharị wee rụọ ọrụ n'oge mbụ dịka minista ka a kpọlitèkwàrà nke ugboro abụọ, ebe ụfọdụ bụ ndị gọvanọ chịbụrụ steeti ha dị iche-iche, tinyere ụfọdụ ndị a ka na-enye nri n'ọnụ n'ihe gbasaara igwù okwe ndọrọ-ndọrọ ọchịchị.

Lee ya bụ aha na ka e si wee kèé ya bụ nkụ ụkwà na steeti na steeti:

Uchechukwu Oga (Abia)
Mohammed Musa Bello (Adamawa)
Godswill Akpabio (Akwa Ibom)
Chris Ngige (Anambra)
Sharon Ikeazu (Anambra)
Adamu Adamu (Bauchi)
Maryam Katagum (Bauchi)
Timi Sylva (Bayelsa)
George Akume (Benue)
Mustapha Baba Shehuri (Borno)
Goddy Agba (Cross Rivers)
Festus Keyamo (Delta)
Ogbonnaya Onu (Ebonyi)
Osagie Enakhire (Edo)
Clement Agba (Edo)
Adeniyi Adebayo (Ekiti)
Geofrey Onyeama (Enugu)
Ali Issa Fantami (Gombe)
Emeka Nwajiuba (Imo)
Suleiman Adamu (Jigawa)
Zainab Ahmed (Kaduna)
Mohammed Mahmoud (Kaduna)
Sabo Nanunu (Kano)
Bashir Salihi Magashi (Kano)
Hadi Sirika (Katsina)
Abubakar Malami (Kebbi)
Ahmadu Tijani (Kogi)
Lai Mohammed (Kwara)
Gbemisola Saraki (Kwara)
Raji Fashola (Lagos)
Nimbe Momora (Lagos)
Muhammed Abdullahi (Nasarawa)
Zubeira Dada (Niger)
Olamilekan Adegbite (Ogun)
Tayo Alasoadura (Ondo)
Rauf Aregbesola (Osun)
Sunday Dare (Oyo)
Pauline Tallen (Plateau)
Rotimi Amaechi (Rivers)
Muhammadu Maigari Dingyadi (Sokoto)
Saleh Mohammed (Taraba)
Abubakar Aliyu (Yobe)
Sadiya Umar Farouk (Zamfara)