A Dụọla Ndị Ụka Ka Ha Na-Ebi Ndụ Ịdị Ọcha, Zèére Ikpasu Chineke Iwe

Afrika
Typography
  • Smaller Small Medium Big Bigger
  • Default Helvetica Segoe Georgia Times

A sị na ọ naghị adị mma onye búrú ọrụ ényí n'isi, o were ọkpà na-abọ mbụzụ, maka na o nweghị úrù anụ mbụzụ ga-abara ya karịrị mpàtà ọrụ enyi o bù n'isi. Nke ahụ wee bụrụ okwu. Ọ bụkwa n'ịgbasò ya bụ okwu ka e jìrì kpọkuo ma dụọ ndị otu Christ ka ha jidesie nzọpụta ha na okwùkwè ha na Chineke ike, mà lechàpụrụ ihe efu nke ụwa ọjọọ a na agụụ nke anụ anya, maka na ihe ọbụla nwèrè ụgwọ so ya.

Ọ bụ bishọọpụ ụka Anglịkan na dayọsiisì Awka, ma bụrụkwa onye a họptàrà ọhụụ dịka Archbishọọpụ nke mpaghara Niger, bụ Bishọọpụ Alexander Ibezim nyèrè ndụmọdụ a n'okwuchukwu ya n'ụlọ ụka 'Saint Michael’s And All Angels Anglican Church' dị n'Ifite Awka, n'ofùfè nrò ịkwọ aka n'isi nà ịkpọbàtá ndị mmadụ n'òtù dị iche-iche.

Bishọọpụ Ibezim, onye gbadoro ụkwụ n'isiokwu nke na-asị "N'ihi Na Mmadụ Niile Emehìèwo" mere ka a mara na a na-atụ anya na onye ọbụla bụ onye nke Chineke ga-abụ onye na-ebi ndụ dị ọcha, onye dị ike n'ekpere na onye dị nsọ wee na-echere ọbịbịa nke onyenweanyị Jesus Christ, ọbụnadị dịka o chètààrà ha na ọnwụ onye mmehie adịghị atọ Chineke ụtọ.

Dịka ọ na-akatọ ibi ndụ ọjọọ dị iche-iche na-ewèta ọnwụ mberede na mbíbì, nke gụnyere ịbà n'otu nzuzo, izu ohi, ịgba akwụnakwụna, tinyere ihe ndị ọzọ dị otu ahụ; nnukwu onye ọzụzụ atụrụ ahụ gàrà n'ihu kpọkuo ndị ahụ a kwọrọ aka n'isi ụbọchị ahụ ka ha bụrụ ezi ndị agha nke Christ, gbakụta ihe ọjọọ azụ ma màlitezie bibe ndụ ezi omume na ndụ izisà oziọma nke Jesus Christ n'eleghị anya n'azụ, maka na nke ahụ ga-edubànye ha na ndụ ebighiebi.

N'okwu ha n'ótuù n'ótù, onyeisi nchụaja nke ụlọụka 'Saint Michael’s And All Angels Anglican Church' dị n'Ifite Awka' bụ Ụkọchukwu Kenechukwu Nwafọr, na ògbò ya nke ụlọụka 'Saint John’s Parish, Ọkpụnọ' bụ Ụkọchukwu Onyekachukwu Egwuọnwụ kwupùtàrà n'eziokwu na ya bụ ọbịbịa nnukwu onye ọzụzụ atụrụ ahụ bịara emepeela anya ọtụtụ ndị mmadụ n'ime ka ha mara ihe a na-atụ anya n'aka ha dịka ndị òtù Christ, ma dụkwazie ndị ahụ natara oriri nsọ ụbọchị ahụ ka ha tinye ihe niile ha mụtàrà n'ọzụzụ ahụ n'ọrụ.

A nọrọ na ya bụ òfùfè nrò wee kpọbàta ihe karịrị mmadụ narị abụọ na sakramenti ịnata oriri nsọ, ma kpọbatakwa imirikiti mmadụ n'òtù ụmụnwaanyị bụ 'Womens' Guild' na òtù ndị nna bụ 'Fathers' Fellowship' nke ụlọ ụka abụọ ahụ.