Ọrụ Okporo Ụzọ Legọs-Ibadan Eroula Pacenti Iri Anọ

Afrika
Typography
  • Smaller Small Medium Big Bigger
  • Default Helvetica Segoe Georgia Times

Ọrụ ahụ nke na-aga n'ihu n'okporo ụzọ Legọs-Ibadan bụ rugoro pacenti iri anọ dịka onyeisi ọrụ etiti, Maazi Adedamola Kuti kwuru.

Kuti gwara ndị ọrụ nta akụkọ na Wednezdee oge o mere nje m nleta n'ụzọ ahụ nke ụlọọrụ, Julius Berger, bụ ndị ji ọrụ okporo ụzọ ahụ iji were hụ na-arụchara ụzọ ahụ ngwa ngwa.
"Dịka ọ dị, anyị arụchala ihe dịka pacenti iri anọ", ka o kwuru.

O kwuru na Gọọmenti Etiti amakpụtala ọkpụrụkpụ ego n'akụkụ iji were hụ n'ego ọrụ ahụ agaghị abụ nsogbu.

Onyeisi ahụ, gosipụtara obi mwute ya gbasara enweghị ndidi nke ndị mmadụ na-aga n'ụzọ ahụ nke ọ kwuru ga-eme ka enwee nsogbu n'ụzọ ahụ.

Dịka o siri kwuo, mmechi ụzọ ahụ nke ahụrụ n'okporo ụzọ ahụ n'ime izuụka gara aga, n'ebe kilomita iri na ise nke amara nke ọma dịka Okporo ụzọ MFM bụ n'ihi enweghị ndidi na nnupụisi.

Kuti kwuru, "Ebe nke a bụ ebe ndị mmadụ kacha agba ma bụrụkwa ebe ọrụ na-aga ugbua. Anyị ghọtara na ọtụtụ ụmụafọ Naijiria na-aga ọrụ ha na azụmahịa ha mana ihe ànyị na-emegide bụ ka ndị mmadụ hapụ ịnya ụgbọala megide iwu okporo ụzọ.

"N'agbanyeghị nke a, ebe a bụ ebe ọrụ na-aga n'ihu, ka mmadụ ghara ịgba ọsọ karịa kilomita otu narị na iri abụọ n'otu awa. Ọ bụrụ na ndị mmadụ na-agba nwayọọ ihe dịka kilomita iri ise, a gaghị enwe nsogbu ọ bụla."

Onyeisi ụlọọrụ ndị ọrụ okporo ụzọ na Ogun State, Maazi Clement Oladele, kwuru na nnupụisi na arọ eji agba n'okporo ụzọ bụ nnukwu nsogbu.