A Dụọla Ndị Na-Achị Ehi n'Okpuru Ọchịchị Anambra East na West Ka Ha Kwápụ

Afrika
Typography
  • Smaller Small Medium Big Bigger
  • Default Helvetica Segoe Georgia Times

Dịka a sị na mbịara mbịara emeghị ka mbịara mbịara, di bi ụlọ emee ka di bi ụlọ, e nyela ndị niile na-achị ehi n'obodo dị iche iche dị n'okpuru ọchịchị Abambra 'East' na Anambra 'West' iwu ka chịkọrọ ehi ha pụọ na mpaghara ahụ ozigbo ozigbo.

Aka na-achị steeti ahụ, bụ gọvanọ Willie Obianọ nyere iwu a n'okpuru ọchịchị abụọ ahụ n'okwu ya na njem ịsị ndị okpuru ọchịchị ahụ 'Daalụ nụ' maka nkwàdo dara ụda ha nyere ya na otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị APGA na nhọpụta ọkwa gọvanọ ahụ e mere na steeti ahụ.

O mere ka a mara na òtu pụrụ iche e hibèrè maka ilebà anya na nsogbo ahụ na-adapụtakarị n'etiti ndị na-achị ehi na ndị ọrụ ugbo na mpaghara ahụ ga-ahụ na e mere nke ahụ n'ụzọ ikpe nkwụmọtọ site n'ịhụ na a kwụgharachiri ndị ọrụ ugbo ahụ ụgwọ maka ihe ha kọrọ n'ubì e bibìsìrì ebibi, ka udo wee chịa.

N'ịgbasò udo na iji hụ na otu ndọrọ ndọrọ APGA nwetara mmeri dara ụda na nhọpụta izugbe ahụ na-abịa n'ihu, Gọvanọ Obianọ nọkwara n'ọgbakọ ahụ wee mághèpù mmachi ahụ a màchìrì mmadụ atọ ndị ụlọ ọgbakọ omebe iwu steeti ahụ n'otu ndọrọ ndọrọ APGA, bụ maazị Harford Oseke, maazị Ikem Ụzọezie na maazị Victor Okoye. Ọ kpọkùzịrị onye ọbụla ka ọ kwàdo ma tụnyere otu ndọrọ ndọrọ ahụ na nhọpụta ahụ na-abịa abịa.

N'akụkụ nke ha, onyeisi oche otu ndọrọ ndọrọ APGA n'ala anyị, bụ Ọzọnkpụ Victor Oye, kọmishọna steeti ahụ na-ahụ maka ọrụ, bụ Maazị Marcel Ifejiọfọr na ògbò ya nke na-ahụ maka ihe gbasaara okpuru ọchịchị na echichi ọdịnala gara n'ihu kpọpụtasịa ihe dị iche iche ọchịchị nọ ugbua na steeti ahụ n'okpuru otu ndọrọ ndọrọ APGA mepụtagoro, ma kwupùta mkpa ọ dị ịtụnyere ndị ji aha otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị ahụ azọ ọkwa dị iche iche na nhọpụta ahụ na-abịa n'ihu.

N'otu aka ahụ, ndịisi oche nchere oge n'okpuru ọchịchị abụọ ahụ, bụ maazị Pius Ifeadị na Maazị Sylvester Okafọr bunyere gọvanọ Obianọ ụkpa ekele maka ọrụ ọma ọ rụgoro, na mgbata ọsọ ọ gbataara ha, ọ kachasị n'oge ahụ iju mmiri wakpòrò ndị mpaghara ahụ, kwuo na nsogbu ndị na-achị ehi na-enye na mpaghara ahụ na-akawanye njọ kwà ụbọchị, ma kwupụtakwa nkwàdo ha nye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị APGA.