Obianọ Akpọọ Òkù Ka A Kwàlite Ịdị n'Otu, Mmekọrịta Obodo Na Ibe Ya

Afrika
Typography
  • Smaller Small Medium Big Bigger
  • Default Helvetica Segoe Georgia Times

Aka na-achị steeti Anambra bụ gọvanọ Willie Obianọ akpọkuola ndị eze ọdịnala obodo dị iche iche na steeti ahụ ka ha na-akwàlite udo ime-ime obodo na mmekọrịta obodo na ibè ya.

Gọvanọ Obianọ kpọrọ òkù a na mmemme ịgba Ọvala nke eze ọdịnala Agụleri bụ Igwe Christopher Idigo, bụ nke weere ọnọdụ nso nso a Ama Igwe Aguleri dị n'okpuru ọchịchị Anambra East nke steeti ahụ. Ọ kọwara udo dịka ihe bara oke uru na mmepe òbodo, ma tòó ya bụ eze ọdịnala maka ezi mbọ pụtara ihè ọ gbagoro iji weta udo tọrọ atọ n'etiti obodo ya na obodo ndị ọzọ dị n'okpuru ọchịchị ahụ.

Ọ gara n'ihu bunye ndị Agụleri ụkpa ekele maka nkwàdo dị iche iche ha na-enye ọchịchị ya, ma kpọkuokwa ha ka ha gaa n'ihu n'inye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị All Progressive Grand Alliance (APGA), ọ kachasị na nhọpụta izugbe ahụ na-akpụdobe n'ala anyị.

Na mbụ n'ozi Ọvala ya, Igwe Idigo kọwara ịgba ọvala dịka nnukwu mmemme pụrụ iche e jiri mara ndị Igbo. N'ihe gbasaara nhọpụta izugbe ala anyị, ọ kwara arịrị otu e si akpàgide ndị Igbo n'ala Nigeria, ma kpọkuo gọọmenti etiti ka ọ gbaa mbọ tinye uchu n'ịrụ okporo ụzọ awara awara ahụ siri Enugu gaa Ọnịtsha.

Ọ katọrọ nsogbu ahụ na-adapụtagasị na mpaghara ebe dị iche iche n'ala anyị, ma dụọ gọọmenti etiti ka ọ mara ihe o mere bànyere nke ahụ iji wee bèlata ya bụ ajọ ọnọdụ.

Ya bụ ịgba Ọvala, nke isiokwu ya bụ "Akụ Eluvego Ụnọ” bụ nke dọtara ọtụtụ ndị dị iche iche e ji okwu ha agba izú na steeti ahụ, ma bụrụkwa ịgba ọvala nke otu narị na iri na iteghete nke obodo Agụleri.