Lawrence Ọnụchukwu Eguzobe Òtù Ọrụ Obi Ebere n'Ụkpọr

Afrika
Typography
  • Smaller Small Medium Big Bigger
  • Default Helvetica Segoe Georgia Times

Oke ọñụ dàrà n'Ụkpọr dị n'okpuru ọchịchị 'Nnewi South' nke steeti Anambra na nso-nso a, dịka otu nwa amadi ọrụ obi ebere na-echu ụra, bụ Maazị Lawrence Ọnụchukwu guzòbèrè ma gbapee òtù ọrụ obi ebere ya, bụ nke ọ kpọrọ 'Law Ọnụchukwu Foundation' bụkwa nke ọ ga-esi na ya wee na-enyere ndị ụwa na-atụ n'ọnụ aka.

Oke mmemme ahụ, bụ nke weere ọnọdụ n'ama egwuregwu 'Ụkpọr Central School' dọtàrà imirikiti ndị selitere isi n'ọrụ gọọmenti n'okpuru ọchịchị ahụ, ndị ndu ụka, ndị ihe na-esiri ike sitere obodo iri mejùpụtara okpuru ọchịchị ahụ, tinyere ụmụakwụkwọ sitere ụlọakwụkwọ praịma isi isii na atọ e nwèrè na 'Nnewi South'.

N'okwu ya na mmemme ahụ, onyeisioche nchere ogè n'okpuru ọchịchị Nnewi South, bụ Maazị Chieloka Okoye kọwara òtù ọrụ obi ebere ahụ dịka nke magburu ònwe ya, ma kwuokwa na nke ahụ ga-enye aka n'ụzọ pụrụ iche ịkwàdo na inyere ndị ụwa na-atụ n'ọnụ aka, iji bèlata ụbịam na gburugburu.

Ka ọ na-ekwupụta na mmadụ ekwesighị ichèrè ruo mgbe o nwèrè nde kwùrú nde Naịra tupuu ọ màlite inyere ndị ọ ka mma aka, Maazị Okoye tòrò Ọnụchukwu maka ịghọta mkpà ọ dị na ọ ga-atụnye ụtụ nke ya n'ịkwàlite ọdịmma gbururgburu na ọnọdụ obibi ndụ ụmụ mmadụ, ma kpọkùkwazie ndị ọzọ ka ha ñòmie ezi akparamagwa dị otu ahụ.

Na mbụ n'ozi nnọọ ya, nwa amadi ahụ bụ isi a hụrụ kwaba okpu na mmemme ahụ ma bụrụkwa onye chọpụtara òtù ọrụ obi ebere ahụ, bụ Maazị Lawrence Ọnụchukwu mèrè ka a mara na òtù ahụ bụ otu nnọrọ onwe, otu achọghị úrù ahịa na òtù enweghị ihe ọbụla jikọrọ ya na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ma kwukwazie na ọ bụ nke a ga-esi na ya wee na-enyere ndị ogbenye aka, na-akwàlite ọnọdụ agụmakwụkwọ, ma na-enyekwa ndị ihe na-esiri ike nkwàdo, iji mee ka ihu ọchị waa ha.

Ka ọ na-akọwàpụta na ọ bụ ọkàrà ụgwọ ọnwa ya ka ọ na-eji akwàdo ọrụ obi ebere ahụ, Maazị Ọnụchukwu, onye bụ osote onyeisioche okpuru ọchịchị 'Abuja Municipal Area Council' ma bụrụkwa onyeisi òtù jikọtara ndị ndị òsòte isi oche okpuru ọchịchị dị iche iche n'ala Nigeria gara n'ihu kọwaa na ụbịam amaghị àgbụrụ maọbụ okpukperechi onye dị na ya, ma kwukwazie na n'ihi nke ahụ, na ya ga-arụrụ ọrụ obi ebere ahụ gafee steeti Anambra ma gafèkwa ala Nigeria, site n'inye aka Chineke.

Na ntụnye nke ya, onye na-anọchite anya ọgbọ nta nkwàdo Nnewi South nke abụọ n'ụlọ ọgbakọ omebe iwu steeti ahụ, bụ Maazị Johnbosco Akaegbobi kèlèrè Maazị Ọnụchukwu maka ọrụ obi ebere dị iche iche ọ na-abàgide, ya na igùzòbè òtù ọhụụ ahụ, bụ nke o kwùrù na o nwèrè ọtụtụ ezi ihe na mgbanwe dị iche iche nke ahụ gà-ewèta na gburugburu.

Maazị Akaegbobi, onye kwere nkwà inye òtù ahụ nkwado zuru òkè gàkwàrà n'ihu kpọkuo ndị ọzọ bụ ndị aka ji àkụ n'ebe dị iche iche ka ha ñòmie ya bụ ọmarịcha atụmatụ, ma kwekwazie nkwà na tupu ya anọchaa ahọ anọ n'ụlọ omebe iwu steeti ahụ, na ọ gaghịzịkwa enwe ụlọakwụkwọ ọbụla na mapaghara ọgbọ nta nkwàdo Nnewi South nke abụọ ahụ ụmụakwụkwọ ga na-anọdụ n'ala nkịtị were na-agụ akwụkwọ, dịka e si ahụta n'ụfọdụ ebe ugbua.

N'okwu ọ gwàrà ndị nta akụkọ, onyeisi ụlọ ọrụ 'COGNI Associate Nig. Ltd.' bụ Oriakụ Chinyere Chukwudebelu, bụ onye nọchitere anya nnukwu nna nke ụbọchị ahụ, bụ Maazị Francis Chukwudebelụ jàrà Maazị Ọnụchukwu ike maka enyemaka ya n'ebe ndị ụwa na-atụ n'ọnụ nọ, ma kọwaa ịnyerịtara mmadụ aka dịka ọrụ dịịrị onye ọbụla nakwa ihe onye ọbụla kwèsiri ịdị na-eme oge ọbụla, n'agbanyèghị ole àkpà ya hà.

Tupu oge mmemme ahụ kpọmkwèm, Maazị Ọnụchukwu gàrà leta ụlọakwụkwọ 'Ohineleke Central School Ukpor' bụ ebe ọ gụrụ akwụkwọ Praịma ya ihe karịrị ahọ iri atọ gara aga, ma gakwa leta ụlọ ahụike 'Uboma Primary Health Centre, Ukpor' bụkwa ebe o kwere nkwa na ọ ga-aga n'ihu ịkwàdò. Ọ gàkwàrà leta onye bụ onyeisi ụlọakwụkwọ ya oge ọ gụrụ akwụkwọ Praịma, bụ oriakụ Priscillia Nneka Anyachọ, bụ onye kwupụtàrà afọ ojuju na obi ụtọ ya bànyere nleta ahụ ọ na-atụghị anya ya, ma gọkwaziere nwa amadi ahụ ọfọ ogologo ndụ, ahụike na ọganihu.

A nọrọ na mmemme ahụ wee kesàá akwụkwọ e ji ede ihe odide ruru puku iri n'ọgụgụ nyegara ụmụakwụkwọ sitere ụlọakwụkwọ praịma iri isii na atọ e nwèrè n'okpuru ọchịchị ahụ, ma kesàkwa akpa osikapa ruru narị ise n'ọnụ ọgụgụ nyegara ndị dị iche iche sitere òbodo iri dị na 'Nnewi South.'