Adịnụba Adụọla Ndị Ntorobịa Na-Ede Akwụkwọ Ka Ha Gbado Anya

Afrika
Typography
  • Smaller Small Medium Big Bigger
  • Default Helvetica Segoe Georgia Times

Igbo sị na ọ bụ ka onye si eme ka oku si akpọ ya, ma sịkwa na ùgwù dike anaghị agha ya, ma na ndụ ma n'ọnwụ. Ka ọ dị taa, a kọwaala otu onye edemede a mà amá, bụ ọkammụta Chịnua Achebe lagoro mmụọ dịka odogwu nwoke ọka ibe, na onye nwere ezi ọhụhụ ụzọ.

Ọ bụ Kọmishọna na-ahụ maka mgbasa ozi na ịkụziri ọhaneze ihe ha kwesiri ịma na steeti Anambra, bụ Maazị C-Don Adịnụba nyèrè ya bụ nwa amadi otuto a n'isi ụlọ ọrụ ya dị n'Awka, oge ndị òtù jikọtara ahụ ndị ntorobịa na-ede akwụkwọ n'ala Nigeria, bụ 'Society of Young Nigerian Writers', ngalaba ya nke steeti Anambra gàrà kpọtụrụ ya.

O mere ka a mara na Achebe, dịka ọkaibe ọ bụ, sitere n'akwụkwọ ya bụ 'Man of The People' wee buo amụma na a ga-enwe nsogbu igbusi mmadụ n'ala Nigeria, ma nwekwa nke abụọ ya ma ọ gachaa obere oge nke mbụ jiri mechaa; ihe ndị ahụ niile wee mezuo n'ahọ 1966 n'ala Nigeria.

O torò ya bụ agụnwoke dịka onye dere ọtụtụ akwụkwọ na-ewu èwù n'ogoogo mba ụwa, nke gụnyere 'Things Fall Apart,' bụ nke o dere oge ọ dị ahọ iri abụọ na isii ma bipụta ya oge ọ dị ahọ iri abụọ na asatọ, tinyere akwụkwọ ya ndị ọzọ, dịka 'Anthills of Savannah,' 'No Longer At Ease,' 'Arrow of God' na ọtụtụ akwụkwọ ndị ọzọ o dèrè tupu laa mmụọ, ma kọwazie ya dịka odogwu nwoke steeti Anambra, Ndị Igbo na Ala Nigeria n'izugbe ji eme ọnụ.

Kọmishọna Adịnụba kwukwazịrị na o kwesiri nnọọ ka a gaa n'ihu ịkwanyere ya bụ nnukwu mmadụ ugwu ruuru ya, ọbụnadị ma ugbu a ọ lagoro mmụọ. Ọ kpọkukwara ma dụọ ndị ntorobịa ahụ na-eto eto ka ha gbadosie anya ike ma soro ezi nzọ-ụkwụ Ọkammụta Achebe dịka ihe nlere anya, dịka ọ bụ nwoke jụrụ ikwe ka e nwee ihe ọbụla jikọọrọ ya na ime mpụ ma ọ bụ ịkwàdo ihe ọjọọ, wee rukwaa n'ọnwụ ya.

Na mbụ n'okwu ya, onye duru ndị ahụ wee bịa ya bụ ije, ma bụrụkwa onyeisi otu jikọtara ndị ntorobịa na-ede akwụkwọ n'ala Nigeria, ngalaba ya nke Anambra, bụ Maazị Izunna Okafor, kwuru na ọbịbịa ahụ ha bịara bụ iji kpọtụrụ ya bụ Komishọna nakwa ụlọ ọrụ ya maka nnukwu mmemme ha na-akwadobe ịchịkọba n'aha Ọkammụta Chinua Achebe.

O mere ka a mara na ya bụ mmemme, bụ nke a kpọrọ 'Chinua Achebe Literary Festival' bụ nke ha si na ya wee na-akwanyere Achebe ùgwù, ma sịkwa na ha màlìtere ya n'ime ahọ anọ gara aga, bụ ahọ 2016, oge ha mere agba nke mbụ ya, ọbụnadị dịka o kwuru na nke ahụ amịtala nnọọ ọtụtụ ezi mkpụrụ.

Ka ọ na-ekwupụta na isiokwu mmemme omenahọ ahụ nke ahọ a dịka 'Intellectual and National Development: The Chinua Achebe Approach' nke pụtara, ma a sụgharịa ya 'Ndị Gụrụ Akwụkwọ Na Mmepe Obodo: Usoro Nke Chịnua Achebe'; Maazị Izunna gakwara n'ihu kọwaa na ya bụ mmemme nke ahọ a ga-ewerekwa ọnọdụ n'ụbọchị ahụ a mụrụ Achebe, bụ abalị iri na isii nke ọnwa Nọvemba n'ogige ọba akwụkwọ Kenneth Dike dị n'Awka, màlite n'elekere iri nke ụtụtụ.

N'ịkpọku gọọmenti steeti ahụ ka o mee aha Ọkammụta Chnụa Achebe ka ọ dị ọkpụtọrọkpụ, tupuu steeti ndị ọzọ eburu ụzọ mee nke ahụ; ya bụ onye ntorobịa nwetagoro ọtụtụ nkwanye ùgwù n'edemede jizịrị òhèrè ahụ wee rịọ Gọvanọ Obianọ ka o gùzobe onye enyemaka ma ọ bụ onye ndụmọdụ pụrụ iche ga-anọ n'agbata gọọmenti na ndị na-ede akwụkwọ na steeti ahụ, rịọ nkwàdo maka ihe mmemme ahụ, ma kpọkuokwa ọhaneze ka ha bịa were anya ha na ntị ha gbara ekeresimeesi n'ụbọchị mmemme ahụ, bụ nke ọtụtụ ndị dị iche iche na-ede akwụkwọ ga-esonye na ya.