Dayọsiisi Awka Echenwòóla Ndị Nne n'Ihu Chineke, Dogharịa Ha Nsọ

Afrika
Typography
  • Smaller Small Medium Big Bigger
  • Default Helvetica Segoe Georgia Times

O kwòrò ekwò ma hịọ ahịọ n'ụlọụka 'Chapel of Redemption' nke mahadum Nnamdị Azikiwe dị n'Awka bụ isi obodo steeti Anambra, dịka ụka Angịlịkan na Dayọsiisi Awka kàrà ụkà idogharị ụmụnwaanyị dayọsiisi ahụ nsọ na ichenwò ha n'ihu Chineke ọzọ, nakwa ịtụ mmamma.

N'okwuchukwu ya n'òfùfè nrò ahụ, Achịbishọọpụ nke mpaghara Niger, ma bụrụkwa Bishọọpụ ụka Angịlịkan na dayọsiisi Awka, bụ 'Most Reverend' Alexander Ibezim kpọkùrù ụmụnwaanyị ka ha gbàá ndụ ịbụ ndị na-ekpere Chineke n'ime mmụọ na n'eziokwu, ya na ịbụ ndị ga na-ahụta ma na-ewètakwa ihe ọma n'ebe ọbụla ha hụtàrà onwe ha.

O mèrè ka a mara na Chineke nyèrè nwaanyị ọbụla bụ onye ezi omume anya nke ime mmụọ iji na-ahụ ihe na-eme n'ezinaụlọ ya, n'ụlọụka, n'obodo ya, nakwa gburugburu ya n'izugbe, ya na akọnuche iji chepụta ụzọ kachasị mma a ga-esi chụsòó ihe ndị ahụ.

Ọ kpọkùzịrị ha ka ha dị ike n'ekpere, na-asọpụrụ ọgbụgba ndụ ha na Chineke, ya na ọgbụgba ndụ alumdi na nwunye ha, ma na-egosipụtakwa akparamaagwa niile e jiri mara ezi onye nne na ezi onye otu Christ, iji bụrụ ndị kwụdosiri ike n'okwukwe ma na-etokwa eto n'ime mmụọ na-agbànyèghị ihe iche aka mgba ọbụla nakwa ebilimmiri niile nke ndụ a.

Na ntụnye nke ya, onyeisi otu ụmụnwaanyị na òtù ụmụagbọghọ na mpaghara Niger, bụ Oriakụ Chiọma Ibezim kèlèrè Chineke maka otu o siri duru ha wee bàta ahọ ọhụụ 2020 n'udo, ya na ọrụ ọma dị iche iche ọ na-arụ na mpaghara ahụ na dayọsiisi ahụ.
Ọ dụkwàzịrị ụmụnwaanyị ibe ya ka ha bụrụ ezi ndị nne, ma bàgidekwa n'ịgbasàwànyè oziọma nke eziokwu ahụ na Christ na-abịa ọzọ ịkpọrọ ndị nke ya, n'ihi na ụwa abụghị ebe obibi.

N'okwu nke ya, ụkọchukwu na-elekọta ụlọụka 'Chapel of Redemption, Unizik' bụ 'Venerable' Benson Udezọ kèlèrè Chineke n'ọrụ dị iche iche ọ na-arụ na dayọsiisi ahụ, ma kelekwa Bishọọpụ Ibezim na nwunye ya, bụ ndị o ji àkwárá ngwaọrụ pụrụ iche. O kèlèkwazịrị ndị dị iche iche nyere aka n'ụzọ n'ọtụtụ ime ka ya bụ oke ụbọchị na ofufe nrò gaa siriri wèrèrè, ma kpekwazie ka Chineke gọzie ma kwụghàchi ha mmaji kwùrù mmaji.

A nọrọ na ya bụ òfùfè nrò wee bụọ abụ olu ụtọ dị iche iche, nyee onyinye ịtụ mmamma, ma chenwòókwa ụmụnwaanyị dayọsiisi ahụ n'ihu Chieneke, nke mezịrị ka mmemme ahụ zaa ahà a kpọrọ ya.