N'ụtụtụ ụbọchị Mọndee, ụlọọrụ na-ahụ maka ntụliaka INEC, kpọpụtara Bello dịka onye turu ugo na ntụliaka gọvanọ emere ụbọchị Satọdee na Steeti Kogi. Anyị ga-amata na-akwụsịrị ịkpọpụta mpụtara ntụliaka ụbọchị ụka dịka mpụtara ntụliaka ahụ sitere okpuru ọchịchị ime obodo iri na iteghete n'ime iri abụọ na otu dị na steeti ahụ.

Onye zọrọ ọkwa gọvanọ na Steeti Bayelsa n'otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị All Progressive Congress eturula ugo na ntụliaka gọvanọ emere ụbọchị Satọdee. Lyon, bụ onyr meriri ba okpuru ọchịchị ime obodo isii n'ime asatọ enwere na steeti ahụ, meriri onye otu ya gbasoro ya mgba dịka nwoke, Sinatọ Douye Diri nke otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị People's Democratic Party, onye nwetara mmeri na okpuru ọchịchị ime obodo abụọ.

Ọ kpọtụrụ akpọtụ ma zụọ azụọ n'okpuru ọchịchị Orumba South, dịka Ọhaneze Ndị Igbo gùzòbèrè ndị ndu ngalaba ya bụ òtù n'okpuru ọchịchị 'Orumba South' nke steeti Anambra. Ya bụ nnukwu mmemme nguzobe bụ nke dọtara ọtụtụ ndị eze ọdịnala obodo dị iche na steeti ahụ, tinyere ndị ọrụ gọọmenti, ndị ndu obodo ọtụtụ ndị ọzọ okwu ha nà-ada ụda na ya bụ steeti.

Ụlọọrụ na-ahụ maka ọgwụ ike n'ala anyị, NDLEA n'aha mkpirisi, ngalaba nke Oyo Steeti, nọrọ ụbọchị Tọzdee mebie ala dị ihe dịka hectare iri anọ akọrọ hemp na Aba Tade, dị n'okpuru ọchịchị ime obodo Oluyole, na Oyo Steeti. Onyeisi ngalaba NDLEA na steeti ahụ, Maazi Ralph Igwenagu, kwuru na ngalaba ahụ emebiela ala dị hectare isii n'akụkụ Oke Ogun na steeti ahụ n'oge gara aga.

Igbo sị na ọ na-abụ a kpaa akpaa, a rahụọ n'ute, ma sịkwa na ọ na-abụ a dị n'ìzù a nata ndị mmụọ ihe. Ụlọ ọrụ ahụ okwu bànyere oke ala dị n'aka n'ala Nigeria, bụ 'National Boundary Commission (NBC)' agbapeela amụmà ọrụ ịkpa ókè àlà anya ọzọ na nsogbu oke ala ahụ na-adapụta n'etiti ụfọdụ obodo steeti Anambra na steeeti Enugu, n'ebe steeti abụọ ahụ gbàrà agbataobi, iji hụ na e kpèzìrì ya ma mekwa ka ufo tọrọ àtọ laghachi.

Igbo sị na ọ bụ ka onye si eme ka oku si akpọ ya, ma sịkwa na ùgwù dike anaghị agha ya, ma na ndụ ma n'ọnwụ. Ka ọ dị taa, a kọwaala otu onye edemede a mà amá, bụ ọkammụta Chịnua Achebe lagoro mmụọ dịka odogwu nwoke ọka ibe, na onye nwere ezi ọhụhụ ụzọ.

More Articles ...