Oke ọñụ dara n'ogige ụlọ ahụike Obu Ọzọm dị n'Urunnebo nke obodo Enugwu-Ukwu dị n'okpuru ọchịchị Njikọka nke steeti Anambra, dịka gọọmenti steeti ahụ gbàpùrù mmiri ọhụụ, bụ nke ji ọkụ si n'ikike anyanwụ were arụ ọrụ, ma nyefee ya n'aka ụlọ ahụike ntà ahụ.

Gọọmenti etiti, site n'okpuru ngalaba ụlọ ọrụ ya na-ahụ maka imezigharị na ichekwaba okporo ụzọ, bụ 'Federal Road Maintenance Agency (FERMA)' amalitela idozigharịsị ụfọdụ ụzọ mebiri emebi na mpaghara ebe dị iche iche na steeti Anambra.

Buusu sị na ọ bụ mmekọrịta ahụ bụ ụtọ nwanne, maka na abụọ nyụkọọ mamịrị ọnụ ọ gbọọ ụfụfụ. N'ịgbaso nke a, nnukwu ọgbakọ otu ụbọchị nke ngalaba ụlọ ọrụ 'National Cash Transfer Unit, Abuja' ewerela ọnọdụ n'Awka bụ isi obodo steeti Anambra, ma bụrụ nke a nọrọ na ya wee kpọọ òkù ka e nwee ezi mmekọrịta n'etiti gọọmenti etiti na nke steeti dịka o siri metụta ịkwàlite amụma ikesa ego maka nkwalite obibi ndụ, bụ nke a kpọrọ 'Cash Transfee program'.

Igbo sị na omere onye ogbenye na-emere chi ya, ma sịkwa na ọ hụrụ mma mee nwèrè ụgwọ ọrụ. Ka ọ dị taa, nwunye aka na-achị steeti Anambra, bụ Oriakụ Ebelechukwu Obianọ nọrọ na nso-nso a wee rụọrọ ma nyefèé otù nwaanyị ọzọ enweghị di na ebe obibi ọmarịcha ụlọ ọhụụ n'obodo Nnobi, dị n'okpuru ọchịchị Idemili South nke steeti ahụ.

More Articles ...