A kpachapuru anya gbanyuo akara ngwa mgba ama MH370

MH370

Eshia
Typography
  • Smaller Small Medium Big Bigger
  • Default Helvetica Segoe Georgia Times

Onye isi ọchịchị mba Maleshịa, Najib Razak, ekwuole na e nwere ịhe mere mmiri jiri baa n'opi ụgbọgụrụ. Ha achọpụtago na akpachapụrụ anya gbanyụọ akara ngwa mgba ama di n'ụgbo-elu Boeing 777 ndị mba Maleshia ahụ a na-achọ achọ kemgbe otu izu ụka.

Najib Razak kwuru na, site n'ozi ha nwentere n'igwe nnyocha satalaịtị, agwa ụgbọ-elu ahụ kpara, mgbe o na-efu efu, na-egosi ịhe aka mmadụ mere.

Ụgbọ-elu MH370, bu mmadụ 239, si Kụala Lụmpọ na-aga Beijing gbagidere n'elu bụrụzie ịhe a na-achọ achọ.

Anya ịkpeazụ igwe nnyocha njem ụgbọ-elu hụrụ MH370 bụ mgbe MH370 na-efe na mpaghara oshumiri ndịda Chaịna. Ụwa niile ka na-achọ MH370 ruo taa.