Lastest News in Igbo Language

---
Site Father
---

Ọkụ ọgbụgba adakwasị Nkwọ Ogidi

Igbo Radio

Ọkụ ọgbụgba dị oke egwu nọrọ na ngwụcha izu ụka gara aga wee dakwasị nnukwu ahịa ahụ na-ekwo ekwo, bụ Nkwọ Ogidi, bụ ebe ọ nọrọ wee gbarikọọ opekata mpe, ihe ruru ọdụ ahịa asatọ n'otu ntabi anya.


Read More

A kpọkuola gọọmenti etiti ka Ọ kwụọ Steeti Anambra ụgwọ O ji ya

Igbo Radio

A kpọkuola gọọmenti etiti ka o were ọsọ were ije kwụọ gọọmenti steeti Anambra ego karịrị ijeri naịra iri anọ na atọ, bụ ụgwọ o ji ya maka ụfọdụ iro na àkwà dịịrị ya bụ gọọmenti etiti, ọ rụrụ.


Read More

Anyị ga-etutekwa ebe a na-esucha mmanụ agbidi - NNPC

Igbo Radio

Ụlọ ọrụ ahụ okwu mmanụ dị n'aka n'ala anyị, bụ ụlọ ọrụ NNPC n'aha ịchafụ ekwuola na amụma na-aga n'ihu ugbu a iji nwogharịa ma tutekwa ebe ndị ahụ a na-esucha mmanụ agbadi n'ala anyị ka ha malitekwa ịrụ ọrụ ọzọ.


Read More

A gaghị m ekwezị ka E gbuo ma ọ bụ tọrọ mmadụ n'ala Naịjirịa -- Buharị

Onyeisi ala anyị bụ Muhammadu Buharị ekworola ntutu ya taa ma kpebie na ọchịchị ya agaghị anwakwazị anwa kwe ka e gbuo ma ọ bụ tọrọ mmadụ ọbụla na mpaghara ọbụla n'ala Naịjiria. Onyeisi ala Buharị mere ka a mara nke a na Pọọtụ Hakọọtụ


Read More

Ọhaneze Ndị Igbo Adụọla Buharị Ka Ọ Nasịa Ndị Fụlani Ngwọ Ọgụ

igbo radio

Nnukwu otu Igbo ahụ a ma ama bụ Ọhaneze Ndị Igbo akpọkuola gọọmenti etiti n'okpuru ndu onyeisi ala Muhammadụ Buharị ka o were ọsọ were ije wee nasịsịa ndị oji akpa eli ozu ahụ bụ ndị Fụlani na-achị ehi egbe, mma na ngwa ọgụ ndị ọzọ niile ahụ ha ji akpa arụ, bụkwa nke ha ji ememilasị ndụ ụmụ mmadụ aka ha dị ọcha.


Read More

Obianọ Akpọọla Oku Ka E Nwee Ezi Mmekọrịta N'etiti Okpukperechi Dị Iche Iche

site father website hosting

Aka na-achị steeti Anambra bụ gọvanọ Willie Obianọ akpọọla oku ka e nwee ezi mmekọrịta, ịdị n'otu na ụtọ nwanne n'etiti ndị okpupkerechi dị iche iche na steeti Anambra iji wee kwalite ezi udo dị na steeti ahụ ka ọ bụrụ nke tọrọ àtọ.


Read More
--
www.igboradio.com | Contact | Facebook | Twitter
--
Powered by AcyMailing