Top Stories

Dịka asọmpi maka ntozu AFCON na-ebiri ọkụ, otú egwu bọọlụ ala anyị, Ugo Ukwu, bụ ndị a na-eche na ha ga-ezukọta na Naijiria, ụbọchị taa bụ Mọndee iji were kwado maka asọmpi a iji sonye na AFCON 2021. Asọmpi mbụ nke otu B dị n'etiti Naijiria na ndị mba Benin Republic.

Naijiria jiri ọkpụ anọ asataghị ma chaa were si ndị ọgbọ ha si mba Qatar nnọọ dịka ha sọrọ mpi mbụ ha na Iko Mba Ụwa FIFA ndị na-erughị afọ iri abụọ na mba Poland.

N'agbanyeghị ohere niile ha nwere, Naijiria gbara aka ihe olu lata dịka egwuregwu ndị na-erubeghị afọ iri na asaa na mba Afrịka bịara n'isi njedebe tata na Tanzania. Naijiria ka ndị Angola jiri ọkpụ abụọ asatara nanị otu were merie dịka mba abụọ a zọrọ ndị nke atọ na Satọdee. N'agbanyeghị mmeri a, Ugo Ọlaedo Naijiria ga-esonye na nke mba ụwa niile na Brazil.

Mba Guinea na Naijiria lụrụ ọgụ ka nwoke n'ime nkeji iri na iteghete na asọmpi mbụ nke na-eso nke ikpeazụ n'egwuregwu Iko Mba Afrịka na-aga n'ihu na Tanzania. Nkea butere penariti dị ogologo nke kwụsịrị oge Ogaga Oduko gbaliri nke ya n'eluigwe mere ka Syli Nationale nke Obere gaa n'ihu na-agbata nke ikpeazụ ụbọchị ụka n'agba nke iri na atọ egwuregwu ahụ.

Onye na-agba n'ihu bụ Olakunle Olusegun kpara ike dịka dike oge otu egwu bọọlụ ala anyị na-erubeghị afọ iri na asaa nọrọ n'ụbọchị Wednezdee bụrụ mba mbụ ga-esi Afrịka were sonye Asọmpi Iko FIFA maka ndị na-erubeghị afọ iri na asaa nke afọ a.

Ebe enyi abụọ na-agba mba, ọ bụ ahịhịa bụ ihe na-ata ahụhụ. Nke a kọwara ihe mere ụbọchị ụka ka ndị otu egwu bọọlụ Naijiria na-erubeghị afọ iri na asaa nọrọ n'ámá egwuregwu Dar es Salaam were gosi ndị ọgbọ ha si Tanzania, bụ ndị anọ be ha asọ mpi ahụ, na bụ ọka ibe na agba nke iri na atọ Iko Mba Afrịka ndị na-erubeghị afọ iri na asaa.

Sign up via our free email subscription service to receive notifications when new information is available.
Advertisement