Dịka asọmpi maka ntozu AFCON na-ebiri ọkụ, otú egwu bọọlụ ala anyị, Ugo Ukwu, bụ ndị a na-eche na ha ga-ezukọta na Naijiria, ụbọchị taa bụ Mọndee iji were kwado maka asọmpi a iji sonye na AFCON 2021. Asọmpi mbụ nke otu B dị n'etiti Naijiria na ndị mba Benin Republic.

Naijiria jiri ọkpụ anọ asataghị ma chaa were si ndị ọgbọ ha si mba Qatar nnọọ dịka ha sọrọ mpi mbụ ha na Iko Mba Ụwa FIFA ndị na-erughị afọ iri abụọ na mba Poland.

Ndị Naịjirịa nọrọ n'amaegwuregwu Chamazi dị na Dar es Salaam ụbọchị Satọdee were bụrụ ndị mbụ n'otú ha na asọmpi ụmụ okorobịa n'erubeghị afọ iri na asaa nke mba Afrịka na-aga n'ihu dịka ha na ndị ọgbọ ha si mba Uganda nyere onwe ha otu ọkpụ otu ọkpụ.

Ndị otu egwu bọọlụ ala anyị, Naijiria, nọrọ na mgbede Tuzdee were gosi ndị ogbo ha na mba Ijipt na nwoke na nwoke ha bụ n'okwu ọnụ. Pọl Onuachu nyere goolu site na yadị iri abụọ, na mbido mbụ ya dịka onye otu egwú bọọlụ ala anyị, mere Naijiria jiri merie Ijipt na asọmpi enyi na enyi ahụ agbara na ama egwuregwu Stephen Keshi dị na Asaba.

N'agbanyeghị ohere niile ha nwere, Naijiria gbara aka ihe olu lata dịka egwuregwu ndị na-erubeghị afọ iri na asaa na mba Afrịka bịara n'isi njedebe tata na Tanzania. Naijiria ka ndị Angola jiri ọkpụ abụọ asatara nanị otu were merie dịka mba abụọ a zọrọ ndị nke atọ na Satọdee. N'agbanyeghị mmeri a, Ugo Ọlaedo Naijiria ga-esonye na nke mba ụwa niile na Brazil.

Otú egwu bọọlụ ala anyị, Super Eagles, bụzi ndị kwụrụ dịka ndị nke atọ na mba Afrịka ka ha gbagochara were bụrụzıe ndị nke iri anọ na abụọ na mba ụwa niile dịka ndị òtù ahụ na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ n'ụwa niile, FIFA, wepụtara ka mba ọ bụla siri kwụrụ ụbọchị Tọzdee na nchịkọta ọnwa Maachị.

Otú egwu bọọlụ ala anyị, Super Eagles, ebidola nkwadebe n'ebe ọ kpụ ọkụ n'ọnụ maka asọmpi itozuoke iji were sonye n'iko mba Afrịka nke afọ puku abụọ na iri na iteghete n'ụbọchị Fraịdee megide ndị òtù ha bụ ndị mba Seychelles na ama egwuregwu Stephen Keshi, dị na Asaba dịka ndị egwu bọọlụ mmadụ iri abụọ na atọ sonyere na ya bụ nkwado nke onye nọ n'isi ya bụ Gernot Rohr.

More Articles ...

Page 1 of 3