Mba Senegal ahọpụtago Aliou Cisse dịka onye nlekwata otu egwuregwu bọọlụ nke mba ahụ

Boolu Ukwu
Typography
  • Smaller Small Medium Big Bigger
  • Default Helvetica Segoe Georgia Times

Cisse bụ Kaptin ndị otu bọọlụ mba Senegal mgbe otu ahụ mere ọfụma n’asọmụpi iko mba ụwa nke e mere n’afọ 2002.

Cisse, onye nke dị afọ 38 ugbu a, ga-ewere ọkwa site n’aka nwoke onye mba Frans, Alain Giresse,

onye oge ya bịara n’isi njedebe n’ọnwa Jenụwarị, mgbe mba Senegal na-achịtaghị aja ọ bụna n’asọmụmpi iko mba Afrịka nke a zọrọ na mba Ikwetọrial Gini.

Na ndụ ya dịka onye ji egwuregwu bọọlụ eri nni, Cisse gbaara ndị otu Paris St Germain. O mechara kụọrọ ndị Montpellier nke e nwere na mba Frans, tupu ọ gawazie mba Briten. Ebe ahụ ka ọ gbaara ndị Birmingham City, yana ndị Portmouth.