Emmanuel Anunike ga-ahazigharị otu egwuregwu bọọlụ Golden Eaglets

Boolu Ukwu
Typography
  • Smaller Small Medium Big Bigger
  • Default Helvetica Segoe Georgia Times

Onye na-elekwata otu egwuregwu bọọlụ ụkwụ Golden Eaglets nke ala Naịjiria, bụ Emmanuel Amunike, ekwuputego njikere ọ dị maka ịhazigharị otu ahụ. Amunike kwuru n’e kwesirị ihazigharị otu Golden Eaglets tupu a malite asọmụmpi egwuregwu bọọlụ FIFA maka ndị na-erubeghị afọ 17, nke a na-akwado inwe na mba Chile.

Ndị Golden Eaglets gbara onye nke anọ n’asọmụmpi bọọlụ ụkwụ African U-17 nke e mere na mba Nije. Mgbe ọ na-agwa ndị nta akụkọ okwu maka asọmụmpi ahụ, Amunike kwuru n’ọ bụ ihe dị oke mkpa na a hazigharịrị Golden Eaglets, ma ọ bụrụ na ha ga-achịta aja n’asọmụmpi mba ụwa na Chile. Amunike kwuru n’ọ bụrụ na a hazigharịa Golden Eaglets, yanwa nwere olile anya na ha ga-eme ọfụma na Chile.