Naijiria Jiri Nnukwu Mmeri Were Bido

Boolu Ukwu
Typography
  • Smaller Small Medium Big Bigger
  • Default Helvetica Segoe Georgia Times

Naijiria jiri ọkpụ anọ asataghị ma chaa were si ndị ọgbọ ha si mba Qatar nnọọ dịka ha sọrọ mpi mbụ ha na Iko Mba Ụwa FIFA ndị na-erughị afọ iri abụọ na mba Poland.

Maxwell Effiom, Henry Offia, Tom Dele-Bashiru and Aliu Salawadeen bụ ndị nyere goolu Ugo Na-efe Efe dịka amara otu bọọlụ a, meriri n'ụdị pụrụ iche n'ámá egwuregwu Stadion Miejski w Tychach, Tychy.

Mmeri a bugoro Naijiria n'ogogo nke mbụ na Otu D dịka ha nwere akara atọ. Otu egwu bọọlụ Paul Aigbogun's ga anọrọ ụbọchị Mọndee, May 27, gbaa ndị United States nke America.

Mmeri na-ebe ndị America nọ ga-enye ha ohere maka ịbanye n'agba nke abụọ n'egwuregwu ahụ.