Ntozu Maka AFCON: Ugo Naijiria Ga-ezukọ Ta

Boolu Ukwu
Typography
  • Smaller Small Medium Big Bigger
  • Default Helvetica Segoe Georgia Times

Dịka asọmpi maka ntozu AFCON na-ebiri ọkụ, otú egwu bọọlụ ala anyị, Ugo Ukwu, bụ ndị a na-eche na ha ga-ezukọta na Naijiria, ụbọchị taa bụ Mọndee iji were kwado maka asọmpi a iji sonye na AFCON 2021. Asọmpi mbụ nke otu B dị n'etiti Naijiria na ndị mba Benin Republic.

Naijiria ga-ebido asọmpi itozu maka ịsonye na AFCON ga-adị na Cameroon n'afọ 2021 site na ị nabata ndị egwu bọọlụ mba Benin Republic a na-akpọ Uze na Ámá egwuregwu Godswill Akpabio dị na Uyo na Wednezdee. Dịka ha na ndị Benin kwatụsịrị, Ugo ala anyị ga-efepụ gawa Maseru ụbọchị Friday maka asọmpi ha na Aguiyi nke Lesotho na Ámá egwuregwu Maseru-Setsoto ụbọchị ụka.

Naijiria zuru okè n'egwu dịka Ahmed Musa nwere ihe mmerụ ahụ bụ onye dị mma ugbua tinyere ndị na-agba n'azụ - Omeruo, Abdullahi Shehu na Bryan Idowu, tinyere ọgba n'etiti Mikel Agụ. Kalu, bụ onye na-agba na mba France echighatala ka o soghị gbaa asọmpi enyi na enyi nke Naijiria na Brazil.

Daniel Akpeyi bụ onye akpọrọ kamgbe Naijiria gbachara AFCON 2019 na Ijipt, Oche goolu nke mbụ Francis Uzoho bụ onye agaghị eso n'ọtụtụ asọmpi maka ihe mmerụ ahụ o nwere na asọmpi Naijiria na Brazil.

Issa Sy nke Senegal bụ onye CAF wepụtara ga-egbu pịpịrọ na asọmpi ahụ ga-adị n'etiti Naijiria na Benin Republic na Uyo. Nouha Bangoura, El Hadji Abdoul Aziz Gueye na Fatou Thioune bụ ndị ga-enyere ya aka.