AFCON Ndị Erubeghị Afọ Iri Abụọ na Atọ: Naijiria Egosi Zambia na Iti Na-ama Ụzọ Akwụkwọ

Boolu Ukwu
Typography
  • Smaller Small Medium Big Bigger
  • Default Helvetica Segoe Georgia Times

Dịka ọ na-ahịọ na mba Ijipt ebe AFCON ndị erubeghị afọ iri abụọ na atọ na-aga n'ihu ugbua, Naijiria jiri iwe were gosi mba Zambia na ọ bụ iti na-ama ụzọ akwụkwọ ka ha jiri ọkpụ atọ asatara otu si ha jido n'amaegwuregwu Al Salam na Cairo.

N'agbanyeghị na Patson Daka bu ụzọ nye goolu na nkeji iri na abụọ, mana Orji Okonkwo sara ya bụ goolu na nkeji iri na isii.

Kelechi Nwakali mezuru goolu ahụ abụọ site na adoba abụọ, free kick, dị egwu na nkeji iri isii na ise; ebe Taiwo Awoniyi jiri goolu nke atọ were mechie okwu dịka oge na-akụzi kwarapụ kwarapụ.

Mmeri a meziri Naijiria jiri bụrụ ndị nke abụọ dịka ha si kwụrụ n'ogogo otu B site n'akara atọ ha nwere ugbua, ma wulite mmụọ ha n'olile anya ịnweta akwụkwọ Olympics afọ.

South Africa bụ ndị nke mbụ ugbua site na akara anọ dịka ha na ndị Zambia gbachara onye laba onye laba na iji otu ọkpụ asataghị otu merie Ivory Coast.

Ndị egwu bọọlụ Naijiria na-erubeghị afọ iri abụọ na atọ ka e meriri na asọmpi mbụ ha na ndị Ivory Coast sọrọ na Satọdee.