Gọọmenti Anambra Ga-Etinye Ijeri Naịra Iri N'Ọrụ Okporo Ụzọ – Obianọ...

Gọọmenti Steeti Anambra ekwuola na ọ ga-etinye ego dị ijèri Naịra iri n'ọrụ okporo ụzọ dị iche iche na steeti ahụ, iji hụ na a rụchapụrụ ha tupuu oge udu mmiri eruo.

Guchaa Akuko a Guoo Akuko Ndi Ozo

A Malitena Idebanye Aha Ndị Ntorobịa Anambra Enweghị Ọrụ n'Akwụkwọ

A malitena idebanye aha ndị ntorobịa sitere n'okpuru ọchịchị iri abụọ na otu nke steeti Anambra bụ ndị enweghị ọrụ, n'akwụkwọ. Aka na-achị steeti ahụ bụ gọvanọ willie Obianọ mere ka a mara nke a n'ofufe nru pụrụ iche a chịkọbara n'ụlọ ụka St. Patrick dị n'Ọka bụ isi obodo steeti ahụ iji merube mmemme icheta ọgbụgba ahọ iri ise na asaa nke ala Naịjiria.

A malitena idebanye aha ndị ntorobịa sitere n'okpuru ọchịchị iri abụọ na otu nke steeti Anambra bụ ndị enweghị ọrụ, n'akwụkwọ.

Aka na-achị steeti ahụ bụ gọvanọ willie Obianọ mere ka a mara nke a n'ofufe nru pụrụ iche a chịkọbara n'ụlọ ụka St. Patrick dị n'Ọka bụ isi obodo steeti ahụ iji merube mmemme icheta ọgbụgba ahọ iri ise na asaa nke ala Naịjiria.

O sị na a ga-eme ya bụ ndebanye aha dịka ogoogo agụm akwụkwọ onye nwetara si dị, ma sịkwa na ihe e jiri weputa atụmatụ ahụ bụ iji nyere gọọmenti aka ịtụ atụmatụ maka ịkwalite ọdịmma na ezi ọnọdụ obibi ndụ nke ndị ntorobịa na steeti ahụ. O kwuru na ego ya bụ atụmatụ abaana n'amụma ego ọrụ nke ahọ 2018, na a ga-etinyekwa ya n'ọrụ ngwa ngwa ụlọ ọgbakọ omebe iwu steeti ahụ nabatara ya bụ amụma ego ọrụ. Gọvanọ Obianọ kọwara na ala anyị Naịjiria nọ na nnukwu ajọ ọnọdụ ugbu a n'ihi ọtụtụ ihe ịma aka chegasịrị ya n'ihu n'oge a, ma kelekwa ndị Anambra n'ihi irube isi ha nye iwu na-achị ala anyị, ọ kachasị n'ihe metụtara ịkpọ ganị ganị na ime ngagharị iwe. Ọ sị na mmemme icheta ọgbụgba ahọ ala Naịjiria nke ahọ a bụ nnọọ oge ntụgharị uche banyere ajọ ọnọdụ niile na-ebi ya bụ mba aka ọjọọ iji weta udo na ezi ọnọdụ tọrọ àtọ.

Na mbụ n'okwuchukwu ya, Bishọọpụ ụka Katọliiki na Dịọsiisi Ọka bụ 'Most Reverend' Paulinus Ezeokafọr kọwara na ihe kpatara ịkpọ ganị ganị niile na-ewere ọnọdụ n'ala anyị bụ ikpudo eziokwu ihu n'ala, mmegbu, na mpụ na aghụghọ na-aga n'ihu na ya bụ ala, ma kpọkuziekwa onye ọbụla ka anyị na-echeta ala Naịjiria n'ekpere ka Chineke wee nụrụ olu anyị ma gbanweere anyị ọnọdụ. A nọzịkwara n'oge ahụ kpee ọtụtụ ekpere pụrụ iche maka udo na ọganihu nke ala Naịjiria na ùtó nke steeti Anambra.

Ndị ukwu ndị ukwu sonyere n'ofufe nru ahụ gụnyere osote onye isi ala Naịjiria n'oge gara aga bụ Dkt. Alex Ekwueme, otu nwa amadi chịbụrụ steeti Anambra n'oge gara bụ Ọriakụ Virgie Etiaba, osote aka chịbụrụ steeti Anambra n'oge gara bụ maazị Emeka Sibeudu na ọtụ ndị ọzọ selitere isi n'ọrụ gọọmenti.

Please Support this Project Today

Please consider supporting this project today with any amount. No amount is too small! Help us to continue to host and maintain this website for the promotion of the Igbo language and culture.

Amount:

Advertisement

Connect with us

Akuko Uwa

Gọọmenti Anambra Ga-Etinye Ijeri Naịra Iri N'Ọrụ Okporo Ụzọ – Obianọ...

Gọọmenti Anambra Ga-Etinye Ijeri Naịra Iri N'Ọrụ Okporo Ụzọ – Obianọ...

Gọọmenti Steeti Anambra ekwuola na ọ ga-etinye ego dị ijèri Naịra iri n'ọrụ okporo ụzọ dị iche iche na steeti ahụ, iji hụ na a rụchapụrụ ha tupuu oge udu mmiri eruo.

Ụgbọ Òlòkó Akwọrịkọọ Mmadụ Abụọ n'Abagana, Bibìé Ọtụtụ Ihe...

Ụgbọ Òlòkó Akwọrịkọọ Mmadụ Abụọ n'Abagana, Bibìé Ọtụtụ Ihe...

Dịka e kwuru na ihe onye zùnyere ọ bụrụ akara ya, otu ụgbọ òlòko (trailer) akwọọla mmadụ abụọ ka akamụ n'Abagana dị n'okpuru ọchịchị Njikọka nke steeti Anambra.

A Ga-Etecha Ụzọ Isekke–Mbọsị–Azịa–Ụkpọr Tupuu Oge Ùdú Mmiri – Obianọ...

A Ga-Etecha Ụzọ Isekke–Mbọsị–Azịa–Ụkpọr Tupuu Oge Ùdú Mmiri – Obianọ...

Gọọmeenti steeti Anambra emeela ka a mara na ya ga-etecha okporo ụzọ ahụ siri Isekke gaa Mbọsị gaa Azịa wee pụta Ụkpọr tupuu oge ufu mmiri eruo n'ahọ a.

Ọkụ Ọgbụgba Egbuola Ụmụaka Atọ n'Obosi, Gbarìkọọ Ebe A Na-Añụ Mmanya...

Ọkụ Ọgbụgba Egbuola Ụmụaka Atọ n'Obosi, Gbarìkọọ Ebe A Na-Añụ Mmanya...

Dịka a sị na chi na-abọ, ihe ọjọọ ana-abọta, ọkụ ọgbụgba agbagbuola ụmụaka atọ n'Obosi dị n'okpuru ọchịchị Idemili North nke steeti Anambra. Ya bụ ajọ ọdachi bụ nke dapụtara dịka ọkụ binwùùrù n'ebe a na-ere ahịa dị na mpaghara okporo ụzọ 'High Tension School'.

Oke Ọñụ Adaa Dịka Lọọlọ Ezenneka gbàrà Ahọ Otu Narị...

Oke Ọñụ Adaa Dịka Lọọlọ Ezenneka gbàrà Ahọ Otu Narị...

Ọ bụ oge òtùtó, okwu mwulite mmụọ na oke ọñụ dị egwu dịka Lọọlọ Elizabeth Ezenneka mere mmemme nchèta ọgbụgba ahọ otu narị e jiri mụọ ya.

Obianọ Akpọọ Òkù Ka A Kwàlite Ịdị n'Otu, Mmekọrịta Obodo Na Ibe Ya...

Obianọ Akpọọ Òkù Ka A Kwàlite Ịdị n'Otu, Mmekọrịta Obodo Na Ibe Ya...

Aka na-achị steeti Anambra bụ gọvanọ Willie Obianọ akpọkuola ndị eze ọdịnala obodo dị iche iche na steeti ahụ ka ha na-akwàlite udo ime-ime obodo na mmekọrịta obodo na ibè ya.

AKUKO SI MPAGHARA AMERIKA

AKUKO SI MPAGHARA YUROPE NA ESHIA

Igbo Language Resources

Contact Us

4800 Gordon Road
Grasslands PO Box 40026
Regina, SK, Canada S4W 0L3
Tel:+1.306.581.4493
Email: igbo@igboradio.com

Copyright © 2009 - 2018 Igbo Radio & The Foundation for the Promotion of Igbo Language and Culture. All Rights Reserved! Designed & Powered by SITE FATHER.