Gọọmenti Anambra Ga-Akwàdo Ndị Ntorobịa Dị Puku Iri Anọ n'Ime Ahọ Anọ --- Obianọ...

Ọchịchị steeti Anambra ekwela nkwà ịkwàdo, o pekata mpe, ndị ntoribịa ruru puku iri anọ n'ime ahọ anọ na-abịa abịa, ma mekwa ka ha guzosie ike, kwụụrụ onwe ha.

Guchaa Akuko a Guoo Akuko Ndi Ozo

Mee 22 Ga-abụ Ụbọchị Ndị Biafra - Ụwazuruike

Dịka otu n'ime ihe dị iche iche e wepụtasịrị iji merube mmemme icheta na ọ gbaala ahọ iri na asatọ kpọnkwem e jiri kwupụpụtanwee nnwere onwe ala Biafra ọhụụ, bụ nke e mere n'abalị iri na abụọ ahọ 2000; onye ndu otu ''Biafra Independent Movement'' bụ maazị Ralph Ụwazuruike akpọkuola ndị otu Biafra ahụ niile ka ha nuputa n'igwè ma mee ngaraghị n'ụzọ awara awara dị iche iche dịgasị na steeti ebe ha nọ, n'abalị iri na abụọ nke ọnwa a.

Maazị Ụwazuruike mere ka a mara nke a site n'ozi ọ kụpụụrụ ndị nta akụkọ, bụ nke Maazị Chris Mocha, bụ onye na-ahụ maka mgbasa ozi ndị otu ahụ binyere aka na ya. Dịka ozi ahụ siri kwuo, ngagharị ahụ ga-ewere ọnọdụ na Benin bụ isi obodo steeti Edo; Port-Harcourt bụ isi obodo steeti Rivers; Asaba bụ isi obodo steeti Delta; Yenegoa bụ isi obodo steeti Bayelsa; Enugu bụ isi obodo steeto Enugu; Ọnịsha, dị na steeti Anambrz; Aba nke steeti Abịa; Owerri nke steeti Imo; Uyo bụ isi steeti Akwa Ibọm; tinyere Abakaliki bụ isi obodo steeti Ebonyi.

Ọ kọwara ịke dịka ịgbaso ụkpụrụ ikewapụta ala Biafra dịka obodo kwụụrụ onwe ya pụọ na Nigeria n'ụzọ udo na na-enweghị nsogbu ọbụla. O kwuru na ala Biafra ga-enwererịrị onwe ya, ma kọwaa na ebumnobi e ji achịkọba mmemme ahụ nke ahọ a bụ iji dọta anya, enyemaka na ntụnye nke otu mba ụwa n'oku ahụ ụmụafọ ala Biafra na-akpọ na ndụdọ ha na-adọ iji kewapụ onwe ha n'ala Biafra ma bụrụ mba kwụụrụ onwe ya.

Maazị Ụwazuruike kpọkuzịkwara gọvanọ Willie Obianọ nke steeti Anambra ka o megharịa ahụ iji hụ na a tọhapụrụ mmadụ iteghete ahụ bụ ndị otu MASSOB e ji eji, ọ kachasị ndị a kpọchiri n'ụlọ nga dị na steeti Anambra, nke gụnyere: Chukwuma Nwọba, Longinus Akụegbu, Okechukwu Ọnụọrah, Anthony Wilfred, Sunday Igwe, Sunday Nweke, David Ota, Robinson Agbo na Onyebuchi Ezia, bụ ndị ndị ọrụ nchekwa nwụchikọrọ ma tụnye ha n'ụlọ nga tupuu e mee nhọpụta ọkwa gọvanọ e mere na steeti ahụ n'ahọ 2018.

Please Support this Project Today

Please consider supporting this project today with any amount. No amount is too small! Help us to continue to host and maintain this website for the promotion of the Igbo language and culture.

Amount:

Advertisement

Connect with us

Akuko Uwa

Gọọmenti Anambra Ga-Akwàdo Ndị Ntorobịa Dị Puku Iri Anọ n'Ime Ahọ Anọ --- Obianọ...

Gọọmenti Anambra Ga-Akwàdo Ndị Ntorobịa Dị Puku Iri Anọ n'Ime Ahọ Anọ --- Obianọ...

Ọchịchị steeti Anambra ekwela nkwà ịkwàdo, o pekata mpe, ndị ntoribịa ruru puku iri anọ n'ime ahọ anọ na-abịa abịa, ma mekwa ka ha guzosie ike, kwụụrụ onwe ha.

Ndị Okenye Anambra Etoo Gọọmenti Etiti Maka Ikwe Nkwa Ịkwụ Anambra Ụgwọ O Ji Ya...

Ndị Okenye Anambra Etoo Gọọmenti Etiti Maka Ikwe Nkwa Ịkwụ Anambra Ụgwọ O Ji Ya...

Otu ndụmọdụ ahụ jikọrọ ndị okenye na ndị e ji okwu ha agba izu na steeti Anambra, bụ nke a maara dịka ''Anambra State Elders’ Advisory Council" etoola gọọmenti etiti maka nkwa ahụ o kwere ịkwụ steeti Anambra ego dị ijeri Naịra iri atọ na asaa n'ime ụgwọ ahụ o ji steeti ahụ maka idozigharị okporo ụzọ dịịrị ya bụ gommenti etiti dị n'ime steeti ahụ nakwa ọrụ ndị ọzọ dịịrị ya, nke gọọmenti steeti ajụ jiri ego ya wee rụọ n'ihi oke mkpa ọ dị.

Nwoke A Tụrụ Nga Mkpụrụ Ọka Amalitela Ime Nzere 'Masters' Ya Na Mahadum...

Nwoke A Tụrụ Nga Mkpụrụ Ọka Amalitela Ime Nzere 'Masters' Ya Na Mahadum...

Dịka a sị na mmasị onye adịghị anwụ n'ime ya, otu nwoke a tụrụ nga mkpụrụ ọkà n'ụlọ mkpọrọ Awka (Awka Prison) dị na steeti Anambra, bụ maazị Jude Ọnwụzulike nọrọ n'ụbọchị Monde banye n'agụm akwụkwọ 'Masters' ya na mahadum "National Open University of Nigeria' (NOUN), bụ ebe ọ ga-eme ihe ọmụmụ "Information Technology". Mmemme mbanye n'agụm akwụkwọ ya ahụ bụ nke weere ọnọdụ n'ogige ụlọ mkpọrọ ahụ dị n'Awka.

Ohere Ezumike: A Dụọla Ụmụakwụkwọ Ka Ha Gusie Akwụkwọ Ike; Nye Ha Nkwàdo...

Ohere Ezumike: A Dụọla Ụmụakwụkwọ Ka Ha Gusie Akwụkwọ Ike; Nye Ha Nkwàdo...

Dịka oge ohere ezumike na-agawanye n'ihu ugbu a, a kpọkuola ma dụọ ụmụ akwụkwọ ka ha were ya bụ ohere ọma gụọ ọtụtụ akwụkwọ ma mụta ọtụtụ ihe ga-enyere ha aka na ndụ, karịa igwufusi ya n'egwuregwu ma ọ bụ n'ịkpa ọfoogeri, bụ nke enweghị ihe ọbụla ọ ga-agbàkwụnye na ndụ ha.

Anambra Ga-Eso Rita Uru n'Amụmà Egọ Ọrụ Mmepe Ụlọ Ọba Ego Mba Ụwa...

Anambra Ga-Eso Rita Uru n'Amụmà Egọ Ọrụ Mmepe Ụlọ Ọba Ego Mba Ụwa...

E meela ka a mara na steeti Anambra ga-esonye na steeti ndị ga-erita uru n'amụma ego ọrụ mmepe ime ime obodo, bụ nke sitere n'aka ụlọ ọba ego mba ụwa.

Obianọ Na Nwunye Ya Emee Ncheta Ọgbụgba Ahọ Iri Atọ Ha Jiri Lụọ Di Na Nwunye...

Obianọ Na Nwunye Ya Emee Ncheta Ọgbụgba Ahọ Iri Atọ Ha Jiri Lụọ Di Na Nwunye...

Oke ọñụ dara nnọọ ụbọchị ụka dịka aka na-achị steeti Anambra bụ gọvanọ Willie Obianọ na ọmarịcha nwunye ya bụ oriakụ Eberechukwu Obianọ mere mmemme icheta na ọ gbaala ahọ iri atọ kpọmkwem ha jiri malite ibi dịka di na nwunye.

AKUKO SI MPAGHARA AMERIKA

AKUKO SI MPAGHARA YUROPE NA ESHIA

Igbo Language Resources

Contact Us

4800 Gordon Road
Grasslands PO Box 40026
Regina, SK, Canada S4W 0L3
Tel:+1.306.581.4493
Email: igbo@igboradio.com

Copyright © 2009 - 2018 Igbo Radio & The Foundation for the Promotion of Igbo Language and Culture. All Rights Reserved! Designed & Powered by SITE FATHER.